Collins Nweke: Nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium

Aha onyonyo, Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium

Collins Nweke bụ nwaafọ Naịjiria gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara ka ọ nọrọ n'ọkwa ọchịchị ugboro atọ na mba Beljiọm.

Nweke rụrụ dịka kanselọ na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na mmadụ a na-akpọ "social affairs" na Bekee, n'obodo Ostend dị na mpaghara West Flanders.

Nweke bụ onye mbịarambịara mbụ na-azọta ọkwa ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ "oke ego" dị na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa kpatara na ọchịchị anaghị eru ndị o kwesịrị iru aka.

O kwuru sị na ndị na-akwụba aka ha ọtọ na Naịjirịa buo ibu, na Ala Igbo na Naịjirịa niile ga-emecha dị mma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: