Arrow of God Orphanage: Etu Gọọmentị Anambra si gbachie 'orphanage' a sị na-ere ụmụaka

Ụlọ ndị enwe-nne-enwe-nna 'Arrow of God', Nkwelle , dị nso ỌnichaỌnicha

Ebe foto si, Anambra Goverment

Gọọmentị Anambra steeti agbachiela ụlọ ndị enwe nne, enwe nna dị na steeti ahụ maka ebubo ịgba mgbere ụmụaka.

Mgbachi 'Arrow of God Orphanage' dị na Nkwelle dị nso Ọnicha, Anambara steeti nso so mkpughe sitere na akụkọ nke onye ntaakụkọ Fisayo Soyombo mere nke gbara n'anwụ na ụlọ ndị enwe nne, enwe nna ahụ na-ere ụmụaka.

Kọmishona na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma ọha na steeti ahụ bụ Ify Ibinabo, onye gbara ama maka mgbachi ụlọ ndị enwe nne ahụ n'ozi mgbasaozi o wepụtara ụbọchị Wenezde, kwuru na ya kpọrọ onye nwe ụlọ ndị enwe nne ahụ bụ Revered D. C Ogo oku n'ụlọ ọrụ ya dị n'Ọka mana ọ zaghị ya.

Na nkọwa ya, Ibinabo kwuru na ministrị ya amaghị maka nwa ahụ Soyombo kutere n' ụlọ ndị enwe nne enwe nna ahụ.

Ọ rụtụrụ aka na ha zọpụtara ụmụaka 20 dị n'agbata otu afọ na afọ 17 nke gụnyere; ụmụaka nwoke 10, ụmụnwaanyị itoolu na otu nwa ọhụrụ na ya bụ ụlọ ndị enwe nne.

Ibinabo gara n'ihu kwuo na mịnistrị ya na-ama imi n'ala ịchọpụta ndị nwe ụmụaka ndị a ka ha bịa kpọrọ ụmụ ha.

Ihe ndị Soyombo chọpụtara

N'akụkọ nke Soyombo mere, ọ zụtara otu nwa nwaanyị nde naira abụọ(N2 m) n'aka ụlọ ndị enwe nne enwe nna ahụ nke onye nwe ya bụ ụkọchukwu mabụrụkwa onye rụrụ ọrụ nchekwa lara ezumike nka n'Ọwụwa Anyanwụ.

Arrow of God Orphanage

Ebe foto si, Anambra Government

Fisayo Soyombo

Ebe foto si, Facebook

Dịka ọ nụrụ kepukepu site n'aka mmadụ ole ma ole na o nwere ụlọ ndị enwe nne,enwe nna na-ere nwa a kpọrọ 'Arrow Of God Orphanage', Soyombo duru otu nwaanyị mee ka ọ bụ nwunye ya ma kpọ ha si na ya chọrọ ikute nwa.

Ha gwara ya hooha, ma "ọ bụru na ị chọrọ ịzụ nwa, ọ ga-abụ n'Ọwụwa Anyanwụ."

Soyombo gara na ụlọ ndị ene nne,enwe nna dị N'Nkwele na nso Onicha, kwụọ ụgwọ nile a sị ya kwuo ma nke eji nata akwụkwọ ndị uweojii na akwụkwọ ụlọikpe na enweghị nnyocha ọbụla ụlọ ndị enwe nne ahụ mere.

Ọ sịrị, "O nweghị onye mere nchọpụta maka ebe m bi, ihe m na-arụ maọbụ ndị ezinaụlọ. Ha amaghị ma abụ m onye ọgwụ ego."

"Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gaala ọnwa isii na o nweghị onye jụrụ ya ese nwa ọịhụrụ ya bịara kuru."