Etu dinta si gbagbuo nwoke gbara afọ 21 n'ime ọhịa chee na ọ bụ anụ

Dịnta na Ferdinard Afor

Ebe foto si, Getty/Afor family

Otu nwata nwoke gbara afọ 21 anwụọla n’ erughi eru dịka dinta gbagburu ya n’ime oke ọhịa na Krọs Rivas steeti.

Ferdinand Afor, onye bị n'Okpuru ọchịchị Wula 1 hapụrụ ụlọ nne ya na naza nsonso a, ma zute ọnwụ ịke ya na ofia, ebe ọ gara ịkpatara nne ya akwụkwọ nri.

Dinta

Ebe foto si, Getty Image

Dinta gara ịchụ nta hụrụ nwata ahụ, chee na ọ bụ anụọfia wee gba ya egbe.

Ferdinand nwụrụ n' uzọ ebe e bu ya aga ụlọọgwụ ka mgbọ tụchara ya.

Dinta gbara ya egbe nyefere onwe ya nyefee ndị uweojii.

Ferdinard Afor

Ebe foto si, Afor family

Nkọwa foto, Ferdinard lara mụọ ka ọ gbaara afọ 21

Nne ya gwara ndi ọrụ otu abụghị nke gọọmentị na-agba mbọ maka ichekwa anụ ndị bi n'ọhịa a kpọrọ 'Wild Life Conservation Society' (WSC), biara ha mgbaru na nwa ya so enyi ya gaa n'ọhịa mana o soghị ha lọta na ndụ.

Ọ sịrị, ‘’ Nwa m na enyi ya gara n'ọhia."

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Mgbe m si ụgbo bata, ahụrụ m ebe o busara anyịnya igwe ya(bicyle) n'ihu ụlọ anyi."

"Akpọrọ m ya oku, chee na ọ nọ n’ụlọ, ejima ya nwoke na enyi ya nwoke pụtara."

"Mgbe m jụrụ ha ọha Ferdinand, ha azaghi m, otu ha sirị mee zikoro m na udo adighi.’’

O siri na omume ha mere o jiri malite ịjụ ajuju ma nwebe obi mmapụ, ma bidoro bewe akwa, kpọkube ndi agbatobi ha.

Ọtụtụ n’ime ndị ọ kpọrọ amarala na nwa ya anwụọla tụpụ ya amata.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ndị uweojii Krọs Rivas amịtaghị mkpụrụ.

Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Irene Ugbo, ekwentị ya akụghị, nke ọ na-asa ozi anyi degara tupu anyị bipụta akụkọ a.

Otu WSC anọọla na Krọs Riva ihe karịrị afọ 20 ma na-akwado ogige 'National Park Services nakwa ngalaba 'Cross River Forestry Commission' n'ichekwa ndụ anụmanụ na osisi dị n'ọhịa dị na mpaghara ahụ.

Ha na-akwado ụzọ ọzọ ndị ọzọ ndị mmadụ nwere ike isi na-enweta ego na ihe oriri site na ịzụ anụ ụlọ, ịkọ ọgbọnọ na koko kama igbu anụ ọhịa maọbụ egbutu osisi dị n'ọhịa.

Mana ụfọdụ ndị mmadụ kachịị ntị ha ka na achụ nta maọbụ egbutu osisi dị n'oke ọhịa.

N'ọnwa Julai, osisi tigburu otu nwoke amabeghị onye ọ bụ gara igbutu osisi n'ime ọhịa, dịka WSC siri kwuo, ozu nwoke ahụ ka ndị n'ụlọ ozu ugbua.