Tosin Silverdam, Tonto Dike na ndị ọzọ merela 'liposuction' na ihe ọghọm so ya

Tonto Dikeh,Tosin Silverdam na Iyabo Ojo

Ebe foto si, Tonto/Tosin/Iyabo/Instagram

Dịka ọtụtụ ụmụ Naijiria kpụ otu onye edemede akụkọ n'ịntanet a ma ama n'ọnụ maka ịwa ahụ ji ịchọ mma nke Bekee kpọrọ 'plastic surgery', ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na ịwa ahụ iji chọọ mma abụghị sọsọ njọ njọ, na o nwere uru, nwee ọghọm.

Tosin Silverdam kwupụta na soshal midia ụbọchị Tọzde na ya wara ahụ iji belata afọ nakwa ara ya n'ihi ọnọdụ Bekee kpọrọ, "gynecocomastia".

"Gynecocomastia" bụ ọnọdụ nwoke ịkpụ ara dịka nwaanyị nke inwe mmiri ahụ nwaanyị a kpọrọ 'estrogen' rinne na-ebute n'ụfọdụ ụmụnwoke.

Tosin Silverdam

Ebe foto si, Tosin Silverdam/Instagram

Ịwa ahụ maka ịchọ mma nke Bekee kpọrọ 'plastic surgery' bụ ụdị ịwa ahụ e ji ahazịgharị, rụgharịa maọbụ beleta akụkọ ahụ mmadụ.

E nwere ike ime ya ma mmadụ nwee ihe mberede merụrụ ya ahụ n'isi, n'aka maọbụ ma ọkụ gbaa mmadụ.

Mana ụfọdụ ji ya ahazịgharị akụkọ ahụ ha ha amasịghị ha etu ọ dị, ka ọ dị etu ha chọrọ ya.

Ụfọdụ na-etinye otele ukwu, ụfọdụ akwalite ara ha, ebe ụfọdụ na-eme ka afọ ha talaa ka nke ngwere.

Uru dị n'ịwa ahụ maka ịchọ mma

Dọkịta bụ ọkachamara n' ịwa ahụ maka ịchọ mma n'ụlọọgwu UNTH,Enugwu(plastic surgeo) bụ Dkta Obinna Okwesili kwuru sị, "O nweghị ihe ọjọọ dị na ịwa ahụ e ji achọ mma ma ọ bụrụ na i nwere mkpa iji eme ya."

Ụfọdụ uru a na-erite n;wa ahụ maka ịchọ mma gụnyere ịkwalite nkwenye n'onwe(self-esteem), ịdọzị onwe ka onye dị ka mmadụ na-adị ( iji maa atụ:Onye e ji ọrụsị mụọ, maọbụ onye ihu ya mebiri n'ihi ọkụ ọgbụgba nwere ohere ịhazigharị ya), ị hazịgharị akụkụ ahụ mmadụ ka ọ rụwa ọrụ dịka o kwesịrị wdgz.

Oghom dị na ya

Tosin Silverdam n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Tosin Silverdam

Ọghọm dị na ịwa ahụ maka ịchọ mma nke nwere ike ịgbbado ụkwụ na ụdị ahụ ị chọrọ ịwa, ọnọdụ ahụike gị maọbụ ụdị ndụ ịị na-ebi.

Mana dịka Dkta Okwesili si kwuo, "Ọghọm ezughị ịkwụsị ime 'plastic surgery' n'ihi na ịwa ahụ nile nwere ọghọm sọ ya, ihe dị mkpa bụ ka ị gaa n'aka dọkịta a zụrụ na nka."

Lee ụfọdụ ọghọm so ịwa ahụ maka ịchọ mma dịka Dkta Okwesịlị na ndị ọkammụta ahụike ndị ọzọ sị gbaa n'ama:

  • Ịkpapu afọ nke nwere ike imetụta mgbịrịafọ
  • "Fat embolism": Abụba nwere ike ịdebanye mmadụ n'ọbara nke nwere ike ibute nnukwu nsogbu
  • "Infection"- Nje na-ebute ọrịa nwere ike ife
  • Ahụ ọzịza maọbụ iru abụ
  • Ịgbafe ọbara oke
  • E nwere ike ịmerụ gị ahụ n'akwara (nerve damage)
  • Aba si n'ọnya ịwa ahụ nwere ike igbochi akụkụ ahụ gị imegharị ka o kwesịrị

Dịka Dkta Okwesili si kọwaa, Ọ nwere ụfọdụ ọnọdụ nwere ike ime ka ọghọm na-eso ịwa ahụ aka njọ maọbụ nwee ike itinye mmadụ n'ọnọdụ egwu.

" bbụrụ na i buru oke ibu, i nwere ọrịa shuga, ndị nwere ọrịa obi

"Ọghọm ekwesịghị ịkụda obi ndị mmadụ ịwa ahụ, ihe dị mkpa bụ ịhụ na ị gara ndị o doro anya."

Tosin Silverdam

Ebe foto si, Tosin Silverdam/Instagram

Kemgbe akụkọ na ọ wara ahụ pụtara, ụfọdụ ụmụ Najiria na-akatọ Tosin bụ nwoke mbụ na-ewu maka ịwa ụdị ahụ nke ọ bụ ụmụnwaanyị ka e ji ya mara.

Ụfọdụ kwuru na ọ bụrụ na ọ gara na-emegharị ahụ, na nke ahụ ga-ahazịgharịnwụ ahụ ya etu ọbụla ọ chọrọ.

Mana n'ọsịsa ya, Tosin si na ọ bụghị ihe nile ka mmegharị ahụ na-agwọ.

Ozi Tosin Silverdam

Ebe foto si, Tosin Silverdam/Instagram

Iwa ahụ maka ịchọ mma na-arị elu na a Naijiria ugbua dịka ọtụtụ ndị a ma ama na-eme ya.

Mana Dkta Okwesịlị sịrị, "Ịwa ahụ maka ịchọ mma na-agbalite na Naijiria mana o rubeghịdị ihe na-eme na mba ndị ọzọ."

Tosin abụghị onye a ma ama mbụ na-awa ahụ maka ịchọ mma, mana ọ bụ nwoke a ma ama mbụ na- eme nke a.

Ndị ọzọ a ma ama warala ahụ maka ịchọ mma

Tonto Dike

Ebe foto si, Tonto Dike /Instagram

Ndị dịka ya gụnyere:

Tonto Dike: Onye ejije Nollywood bụ Tondo Dike gwara BBC Pidgin na ya mere iji mee onwe ya obiụtọ na ọ bụghị iji rata onye ọbụla.

Blessing CEO: Blessing Okoro Nkiruka a ma dịka 'Blessing CEO' so na ndị a na-anụaha ha wara ahụ.

Blessing, onye na-akpọ onwe ya ọkachmara n'inye ndụmọdụ banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya hazigharịrị otele ya n' afọ 2022.

Blessing Okoro

Ebe foto si, BlessingCEO/Instagram

Iyabo Ojo: Onye ihe ejije Nollywood Yoroba bụ Iyabo Ojo kkwupụtakwara na ya wara afọ iji mee ka ya dị ọgọ na ya ma tụkwa onwe ya n'anya.

Mercy Eke: Nwa ada sonyere na Big Brother n'afọ 2019 wakporo ahụ maka ihaziharị onwe ya.