Ifeanyi Ubah: Obi ọ ga-adị gị mma ma a pịa nne gị ụtalị n'aha 'sit at home'?

Aha onyonyo, Ifeanyi Ubah: Ebumnuche m ji hibe otu nchekwa ahụbeghị ụdị ya mbụ n'Anambra South
Ifeanyi Ubah: Obi ọ ga-adị gị mma ma a pịa nne gị ụtalị n'aha 'sit at home'?

Dịka ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na-arị elu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, Ifeanyi Ubah, bụ Sinetọ na-anọchite anya mpaghara Anambra South, kwuru na ya nwere atụmatụ iji wulite ọnọdụ nchekwa n'Anambra steeti.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'Abuja, Ubah kwuru na ya na gọvanọ Anambra bụ Chukwuma Soludo nwere mkparịtaụka ebe ya nọ kọwaara ya etu atụmatụ nchekwa a o nwere ga-esi rụọ ọrụ.

"Agwara m Gọvanọ Soludo na anyị ga-ebu ụzọ malite atụmatụ a n'otu okpuru ọchịchị iji tụlee etu ọ ga-esi gaa, ọ bụrụzie na ọ gaa nke ọma, anyị ewere ya gazuo Anambra Steeti niile ọnụ," Ubah kwuru.

O kwuru na ha gotere ekwentị pụrụ iche a na-akpọ 'walkie talkie' nke ọnụọgụgụ ya karịrị 600, kesaara ya ndị ọrụ nchekwa a ha hibere, iji nwee ike ị na-ezisa ozi ngwangwa ma e nwee mwakpo ọbụla na mpaghara Anambra South.

Ifeanyi Ubah

Ifeanyi Ubah kwuru na ọ dị mwute na ọ bụ ụmụ Igbo nọcha na mba ofesi na-eweppụta ego iji na-akwado mwakpo dị icheiche nke na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ọdị nso a.

"Jụọ onwe gị ma ọ bụrụ na ọ bụ nne gi ka ndị ojiegbe na-apịa ụtalị ma na-achụ ọsọ ebe ọ na-ere akwụkwọ nri n'ahịa, kedu ka obi ga-adị gị?" Ubah jụrụ.

O kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ndị ọchịchị niile n'ala Igbo ịgbakọta aka, tụkọọ alo maka ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị n'ala Igbo taa, nakwa etu a ga-esi belata ya.

Ndị ọrụ nchekwa nke Ifeanyi Ubah hibere

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah

Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa nke Ifeanyi Ubah hibere

Ubah gara n'ihu kwuo na ihe niile e ji ama obodo mepere emepe dị n'ala Igbo taa bụ ndị Igbo nọ n'akụkụ ụwa dị icheiche tinyere ya.

"Ọ dịghị mma etu ụfọdụ ụmụ anyị si emebisi ihe anyị ji aka anyị tinye iji mepee obodo anyị," ka o kwuru.

"Akaraka onye Igbo abụghị ịrịọ arịrịọ, akaraka onye Igbo bụ ịgba mbọ, ọ bụghị igbu nwanne ya maọbụ imebisi ihe.

"Onwee otu mkpụrụ ntụtụ dị n'ala Igbo, ọ bụ ọsụsọ ụmụ Igbo, ọ dịghị mma imebisi ya."

Onye bụ Ifeanyi Ubah

Omeiwu na-anọchiteanya ndị Anambra South

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah

Ifeanyi Uba bụ onye ji ego achụ ego ejiri ụlọọrụ Capital Oil mara.

Amụrụ ya na Septemba n'afọ 1971.

O nwere nzere na ngalaba ọmụmụ ịbụ ọkaiwu site n'ụlọakwụkwọ 'Baze University' dị n'Abuja

Ọ bụkwa ya nwe Ifeanyi Ubah F.C. , nke na-azabụ Gabros International Footbal Club, bụ nke sobu n'asọmpi bọọlụ Premiere league Naịjirịa.

Ifeanyi Ubah zọburu ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'afọ 2014 na Labour Pati.

Na 2019 Ifeanyi so zọọ ma merie ọkwa Sinetị ịnọchite anya Anambra South na pati YPP, ọ zọkwara ọkwa ahụ na 2023 ma merikwaa.