Ojapiano: Gịnịdị ka ọ bụ, ebe ka o si? onye bidoro ya?

KCee na Ojazzy Igbonile

Ebe foto si, KCee /Ojazzy Igbonile/Instagram

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Na nsonso a, ụdị egwu ndị na-etolite etolite kpụ n'ọnụ, ndị okenye jiri ya egoli bụ egwu a kpọrọ 'Ọjapiano'.

Ọjapiano bụ egwu ọtụtụ ndị ma ihe ekwe na-akụ n' egwu agba ọhụrụ ji agwọrị ndụ na Naijiria.

N'ọkporoụzọ, n'ụlọ nkwarị nakwa ebe a na-eme mmemme, ya bụ egwu nna-ada ma na-etinye ndị mmadụ nụrụ ya n'ọnọdụ obiụtọ.

Ọtụtụ ndị otiegwu Naijiria etipụtala ụdị egwu a, mana ọ bụ otiegwu 'Kingsley Chinweike Okonkwo a ma ama dịka 'KCee' bụ onye mere ka egwu 'Ọjapịanọ' kpọtụwa akpọtụwa na nsonso dịka ya na otu nwata nwoke ọgbuọja aha ya bụ Chigozie Okeke a ma dịka 'Ojazzy Igbonile' fụrụ ya ọja n'egwu ahụ pụtara na nsonso a.

"Anyị matara ngwangwa ahụ na anyị enwetala ụda egwu pụrụ iche nke ụwa niile ga-enwe mmasị na ya ya," ka o kwuru.

"Taa, n'akụkụ ụwa niile, ma ndịọcha ma ndị ojii na-eji egwu a bụ Ọjapiano eme onwe ha obi aṅụrị."

Gini bụ 'Ojapiano'?

KCEE

Ebe foto si, KCEE Instagram

Ọjapiano bụ ụdị egwu 'Afrobeat' a gwakọtara ọja na egwu 'amapiano' bụ ụdị egwu e ji mara ndị mba Saut Afrịka,

'Amapiano' nke pụtara ngwa egwu 'piano' n'asụsụ Nguni(Nguni bụ asụsụ ụfọdụ na mpaghara Saụt Afrịka dịka Zulu, Xhosa na Swazi na-asụ) bụ ngwakọ egwu jazz na egwu ọdịnala ndị mpagahara Saụt Afrika nke malitere iwu n'agbata afọ 2010s.

E ji 'Amapiano mara ndị otiegwu Saut Afrika dịka Focalistic(Lethabo Sebetso), Kabza De Small ( Kabelo Petrus Motha) na MFR Souls (Tumelo Nedondwe na Tumelo Mabe) wdg.

Onye bidoro Ojapiano?

KCee na Kolaboy

Ebe foto si, KCEe/Kolaboy/Instagram

Nkọwa foto, Ma KCee ma Kolayboy etiputala egwu amapiano a gwara ọja

KCee na-akọwa na ọ bụ ya bụ onye malitere Ojapịanọ.

Ọ gwara BBC Igbo na mkparịtaụka na nsonso a na o nwere egwu ya na-agwakọ itipụta were gaa mmemme mmọnụ ebe o zutere nwata ọgbụọja a kpọrọ Ọjazzy Igbonile, kpọrọ ya gaa ụlọegwu nma gwa ontye ọgwakọ egwu ya ka ọgwọkọta egwu ya n'ọja ka ọ mara na ọ ga-aga, agwakọ ya ọdaba.

Mana ọ bụghị naanị KCee tipụtarala Ọjapiano.

Ndị otiegwu dịka Kolaboy(Nwodu Chinonso) etipụtala egwu amapiano agwara ọja.

Ginị bụ ọja?

Ogbuọja

Ọja nke ụfọdụ ma dịka 'opi' bụ ngwa egwu e ji mara ndị wụwa Anyanwụ Naijiria nke e si na osisi pịta.

A na-afụ afụ iji wepụta ụda egwu pụrụ iche.

Ọja bụ opi na-ekwu okwu dịka onye na-egbu ya na-eji ya awa ndị nọ ya nso okwu maọbụ zie ha ozi dị mkpa.

Ọja bụ ngwa egwu 'ejechaaọkwụ' n'ala Igbo dịka a na-ahụta ya ka ngwa egwu nwere ihe omimi.

Ụfọdụ okenye ndị Igbo nwere nkwenye na e ji ya agwa ndị nna ochie okwu.

E nwere ụdị ọja dị iche iche; ọja mmanwụ, ọja igede, ọja okorobịa na ọja ukwe.

E ji ọja eto dịke, dimgba na onye ọbụla mere nnukwu ihe.

E jikwa ya akpalite mmụọ dike n'ime onye mmụọ ya dara mba.