Yevgeny Prigozhin : Etu e siri lie onyeisi 'Wagner Group'

Ebe foto si, Rex
E liela ozu onyeisi otu, "Wagner Group bụ Yevgeny Prigozhin n'akwamozu e mere na nwayọọ n'obodo bụ St Petersburg n'ụbọchị Tuzde, dịka ndị mgbasaozi ya siri kwuo.
Prigozhin na osote ya bụ Dmitry Utkin so na mmadụ iri nwụrụ n'ụgbọelu kpọkasịrị na mpaghara Tver dị n'ugwu Moscow n'abalị 23 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2023.
Ndị na-anọchite Prigozhin kwuru na e liri ya n'akụkọ ili nna ya n'ebe a na-eli ozu a kpọrọ 'Porokhovskoe Cemetery' dị na St Petersburg.
O nweghị nkwanye ugwu ndị agha ọbụla e nyere nwa amadi a bụ onye ndu ndịagha ọlụọ-ọla nke mba Rọshịa.
Nanị mkpụrụ mmadụ ole na ole gara olili ozu ahụ.
Mana ndị uweojii na nkịta ha jupụtara n'okirikiri ebe olilu ozu ahụ.
Dịka ndị mmadụ na-arụtụ aka ebe ọnwụ Prigozhin nwere ike isi, ụlọọrụ gọọmentị Roshia gọrọ na aka ha adịghị n'ọnwụ nwaamdi ahụ.
Mana ndị ma ihe a na-akọ n'ụlọ nakwa ofesi kọwara Prigozhin gbara afọ 62, dịka "nwoke nwụrụ anwụ na-aga ije" kemgbe o jiri duru ndị agha ya nupu isi n'ọnwa Juun afọ a.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu agha Wagner bụ Yevgeny Prigozhin nwụrụ n’ihe mberede ụgbọelu ahụ mere na Wenezde dịka ndị ọrụ gọọmentị mba Russia si kwuo.
Kọmitii na-eme nnyocha a kpọrọ SK sị na a matala ndị bụ ozu iri ahụ nwụrụ na mberede a ma sị na ọ bụ ahụ aha ha dị n’akwụkwọ ndị banyere ụgbọelu ahụ.
Ụgbọelu bu Prigozhin dara na mpaghara ugwu-ndịda mba Moscow n’ụbọchi 25 Ọgọọst, gbuo mmadụ niile nọ n’ime ya.
Ụlọọrụ onyeisiala mba Russia bụ Kremlin agọọla ebubo na-ekwu na aka ha dị na ya.
Otu nyocha SK kwuru na ha na-eme nyocha ịmata etu ụgbọelu a siri kpọkasịa.
N’ozi ha wepụtara, ha kwuru “e meela nyocha a kpọro molecular-genetic testing.”
“Nyocha ahụ gosiri ndị bụ ozu mmadụ iri ahụ nke ha aha dị n’akwụkwọ ndị banyere n’ụgbọelu a.”
Ndị a nwụrụ gụnyere ndịisi ndịagha otu Wagner nke Russian, Prigozhin hiwere bụ ndị na-enyere mba Russia aka ịlụ agha na Ukraine, Syria na ụfọdụ mpaghara Afrịka.
Belarus.

Ebe foto si, Reuters
N’ime ndị a bụ onye a kpọrọ Dmitry Utkin bụ onye na-ahụ maka ọrụ ndịagha nke otu Wagner.
Ndị ọzọ nọ n’ụgbọelu a si na Moscow na-aga St Petersburg gụnyere ndị otu Wagner bụ Valery Chekalov, Sergi Propustin, Yevgeny Makaryan, Alexander Totmin na Nikolay Matuseyev.
Onye fere ụgbọelu ahụ bụ Alexei Levshin na ogbo ya Rustam Karimov na onye enyemaka n’ụgbọelu bụ Kristina Raspopova.
Ihe mberede a na-abịa n’ime ọnwa abụọ Prigozhin na ndị otu ya busoro ndịagha mba Russia agha ma kpachie mpaghara obodo Rostov ma yie egwu ịga Moscow.
E mechere kpee udo nke e jiri sị Prigozhin na ndịagha Wagner gaa biri na mba
Akụkọ na aka anyị dị n'ọnwụ Yevgeny Prigozhin bụ okpotokpo asị - Kremlin

Ebe foto si, Reuters
Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Vladmir Putin agwala BBC na akụkọ na-efegharị na Kremlin nyere iwu ka e gbuo Yevgeny Prigozhin bụ okpotokpo asị.
Nke a pụtara ihe na nzụkọ ekwentị nke Dmitry Peskov nakwa ụfọdụ ndị ntaakụkọ nwere taa bụ ụbọchị Fraịde.
Peskov sị "anyị na-atule akụkọ a, ọ na-adị mma ka anyị gba mbọ kwuo ka ihe si me, anyị amachaghị ihe niile gbasara ihe mere nke ga-apụta ihe dịka nyocha na-aga n'ihu ugbua"
Ihe mbụ Vladmir Putin kwuru maka ọnwụ Prigozhin

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ezigarala ezinaụlọ ndị nwụrụ na ihe mberede ụgbọelu mere ụbọchị Wenezde ozi iti aka n'obi.
Akụkọ kwuru na Yevgeny Prigozhin bụ onyeisi ndịagha ọlụọ-ọla a kpọrọ 'Wagner Group' sọ na ndị nọ n'ụgbọelu.
N'ozi ya ụbọchị Tọzde, Putin sịrị, "Banyere ụgbọelu kpọkasịrị, na mbụ a na m ezigara ezinaụlọ ndị nwụrụ na ya ozi iti aka n'obi."
" Ọ bụ nnukwu ọdachi."
"Ozi mbụ e nwetara na-ekwu na ndị ọrụ ụlọọrụ Wagner so na ndị nọ n'ụgbọelu ahụ, ndị a bụ ndị nyere aka n'ụzọ pụrụ iche n'agha anyị na-ebu na Yukren."
" Anyị ma ma cheta nke a, anyị agaghị echefu ya."
Ndị ọ dị n'aka kwuru na mmadụ iri nọ n'ụgbọelu ahụ kpọkasịrị na nso Moscow nwụrụ.

Ebe foto si, Reuters
Aha onye ndụ otu agha ọlụọ-ọla na Rọshịa a kpọrọ 'Wagner Group' bụ Yevgeny Prigozhin dị n'aha ndị njem nọ ụgbọelu nwere ihe mberede na mpaghara Tver dị n'ugwu Moscow, dịka ụlọ ntaakụkọ mba Rọshịa siri kwuo.
Mmadụ iri nọ n'ụgbọelu ahụ nwere ihe mberede gụnyere Onyeisiagha Wagner bụ Dmitry Utkin nwụrụ.
Prigozhin bụ onye ndu ndịagha ọlụọ-ọla ya na ndị otu ya nupuuru gọọmentị mba Rọshịa ji ha alụ agha na Yukren isi n'ọnwa Juun afọ afọ 2023 .
Nke a butere ka Rọshịa nnukwu ọghọm dịka ha sọrọ ngọngọ n'agha ha na-ebu megide Yukren n'ọnwa ahụ.

Ebe foto si, Reuters
Ụlọntakụkọ 'Grey Zone' nke a na-eche na ha na otu Wagner nwere ihe jikọrọ ha wepụtara ozi na andịagha ụgbọelu gbaturu ụgbọelu 'Embraer na mpaghara Tver dị n'ugwu Moscow.
Ụgbọelu jet ahụ si Moscow Aga St Petersburg,dịkwa na Rọshịa bu ndị njem asaa na ndị ọrụ ụgbọelu atọ.
Ụlọ ntaakụkọ 'Tass" kwuru na ụgbọelu ahụ wuru ọkụ dịka ọ dara n'ala.
Ha kwukwara na a hụla ozi mmadụ anọ.
Onye bụdị Yevgeny Prigozhin?

Ebe foto si, Reuters
Yevgeny Prigozhin bụ onye ọgaranya mba Rọsụ̄ịa ji ịlụ agha nke Bekee kpọrọ 'mercenary' akpa ego.
Prigozhin bụbu ezigbo enyi Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ma bụrụ onye o ji ndị otu ya ebu agha na Yukren tupu ha see okwu onwa ole na ole gara agha n'ihi nghọtahịe dapụtara n'ọgụ Rọshịa na Ukraine.
Ya na Putin si n'obodo St Petersburg, dị na Rọshịa.
Nwa amadị ahụ bụ onye malitere ndụ ya dịka onye na-eme achịcha Bekee nwere ọtụtụ ụlọnri na mpaghara dị iche iche na Rọshịa.
Ọ bụ nlọnrị ya ka Putin na-akpọ ndị ọbịa puru iche o nwere aga.
Okwu dapụtara n'etiti ya na Putin dịka Prigozhin katọrọ,na-ezoghị ọnụ, Mịnịstrị nchekwa mba Rọshịa maka ebubo nrụrụaka nakwa esoghị ezi usoro n'agha ha megide Yukren.
N'abalị 23 nke ọnwa Juun 2023, ndị agha ya na-alụ agha na Yukren chere Moscow ihu nke mere ka agha ahụ tụgharịa.
Ọtụtụ hụrụ ya bụ ihe dịka mkparị nye Putin dịka onyeisiala Rọshịa















