Ihe anyị ma maka ozu ụmụnwaanyị a chọtara n'Ohiya n'Abia steeti

Foto gosiri ebe ndị uweojii bu akpa ozu ndị mmadụ mana ọ bụghị nke si n'ime akụkọ a

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-ekwu na a chọtara ozu ihe ruru ụmụnwaanyị abụo n'akụkọ Mechanic Village dị n'Ohiya n'Umuahia, Abia steeti.

Otu onye na-ere ahịa n'akụkụ ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọwaara BBC Igbo etu onye ara si banye n'ime ọhịa bupute akpa "Ghana must go" nke ozu ụmụnwaanyị ahụ ma tọgbọ ya n'okoporoụzọ.

O kwuru na o nweghi onye ma onye busara akpa ahụ n'ime ọhịa ma kwuo na ọ dịka ozu ndị a ọ nọrọ ihe ruru abalị atọ tupu a chọpụta ya.

Ya bụ nwoke hụrụ ozu ndị ahụ anya kwukwara na ụmụnwaanyị ahụ dị ihe dị ka afọ iri atọ nakwa na e kere ozu ndị ahụ agbụ site n'isi ruo n'ụkwụ ha.

Ndị uweojii Abia steeti kwetara na nke a mere.

Ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ bụ Chinaka Maureen kọwara na ndị uweojii ejeela ebe ahụ ihe mere.

"Site na njikọ aka ndị ọrụ ahụike n'Umahia Saut na ndị uweojii ebupula ozu ndị ahụ n'okporoụzọ" ka ozi ua kwuru.

Nyocha na-aga n'ihu ugbua iji mata etu ya bụ ihe si mee ka o kwukwara.

Ihe Gọọmentị Abia steeti kwuru maka ya

Gọọmentị Abia steeti kwuru na nyocha banyere ya bụ ihe amalitela ugbua.

Onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ Alex Otti bụ Ferdinand Ekeoma gwara BBC n'ekwentị na ha na-eche ka ndị ọrụ nchekwa mechaa nyocha ha tupu ha amara ihe a ga-eme ya bụ ihe.

"Ị ma na ihe a metụtara nchekwa ya mere ha (ndị ọrụ nchekwa) ji esi imi n'ala ma nyochapụta ya ọfụma.

O kwukwara na ha nụrụ na ọ bụ ozu mmadụ atọ ka achọtara mana emechaa nyocha ọ mara ma ọnụọgụgụ a ga-agablite.

Cheta na Ekeoma eziputabuola ozi banyere okwu a n'ụbọchị Sọnde 20 Ọgọọst, 2023 o mere site n'akara Facebook ya.

N'ozi ahụ ọ gwara ndị Abia steeti ha gawa mkpa ha ma gbaara gọọmentị ama ma ọ bụrụ na o nwee ihe ha hụrụ maọbụ ihe ha nụrụ banyere ozu ụmụnwaanyị ahụ a chọtara.