Etu nwaanyị onye nwe ụlọ sị wụọ onye bi be ya mmiri ọkụ n'Anambra steeti

Ebe foto si, Anambra Ministry of Women Affairs
Aka akparala otu nwaanyị maka ịwụ onye bi n'ụlọ ya mmiri ọkụ n'ihi ụgwọ ụlọ/
Akụkọ kwuru na Amaka Okonkwo wụrụ onye bị n'ụlọ ya bụ Imabong William, onye Akwa-Ibom mmiri ọkụ e tinyere ose n'Enugwu-Ukwu ụbọchị Tọzde n'ihi akwụghị ụgwọụlọ.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na di nwaanyị ahụ bụ Ebere Okonkwo nọ n'ụlọ oge nwunye ya wụrụ onye bi n'ụlọ ha mmiri ọkụ mana ọ nweghị ihe o mere.
Dịka Imabong siri kọwaa, Okonkwo gwara ya kwapụ n'ụlọ ya n'ihi na ọ kwụlighị ụgwọụlọ nke gwụrụ n'ọnwa gara aga maka ego o tinyere n'ụgwọ ụlọ.
Ọ kwuru na ya rịọrọ nwaanyị ahụ ka o nye ya ohere ịchọta ebe ọzọ, mana dịka ọ na-asa akwa, nwaanyị nwe ụlọ buru mmiri ọkụ o tinyere ose wụọ ya.
Ka ọ dị ugbua, e bugala Imabong n'ụlọọgwụ Zion Hospital dị na Nọfịa, ebe ndị uweojii ogige nke Nimo nwụchiri Okonkwo.

Ebe foto si, Anambra Ministry of Women Affairs
Kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma ọha na steeti bụ Ify Obinabo, onye gara leta Imaobong n'ụlọọgwụ, kelere ụmụnwaanyị Enugwu Ukwu bụ ndị gbara mbọ hụ na ndị uweojii nwụchiri nwaanyị ahụ.
Obinabo, onye kwere nkwa na ya ga-eso okwu ahụ iji hụ na Imaobong nwetara ikpe ziri ezi, dọrọ ndị Anambara aka na ntị sị ka ha na-enye mkpesa na gọọmentị steeti ahụ agaghị anabata mkpagbu maọbụ ajọ agwa n'aka ndị bi na steeti ahụ.















