Nwa ọhụrụ nne ya mụrụ ma tụnye ya n'ụmị mposi anwụọla - Gọọmentị Anambra

Ebe foto si, Nonye Soludo
Nwunye Gọvanọ Anambra Steeti bụ Nonye Soludo ekwupụtala na nwa ọhụrụ a zọpụtara n'ime ụmị mposi ebe nne ya tụnyere ya dịka ọ mụchara ya, abalị atọ gara aga, anwụọla.
Oriakụ Soludo kwuru na ozi ọnwụ nwata ahụ wutere ya nke ukwuu n'ihi na ya na-akwado ịga leta nwata ahụ n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.
"Dịka nne maara ihe mbgu na ahụhụ dị n'ịmụ nwa nakwa obiụtọ dị n'iku nwa nke gị, ozi a wutere m rinne, mana ọ na-arụtụ aka n'ụdị ọnọdụ ọjọọ obodo anyị nọ n'ime ya ugbua," ka Nonye Soludo kwuru.
"Ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na ndị nlekọta ụmụaka tinye uchu n'ọrụ aịzụlite ụmụaka n'ụzọ kwesịrị ekwesị, maka na ọ dị nnukwu mkpa iji kwalite obodo."
Etu e si zọpụta nwata ọhụrụ ahụ n'ime ụmị mposi
Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde, bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst 2023, ka a zọpụtara otu nwata a mụrụ ọhụrụ dịka a sị na nne ya tụnyere ya n'ime mposi n'obodo Otuocha dị n'okpuru ọchịchị Anambra East, n'Anambra Steeti.
Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị n'Anambra Steeti bụ Ify Obinabo kwuru na anwụchiela nwa agbọghọ aha ya bụ Nwaedoka Chidimma, onye obodo izzi n'Ebonyi Steeti, bụ onye e boro ebubo na ọ bụ ya mụrụ nwa ọhụrụ ahụ ma tụfuo ya.
Otu onye hụrụ ihe a merenụ, onye nyere aha ya dịka Esther, kọọrọ ndị ntaakụkọ na nwaagbọghọ ahụ bụ Chidimma, onye dị ime n'oge ahụ, na-arụ ọrụ n'ubi mmadụ oge o kwuru na ya chọrọ ịga mposi.
"Ọ na-arụ ọrụ n'ugbo n'ụbọchị ahụ oge o kwuru na afọ na-enye ya nsogbu, na ya chọrọ ịga mposi n'ụmị mposi dị n'akụkụ ubi ahụ," Esther kwuru.
"Dịka ọ nọchara obere oge n'ime mposi ahụ wee pụta, anyị hụrụ ihe dịka ọbara na-apụta n'ahụ ya.
"Eche m na ọ mụọla nwa nwụrụ anwụ, m wee mee ngwangwa kpọọ otu nọọsụ ka ọ bịa nyere ya aka, nọọsụ ahụ wee kwuo na nwa ahụ apụọla.
"Agwara m ya ka ọ laa ụlọ ga kọọrọ nne na nna ya ihe merenụ, maka na m chere na nwa ya nwụrụ anwụ.
"Ọ bụzi n'ụbọchị Tuzde oge anyị nụrụ olu nwa na-ebe akwa, ka anyị jiri obe gbadaa n'ime ụmị ahụ wee zọpụta nwa ọhụrụ ahụ ma kpọkuo ndị ọrụ nchekwa nakwa Mịnịstrị na-ahụ maka ọdịmma ụmụ nwaanyị na ọha obodo."
Ify Obinabo kwuru n'oge ahụ na nwa ọhụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ nkuzi nke Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n'Awka ebe a na-enye ya ọgwụgwọ.
Mana akụkọ pụtara n'ụtụtụ Tọzde na nwata ahụ anwụọla.
Toochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti gwara BBC Igbo na nwa agbọghọ ahụ tufuru nwa ya nọ n'aka ndị uweojii ugbua.












