Supreme Court Judgement: Ihe mere Ifeanyi Ubah ji merie n'ụloikpe kachasị

Sịnetọ Ifeanyi Ubah

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah/Facebook

Ulọikpe kachasị na Naịjirịa nọọrọ n'Abuja ụnyaahụ kwuo hoohaa na ọ bụ Ifeanyi Ubah meriri na ntuliaka ịnọchiteanya ndị Anambra South n'ụlọomeiwu.

Ndị ọkaikpe mmadụ ise gbakwasịrị ụkwụ n'ikpe ụlọikpe 'Appeal' kpere na mbụ nke kagburu ọchụchụ a chụrụ Ubah.

Ụlọikpe 'Appeal' sị ikpe a ụlọikpe ukwu nyere aṅụjughi mmiri afọ ya mere o jiri kagbuo ya.

Sịnetọ Ifeanyi Ubah ji ọkọlọtọ Young Democratic Party zọọ ọchịchị ebe ndị na-ama ya aka bụ Chris Uba na Obinna Uzor.

Ha kpụpụrụ Ubah n'ụlọikpe kwuo na o ji asambodo 'NECO' adịgboroja zọọ ọkwa sịnetọ n'ọnwa Febụwarị 2019.

BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'olu Ifeanyi Ubah mana ọ zaghị ekwentị ya.

Onye bụ Ifeanyị Ubah?

  • Ifeanyi Uba bụ onye ji ego achụnta ego ejiri ụlọọrụ Capital Oil mara.
  • A mụrụ ya na Septemba n'afọ 1971 dịka ọkpara n'ime ụmụ asaa nna na nna ya bụ Alphonsus Ubah mụrụ.
  • Ọ lụọla nwaanyị ma mụọ ụmụ ise.
  • Ọ bụ onye Otolo, obodo obere dị n'Anambra Steeti.
  • Ọ gụtụrụ akwụkwọ na Premier Academy Lugbe dị n'Abuja mana ọ gụchaghị makana nne na nna ya enweghị ego iji zụọ ya.
Sinetọ Ifeanyi na Sịnetọ Bassey Akpan

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah/Facebook

Nkọwa foto, Sinetọ Ifeanyi na Sịnetọ Bassey Akpan n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa
  • Mana ọ gara ọzụzụ dị icheiche n'azụmaahịa na ọchịchị.
  • Ifeanyi bidoro ụlọọrụ 'Capital Oil' n'afọ 2001.
  • Ọ bụkwa ya nwe Ifeanyi Ubah F.C. , nke na-azabụ Gabros International Footbal Club bụ nke so na-egwu bọọlụ Premiere league Naịjirịa.
  • Ifeanyi Ubah zọburu ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'afọ 2014 n'aha Labour Pati.
  • N'afọ 2019 Ubah so zọọ ọkwa Sinate maka ịnọchite anya Anambra South Senitorial zone n'aha Young Democratic Party (YPP).
  • Inec kpọpụtara ya dịka onye meriri ya bụ ntulika 2019 maka ịnọchite anya ndị ọgbọnta vootu ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: