Christian Atsu: E bulatala ahụ ọgba bọọlụ Ghana nwụrụ n'ala ọma jijiji na Turkey

Ebe foto si, Reuters
Ahụ ọgba bọọlụ mba Ghana bụ Christian Atsu, onye nwụrụ n'ihe mberede ala ọma jijiji mere na mba Turkey n'izuụka abụọ gara aga, alọghachila Ghana.
Ụgbọelu bu ahụ Atsu tụrụ ụkwụn'ọdụ ụgbọelu dị n'Accra n'abalị ụbọchị Sọnde dịka ndị agha mba Ghana buturu akpati ozu ahụ.
Osote Onyeisiala Ghana bụ Mahamudu Bawmia onye nọ n'ọdọụgbọelu Kotoka iji nabata ahụ Atsu kwuru sị: "Anyị nwere olileanya, na-ekpe ekpere kwa ụbọchị na a ga-achọta Atsu na ndụ, mana oge a hụrụ ya, ọ nwụọla."
Bawmia kwuru na Atsu bụ ọgbaa bọọlụ ọtụtụ mmadụ hụrụ n'anya onye ọnwụ ya bụ nnukwu ihe mwute.
O kwere nkwa na ha ga-enye ya olili kwesịrị ya.
A chọtara ahụ Atsu n'ụbọchị Satọde n'ime ụlọ ya bụ nke dara ada oge ala ọma jijiji ahụ mere na mpaghara Ndịda Turkey.
Atsu, dị afọ 31, na-agba bọọlụ n'otu Hatayspor nke dị na Turkey, ọ gbaara mba Ghana bọọlụ ugboro 65 ma sorokwa ruo agba nke ikpeazụ nke iko mba Afrịka n'afọ 2015.
Ọ gbakwaala bọọlụ n'otu Everton na Newcastle n'asọmpi English Premier League.
Christain Atsu: Ihe onyeisiala Ghana, NFF na ndị ọzọ na-ekwu dịka a hụrụ ozu ọgba bọọlụ a nwụrụ n'ala ọmajiji Turkey

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onyeisiala Gana bụ Nana Akufo- Addo atụọla arịrị maka ọnwụ ọgba bọọlụ mba Gana nwụrụ n'ala ọmajiji mere n'Ọdịda Anyanwụ mba Turkey.
A hụrụ ozu Christian Atsu, gbara afọ 31 n'okpuru ụlọ ebe o bi nke dara ka ọ gachara ihe karịrị abalị iri ala ọmajiji mere n' abalị isii nke ọnwa Febụwarị, afọ 2023,ji mee.
Atsu, gbaburu Chelsea bọọlụ so na mmadụ 45,000 nwụrụ n'ala ọmajiji ahụ a dịka a ka na-abọpụta ozu ndị tọrọ n'okpuru ihe ndị dara ada n'ọdachi ahụ.
N'ozi ya, onyeisiala mba onye tiri nwunye ya na ezinaụlọ ya aka n'okwu kwuru na, "otu n'ime ndị Gana ji eme ọnụ n'egwu bọọlụ alaala."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Otu na-ahazi egwu bọọlụ na Naijiria bụ NFF n'ịchafụ tiri ogbo ha nke mba Gana, ezinaụlọ Christian Atsu nakwa ndị enyi ya aka n'obi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Hatayspor bụ otu egwu bọọlụ ọ na-gbara bọọlụ tụpụ ọ nwụọ sịrị, "Anyị enweghị mkpụrụokwu anyị ga-eji akọwa obi mwute anyị."
"Anyị agaghị echefu gị, Atsu. Udo dịrị gị,ezigbo mmadụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Hatayspor bụ otu egwu bọọlụ mba Turkey kwuburu na a zọpụtara Atsu mana o merụụ ahụ mana mecha gbanweee okwu ka otu abalị gachara.
Ihe ndị e ji echeta Atsu

Ebe foto si, Christian Atsu/Twitter
Atsu bụ nwa afọ Gana na -agbara otu egwu bọọlụ Hataspor nke mba Turkey tupu ọ nwụọ.
Nw amadi ahụ a mụrụ n'abalị 10 nke ọnwa Jenụwarị afọ 1992 na Gana bụ ejima, ejima ya nwaanyị bụ Christiana Twasam.
Ọ gbara ọtụtụ egwu bọọlụ ndị ọzọ gụnyere Chelsea, Portcco,Everton, Newcastle United na Al-Raed.
Ọtụtụ ndị mba ya agaghị echefu ya n’ihi ọrụ ebere ọ rụrụ oge ọ dị ndụ.
N'afọ 2018, Atsu kwụụrụ mmadụ 53 nọ mkpọrọ na Gana maka ịda iwu erijughị afọ ma nye ha ego ha ji malite ahịa.
Nwaamadị ahụ a mụụ n'abalị 10 nke ọnwa Jenụwarị afọ 1992, enyela ọtụtụ ụlọakwụkwọ nakwa ụlọ ndị enwe-nne,enwe-nna na Gana ọtụtụ ihe onyinye.
Ọ lụrụ nwaanyị, Marie-Claire Rupio, ha ji ụmụaka atọ; nwoke abụọ na otu nwaanyị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4









