Etu aka si kpara nwoke ji ehi o zutere n'ohi gaa akwamozu ọgọ ya nwoke

Ehi na onye zuru ya

Ebe foto si, Foto/Agnes Nworie

Ụlọikpe Majie atụọla otu nwoke mkpọrọ maka iji otu ehi o zuru ezu gaara nna nwunye ya akwamaozu n'Ebonyi steeti.

Ndị uweojii Ebonyi steeti nwụchiri Ikenna Ogbonna, onye obodo Azuoto Okpoitumo dị n'Okpuru Ọchịchị Abakaliki dịka e mechara akwamozu ọgọ ya nwoke ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo izu ehi ma were ehi ahụ gaa akwa ọgọ ya nwoke.

N'Izzi, ọ bụ omenala iji ehi akwa ndị mụrụ onye maọbụ ọgọ iji gbalahụ ịkwa emo ndị mmadụ.

Ogbonna ji nwunye ehi o zutere n'obodo ya gaa akwamozu ọgọ ya n'obodo Ebia Unuhu dịkwa n'Okpuru Ọchịchị Abakaliki n'Ebonyi steeti.

Mmiri gbarụrụ oge onye nwe ehi ahụ, bụ onye gakwara otu akwamozu ahụ hụrụ ehi ya ma tie mkpu sị na ya ahụla ehi ya na-efu efu.

A nwuchiri nwa amadi ahụ, onye gọrọ agọ ma kwuo na ya zụrụ ehi ahụ otu narị puku naira na ụma iri (N110,000).

Ndị uweojii nwụchiri ya ma kpụpu ya ụlọikpe ebe Ọkaikpe majie Ngozi Ngele mara ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ abụọ maọbụ ohere ịkwụ nha N20,000.

Onye uweojii wetara ikpe ahụ n'ụlọikpe bụ ASP Chinedu Mbam kelere ọkaikpe ahụ maka mkpebi ya.