Ifeanyi Ubah: Kedụ uru ọ ga-abara m ịgba nwanne m Nnamdi Kanu 'sabo'?
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
Sịnetọ Ifeanyi Ubah na-anọchiteanya ndị Anambra South n'ụlọomeiwu Naịjirịa ekwuola na aka ya adịghị na mkpọlata gọọmentị Naịjirịa kpọlatara Nnamdi Kanu, onyendu otu na-achọ nwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) site na mba Kenya.
Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị nkwado Kanu na-ebo Ubah ebubo inye gọọmenti ụgbọelu ha jiri si mba Kenya bulata Kanu na Naịjirịa n'ọnwa Juun afọ 2021.

Na mkparịtaụka Ifeanyi Ubah na BBC Igbo nwere, ọ kwuru "kedụ uru ọ ga-abara m na m gbara nwanne nwoke sabo?.
"M meere gọọmentị Naịjirịa ihe niile a ma bụrụ ọkwa onye na-esoghi na pati na-achị achị?"
Ubah gara n'ihu kwuo na oge otu a kpọrọ 'Nzukọ Umunna' mere njem gaa leta Kanu na mkpọrọ, na ọ bụ ya wepụtara ego e jiri mee njem ahụ.
O kwuru na ndị maara ka o si eme ihe ma na ọ naghị ekwu ọtụtụ okwu kama na ọ bụ n'omume ka a na-ahụ ya.
"Ọ bụ Chineke zọrọ m ndụ mgbe ndị ojiegbe wakporo m"

N'aka nke ọzọ Ifeanyi Ubah kọwara ihe ọ ga-abigara oge ndị ojiegbe wakporo ụgbọala ya n'Anambra steeti n'afọ 2022.
O kwuru na ọ bụ Chineke zọrọ ndụ ya n'ụbọchị ahụ maka na e gburu ụfọdụ ndị enyemaka ya.
Kirie ihe o kwuru n'uju.



