SSA on house pool, Ministry of Happiness nakwa ọkwa gọọmentị ndị ọzọ pụrụịche

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Osun steeti bụ Ademola Adeleke akụwaala akụoyibo nsugbe gbasara otu ọkwa na gọọmentị ya bụ SSA on house pool.
Nke a bịara dịka o wuru ebe niile na ọ họpụtara otu nwoke aha ya bụ Oyetunji Abefe n'ọkwa gọọmentị ahụ.
Ọ bụkwa ọdeeakwụkwọ gọọmentị bụ Teslim Igbalaye binyere aka n'ime akwụkwọ ahụ ma zigakwara Abefe ozi ekele na nnabata.
N'ime edemede nkọwa nke Olawale Rasheed dere, o kwuru sị na ọkwụ ahụ adịla na gọọmentị kemgbe afọ iri na abụọ gara aga.
Ọkwa gọọmentị ndị ọzọ pụrụiche nke ndị Gọvanọ hibere
Ọ bụghị ihe ọhụrụ ndị gọvanọ ịkepụta ọkwa ọhụrụ ga-enweike ịkwụsị nsogbu ọbụla ha zutere.
Lee ọkwa ndị ọzọ ndi gọvanọ kewapụtara nwere ka ọ dị:
Ministry of Happiness: N'afọ 2017, Rochas Okorocha bụ Gọvanọ mgbe ahụ kere 'ministry of happiness'. Ọ họpụtara Ogechi Ololodi dịka Kọmịshọna for Happiness and Purpose fulfillment. Ọrụ ya dịka Rochas si kọwa bụ ịhazi ngalaba ndị ọzọ ịrụ ọrụ ha n'ụzọ ga-enye ndị steeti ahụ aṅụrị.
Special assistant on Divorcees: Aka na-achị Bauchi steeti bụ Bala Mohammed họpụtara Balaraba Ibrahim n'ọkwa pụrụiche a ka o nweeike hazie enyemaka gọọmentị n'ebe ndị gbara alụkwaghịm na steeti ahụ nọ.
Mukhtar Gidado na-ekwuchitere Gọvanọ steeti ahụ kọwaara BBC na e hibere ọkwa ahụ n'ihi na ọ dị mkpa ịlekọta ndị gbara alụkwaghịm.
Special Assistant on graveyard matters: Na Kano steeti n'afọ 2018, a họpụtara Yakubu Nagoda dịka onye enyemaka gọvanọ n'ihe gbasara ili ndị mmadụ. Nagoda mechara gbaa arụkwaghị m n'enyeghị nkọwa ọbụla.
Special Assistant on streetlights: N'otu Kano steeti ahụ n'afọ 2020 ka onye bụ Gọvanọ mgbe ahụ bụ Ganduje họpụtara mmadụ atọ ga-anọ n'ọkwa a. Ọ bụ otu nwoke a kpọrọ Auwal Salisu nakwa ndị ọzọ ka-enyere ya bụ ọkwa.









