World Trafficking Day: 'Agaghị m ekwe ka onye m hụrụ n'anya hụ ihe m hụrụ n'ụzọ ije'
Otu onye Naịjirịa nọ na-achọ ebe ụwa ga-akara ya mma ekweuputela ihe ọ gabigara n'ime ihe karịrị afọ anọ ọ zọpụrụ ije dịka onye mbịarambịara.
Nwoke ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ nọrọ n'ụzọ ihe karịrị afọ anọ, ebe ọ na-achọ etu ọ ga-esi ruo Yurop.
Kama ife n'ụgbọelu, ọ garuru mba Libya, ebe o kwuru na o ji anya ya hụ ntị ya ma n'ụlọmkpọrọ, ma n'ọzara nakwa n'elu mmiri.
Ọ kọwara etu e si tọrọ ya, taa ya ahụhụ na ihe ndị ọzọ riri ya ọnụ ikwuputa.
O kwukwara na n'ihi ihe ọ gabigara, ọ gaghị achọ ka onye ọ bụla ọ hụrụ n'anya taa ụdịrị ahụhụ ọ tara.
Gere ihe o kwuru n'uju.


