South-East Governors' Forum: 'Ọ bụghị ndị na-eti mkpu nnwereonwe na-akpa mkpamkpa n'Ọwụwa Anyanwụ'

Charles Soludo, Alex Otti, Hope Uzodimma ,Peter Mba na Francis Nwifur

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ndị na-akpa mkpa mkpa na-akpọtụ na mpaghara ahụ bụ ndị omekome, na ọ bụghị ndị na-agba mbọ maka nnwereowe Biafra.

Ha kwuru nke a dịka ha mechara ọgbakọ otu jịkọrọ ha a kpọrọ 'South-East Governors' Forum n'ụbọchị Fraide (10/8/2023 n'obi Gọọmenti Enugwu Steeti.

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma bụ onye gụpụtara mkpebi ndị gọvanọ Ọwụẁa Anyanwụ nwere n'ọgbakọ ahụ sịrị, "Otu a na-ekwu hooha na ndị na-ebute nsogbu nchekwa na mpaghara anyị na ndị na-abanyere ha aja n'ukwu bụ ndị omekome, e kwesịghị ịhụta ha dịka na-eti mkpu nnwereonwe."

" Ya mere o nwee onye a nwụchiri, si mee ya ka e si eme ekperima dịka iwu ala anyị siri dị."

Charles Soludo, Alex Otti, Hope Uzodimma ,Peter Mba na Francis Nwifur

Ebe foto si, Francis Nwifuru/Facebook

Dịka ha kelere ndị ọrụ nchekwa maka nkwado ha, ha kpebiri ijikọ aka ibu agha megide nsogbu nchekwa na-eleghị anya n'azụ nakwa na onwe ma rịọ nkwa nke Gọọmentị Etiti.

Uzodimma gara n'ihu kwuo na ha kpebikwara inwe ọgbakọ nkwalite akụnaụba na nchekwa mpaghara ahụ n'ụbọchị ha ga-ekwupụta n'oge na-adịghị anya.

Alex Otti,Charles Soludo na Peter Mbah

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook

Cheta na tigbuo-zogbuo na-aga n'ihu n'Ọwụwa Anyanwụ kemgbe Jenụwarị afọ 2021.

Nsogbu a kawanyere njọ ka a nwụchiri Nnamdi Kanu ma tunye na mkpọrọ DSS dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu Gọọmentị Etiti dịka ndị otu ya bụ Ipob tinyere Nọrọnụlọ kwa Monde nke ha ji a kpo oku ka a tọhapụ ya.

Mana Ipob mechara kwụsị nọrọnụlọ mana otu alaka otu ahụ k[pọrọ onswwe ha'Autopilot' gara n'ihu na amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ Monde ọbụla nakwa ụbọchị masịrị ha na-agbanyeghị na Kanu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya akpọọla oku ugboro ugboro ka a kwụsị nke a.

Mmanye nọrọnụlọ atala isi ọtụtụ ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ , mebie akụnaụba dara ndekwuru nde , ebe ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ na-agha ahịa n'ihi nke a.