Sit-at-home: Ipob amapụtala atụmatụ ọhụrụ nke ha ga na-emezi kwa Mọnde n'Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob amapụtala ụbọchị Monde ọbụla n'izuụka dịka ụbọchị 'Nkwalite Akụnaụba'( Economic Empowerment Day' n'Ọwụwa Anyanwu nile.
Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Powerful bụ onye kwupụtara nke ahụ n'akwụkwọ mgbasaozi o wepụtara ụbọchị Satode, sịrị na nke a bụ iji gba mbọ kpọkọba ihe akụ akụ na ihe enwe enwe a ga ga-eji akwalite ọnọdụ akụnaụba, agụmakwụkwọ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke nọrọ nụlọ ogologo oge kụpịara na mpaghara ahụ.
Ozi ahụ sịrị, "Dịka Nnamdi Kanu, site n'akwụkwọozi nke o ji akara edemede ya were dee ma zipụta were kagbuo nọrnọrọn'ụlọ n'ụzo abụla ụzọ, , o nyere ntuziaka ka ndị mmadụ malite ugbua, dopu Monde dịka "Ụbọchị Nkwalite Akụnaụba" (‘Economic Empowerment Day’) n'Ọụwa Anyanwụ nile."

Ebe foto si, Getty Images
"Ụbọchị Nkwalite Akụnaụba ga-abụ ụbọchị maka ịkpokọba ụmụ Biafra ka ha tinye uchu na iweghachi ihe ndị kpụrụ afọ n'ala n'Akụnaụba, agụmakwụkwọ na mkpa metụtara mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke nọrọnụlọ ogologo oge butere."
Ọ gara n'ihu kwuo na n'oge a, ndị mmadụ ga-etinye uchu na inyere ndị enweghị ohere agụmakwụkwọ nakwa ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka iji kwalite ọnọdụ ha.
Cheta na na izu ole na ole gara aga, Nnamdi Kanu bụ onye nọ mkpọrọ ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria, degara Simon Ekpa si ya ka ọ kwụsị imanye nọrọnụlọ n'Ọwuwa Anyanwu.
Ekpa bi mba Finland bụ onye ndu alaka Ipob kpọrọ onwe ha 'Autopilot' na-amanye nọrọnụlọ kwa Mọnde ọbụla nakwa nke ịzụụka abụọ oge masịrị ya iji kpoo oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu.
Mana Kanu kwuru n'ozi o wepụtara na onye ọbula gara n'ihu na amanye nọrọnụlọ na-agbanyeghị ntuziaka ya nyere abụghị onye na-eso ya kama onye ahụ bụ "onye iro ndị be anyị".










