Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ala ọma jijiji na mba Turkey na Syria agafeela 41,000

Ala ọma jijiji na Turkey

Ebe foto si, Getty Images

Ndị nwụrụ n'ihe mberede ala ọma jijiji nke mere na mba Turkey nakwa Syria n'ụbọchị Mọnde gara aga akarịala mmadụ 41,000 ugbua dịka ndị ọchịchị mba abụọ a si kwupụta.

N'ụbọchị Satọde, Oka azọpụtara mmadụ atọ ọzọ dịka ụbọchị 11 gachara.

Hakan Yasinoglu nọrọ n'ime ụlọ dara ada awa 278 tupu ndị ọrụ gbatagbata azọopụta ya.

Azọpụtakwara nwa ntoroọbịa bụ Osman Halebiye na Mustafa Aci dị afọ 34 na mpaghara Antakya.

Ndị ọrụ gbatagbata na'ekwu na olileanya ịchọta ndị mmadụ na ndụ na-agbada n'ike n'ike n'ihi na ọ karịala abalị isii ala ọma jijiji ahụ mere.

Ha na-atụkwa egwu na ọnọdụ nchekwa nwereike ịkawanye njọ dịka nri na-agbada n'obodo.

Nzọpụta dị ịtụnanya ka awa 100 gachara

Ala ọma jijiji na Turkey
Nkọwa foto, A zọpụtara Merve na nwanne ya nwaanyị bụ Irem mana nne ha nwụrụ

N'ụbọchị Satọde, ndị ọrụ gbata gbata zọpụtara mmadụ ise si n'otu ezinụlọ na mpaghara Gaziantep nke mba Turkey.

Ndị ntaakụkọ AP kwuru na ha gụnyere otu nne na nna na ụmụ ha atọ - ụmụ nwaanyị abụọ na otu nwoke.

Azọpụtakwara otu nwata nwaanyị dị afọ asaa na mpaghara Hatay, dịka ọ nọrọla ihe ruru awa 132 n'okpuru ụlọ dara ada.

Onyeisi ndị ọrụ enyemaka nke otu 'United Nations' bụ Martin Griffiths gwara BBC na ala ọma jijiji a mere na Turkey bụ nke kacha njọ n'ime afọ 100.

O kwukwara na etu mba dị icheiche si zaa oku enyemaka gbasara ya bụ ọdachi juru ya afọ.

"Ihe karịrị mba otu narị ezitela ndị ọrụ ha nakwa ihe enyemaka ebe a n'ihi ọdachi a," Griffiths kwuru.

Turkey Earthquake: Ọtụtụ chọrọ ka e kunye ha nwa ọhụrụ a zọpụtara n'ime ala ọmajijiji

Aya, nwa ọhụrụ ekupụtara n'okpuru ụlọ dara na Syria n'ala ọmajiji
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Puku kwuru puku ndị mmadụ ekwuputala mmasí ha ikuru nwa ọhụrụ ahụ a mụrụ n’okpuru ụlọ dara n’Omajiji mere na a Syria na ụbọchị Monde.

When a sọpụtara Aya- nke pụtara Ọrụebube n’Arabik-olulu ụwa ya ka jịkọtara ya na nne mụrụ ya.

Nne ya, nna ya, na ụmụnne ya anọ nwụrụ ka ọmajiji ahụ metụtara Jindayris.

Ihe onyonyo gosiri ka a na-azọpụta Aya wuru ewu na soshal midia. dịka otu nwoke ku nwa etum juru ahụ n’’aka ji ọsọ si n’ụlọ dara ada gbara ọsọ apụta.

Ugbua Aya nọ n’ụlọọgwụ,. Dọkịta ụmụaka na-eleọta ya bụ Hani Marouf, kwuru sị “ Mgbe a kutere ya n’ụbọchị Monde, o bucha akpụ nakwa apa, oyi ji ya ,iku ume rakwara ya ahụ.”

Mana ugbua ọnọdụ ya adịla mma.

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal media arịola arị®ịọ etu ha ga-esi new ike kuru nwata ahụ ka ọ bụrụ nwa ha.< Otu kwuru sị, “ Achọrọ m ị kụrụ ya, izulite ya ọfụma.”Thousands of people on social media have now asked for details to adopt her.

Otu onye ntaakukọ TV na mba Kuwait sịrị, “Adị m njikere ileta nwa ọhụrụ, kpọrọ ya dịka nke m ma ọ bụụ na usoro iwu nye m ohere ya."

Turkey Earthquake: Ndị nwụrụ n' ala ọmajiji Turkey nwereike iru mmadụ 20,000

Onye a gbapụtara n'ụlọ dara na Turkey

Ebe foto si, Reuters

Opekata mpe mmadụ ruru 19,000 anwụọla na ọdachi ala ọmajiji mere nam ba Turkey na Ugwu mba Syria.

Ndị mmadụ na-ekwu na-akatọ gọọmentị sị na ọnọdụ gbatagbata na-akpụ ka ejula, na-ekwukwa na gọọmentị adịghị njikere dịka ha kwesịrị.

Mana Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan kwuru na ọchịchị ya na-agbalị mana ọ siri ike ịkwado maka ụdị ọdachi ahụ dagidere ha n’ihi na ihe mere ebuka.

Recep Tayyip Erdogan

Ebe foto si, Reuters

Onye ndu otu pati anọghị na gọọmentị bụ Kemal Kilicdaroglu ekweghị na nke a.

Ọ sịrị, "Ọ bụrụ na e nwere onye ụta dịịrị, ọ bụ Erdogan."

Mana onyeisiala Erdogan anabataghị ebubo a, sị na ọ dị mkpa iji otu obi were so ọdachi ahụ.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ na Hatay sị, "N'ụdị oge a, agaghị m anabata ndị na-agbasa akụkọ ọjọọ n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị."

Puku kwuru puku ndị ji ndu ha pụta anọọla abalị nke atọ ha n'oke oyi, ebe oke oyi na-atụ ndị nọ n'okpuru ime ụlọ ndị a dara.

Ụjọ, anya mmiri dịka ndị nwụrụ n'ala ọma jijiji na Turkey na-eru 20,000

Ndị ọrụ gbatagbata na Turkey

Ebe foto si, EPA-EFE/REX/Shutterstock

Ka ọ dị ugbua, ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụla na ya bụ ọdachi akarịala 19,000.

Na Turkey, ndị a hụrụla nwụrụ anwụ bụ mmadụ 16,546, dịkaz onyeisiala mba ahụ siri kwuo, ebe ndị nke mba Syria dị 3,162.

Ọtụtụ mba dị icheiche ezigarala Turkey na Syria ozi iti aka n'obi nakwa ihe onyinye dị icheiche iji nyere ndị ọdachi a metụtara aka.

Ahmet Eyup Turkaslan

Ebe foto si, Yeni Malatyaspor

Nkọwa foto, Ahmet Eyup Turkaslan sonyere otu bọọlụ Yeni Malatyaspor n'afọ 2021

Oche bọọlụ ndị otu egwu bọọlụ Yeni Malatyaspor bụ Ahmet Eyup Turkaslan so na ndị nwụrụ n'ihe mberede a dịka otu bọolụ ahụ si depụta.

"Oche bọọlụ anyị bụ Ahmet Eyup Turkaslan, tụfuru ndụ ya dịka ọ nọ n'ime ụlọ dara ada n'oge ala ọma jijiji ahụ. Zuo ike na ndokwa," ka ha dere na Twitter.

E tinyela ọnọdụ ọdị ụkọ na mba maka alaọmajijiji mere ebe ahụ

A zọpụtara nwata

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Erdogan etinyela ọnọdụ ọdị ụkọ na mba ha site ugbua ruo ọnwa atọ maka ọdachi alaọmajijiji mere n’ụbọchị Mọnde.

Erdogan sị na ndị nwụrụla na Turkey eruola puku atọ, narị ise na iri anọ na itoolu (3,549), ebe ihe karịrị mmadụ otu puku na narị isii (1,600) anwụọla na Syria.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọnọdụ gbata gbata o tinyere ga-eme ka enyemaka dị iche iche ruo mpaghara ebe ihe ndị a mere ngwa ngwa.

Ọnọdụ ọdị ụkọ na mba a ga-akwụsị tupu e mee ntuliaka n’ụbọchị 14 Mee, ebe Erdogan ga-azọ ọkwa ịnọgide n’ọchịchị karịa afọ iri abụọ.

Ọndọdụ ọdị ụkọ na mba nke ikpeazụ e tinyere na Turkey bụ n’afọ 2016, mgbe atụmatụ iwere ọchịchị n’ike kụrụ afọ n’ala, mana e buliri ọnọdụ a ka afọ abụọ gachara.

Ebe alaọmajijiji metụtara

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka alaọmajijiji mere na mba Turkey na Syria.

Ebe a na-azọpụta ndị tọrọ n'ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

Mmiri ozuzo na ijiriji na-emekpa ndị na-achọ ịzọpụta ndị mmadụ ụlọ dakwasịrị mgbe alaọmajijiji mere na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Turkey.

Ihe karịrị mmadụ puku ise anwụọle ebe ihe karịrị puku iri na ise merụrụ ahụ na Turkey nakwa n’okeala ha ndị Syria mgbe ọdachi a mere n’ụtụtụ Mọnde.

Ngalaba ahụike mbaụwa bụ World Health Organization adọọla aka na ntị na ọnụọgụgụ ndị a nwereike ịrị elu dị a ka na-achọpụta ndị ihe metụtara.

Ndị ọrụ gbata gbata mụrụ anya abalị dịka ha na-agba mbọ ịzọpụta ndị ka tọrọ n’ime ọtụtụ ụlọ ndị dara ada.

Ọtụtụ igwe e ji egwupụta ihe ka ndị a ji na-arụ ọrụ n’obodo Adana bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-enweghizi ụlọ ugbua maka ọdachi a mere.

Ụfọdụ n’ime ndị a ji naanị akpụkpọ ụkwụ ha, uwe nakwa ekwentị ha si n’ime ụlọ ha gbapụta mgbe alaọmajijiji ahụ mere.

Akụkọ na-ekwu na achọtala Christian Atsu, ọgba bọọlụ mba Ghana

Christian Atsu

Ebe foto si, Christian Atsu/Twitter

Nkọwa foto, Christian Atsu so na ndị tọrọ n'ụlọ dara ada oge ọdachi ala ọma jijiji mere na mba Turkey n' ụbọchị Mọnde

Akụkọ si mba Turkey apụta n'ụtụtụ Tuzde a na-ekwu na achọtala ma zọpụta Christian Atsu, bụ ogba bọọlụ mba Ghana onye ọdachi ala ọma jijiji mere na Turkey n'ụbọchị Mọnde metụtara.

Atsu so na ndị tọrọ n'ụlọ dara ada na Tọkị dịka ala ọma jijiji ahụ malitere. Ihe ruru mmadụ 4,800 alaala mmụọ na ya bụ ọdachi ugbua, dịka ndị ọchịchị mba Turkey si kwuo.

Onye ntaakụkọ na mba Turkey aha ya bụ Yağız Sabuncuoğlu bụ onye kwuru na achọtala Atsu n'ime ụlọ dara ada ma buru ya gawa ụlọọgwụ

Akụkọ maka Christian Atsu

Ebe foto si, Twitter

Sabuncuoğlu mechara wepụta ozi ọzọ ebe o kwuru na onyeisi otu bọọlụ Hatayspor - ndị Christian Atsu na-agbara bọọlụ -gwara ya na eburula Atsu gawa ụlọọgwụ dịka o merụrụ ahụ.

Atsu

Ebe foto si, Twitter

N'ụbọchị Mọnde, Onyeisiala mba Ghana kwuru na obi ya nakwa ekpere ya nọ n'ebe ndị mba Turkey nọ n'ihi ọdachi dakwasịrị ha.

O kwukwara na ya na-ekpe ekpere ma nwekwaa olileanya na a ga-achọta Christian Atsu n'ahụ ike.

Turkey Earthquake: Ndị nwụrụ n'ihe mberede a akarịala mmadụ 4,300 ugbua

Ndị ọrụ enyemaka na Turkey

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha mba Turkey esonyela n'ọrụ gbatagbata iji chọọ ma zọpụta ndị tọrọ n'ụlọ dara ada n'ihi ala ọma jijiji a mere n'ụbọchị Mọnde.

Ihe karịrị mmadụ 4300 bụ ndị a maara nwụrụla n'ọdachi ihe mberede ala ọma jijiji nke mere na mba Turkey na Syria n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde.

Ọnụọgụgụ ndị merụrụ ahụ n'ihe mberede a karịrị 15,000, dịka gọọmentị mba ahụ si kwuo.

Ndị ọrụ gbatagbata ka nọkwa n'ebe ya bụ ihe mberede mere, na-agba mbọ ịmata mmadụ ole ha nwereike ịzọpụta.

Ọtụtụ mmadụ ka tọrọ atọ n'ime ụlọ elu dị icheiche bụ ndị dara ada oge ya bụ ala ọma jijiji mere.

Ala ọma jijiji na Turkey

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ndị ọrụ enyemaka rụrụ ọrụ ogologo abalị niile ịzọpụta ndị tọrọ n'ime ala

Oke oyi, snow nakwa mmiri ozuzo mekwara ka ọrụ enyemaka siwanye ike na mpaghara ahụ dịka ọtụtụ ndị tọrọ n'ime ala na-akpọ oku enyemaka, mana ndị ọrụ enwenwughị ike irute ha.

Otu nwoke aha ya bụ Deniz, onye so na ndị ọrụ gbatagbata na mpaghara Hatay nke mba Turkey, kwuru na ha na-anụ olu ndị ahụ tọrọ n'ime ụlọ, mana ha enweghị ike iru ha.

"Ha na-eme mkpọtụ mana onweghị onye na-abịa," Deniz ji anyammiri kwuo.

"Anyị amaghị ihe anyị ga-eme. Chineke m... Ha na-akpọku anyị. Ha na-asị, 'zọpụtanụ anyị', mana anyị enweghị ike ịzọpụta ha..."

Na mpaghara Syria, Raed al-Saleh, onye nọ n'otu ndị gbatagbata a na-akpọ 'White Helmets', kwuru na oge na-aga iji zọpụta ndị ka tọrọ atọ n'ime ụlọ dara ada.

Ọgba bọọlụ Christian Atsu so na ndị tọrọ n'ime ụlọ dara ada

Christian Atsu

Otu na-achịkọta egwu bọọlụ mba Gana bụ " Ghana Football Association" akpọọla oku ekpere maka nwaafọ ala ha bụ Christian Atsu dịka a na-eche na o so na ndị tọrọ n'ime ụlọ dara ada na Turkey n'ihi ihe mberede ala ọma jijiji.

Akụkọ kwuru na Atsu, gbara afọ 31, na onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Hatayspor Sporting bụ Taner Savut toro n'ụlọ na mba Turkey.

Earthquake in Turkey: Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ala ọmajijiji Turkey agafeela 2300

Ndi ọrụ gbatagbata ka na-azọpụta ndị tọrọ n'ime ọdachi ahụ

Ebe foto si, Reuters

Ala ọmajijiji nke ukwu dakwasiri Ọwụwa Anyanwụ mba Turkey n'agbata ha na mba Syria n'ụzọ ụtụtụ ụbọchi Monde ataala isi ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị atọ na mba abụọ ahụ ebe ha na-ehi ụra.

N'otu aka ahụ, ndị merụrụ ahụ n'ọdachi ahụ akarịala 9,700.

Ụlọọrụ gbatagbata mba Turkey kwuru na ihe karịrị mmadụ 1500 nwụrụ na be ha, ebe a na-ekwu na ihe ruru mmadụ 810 nwụrụ na Syria.

A na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọdọchi ahụ ga-agbalite dịka ndị gbatata n'achọ ndị tọọrọ n'okpuru ụlọ ndị dara dịka okeoyi na-atụ n'ihi akụmmiriigwe na-ada butere.

Onyeisiala mba Turkey bụ Erdogan kwuru na mba ahụ ahụbeghị ụdị ọdachi n'ogologo oge.

Ngalaba mba US na-enyocha ụdịrị ihe a mere kwuru na ala ọmajijiji ahụ mere ihe dịka ebe elekere anọ nke ụzụ ụtụtụ (bụ elekere abụọ na Naịjirịa) na mba ahụ.

N'agbanyeghi na nke a mere, alaọmajijiji ọzọ mere n'obodo a kpọrọ Elbistan na mpaghara Kahramanmaras.

Dịka ihe si kwụrụ ugbua a, ihe karịrị otu puku anwụọla na Turkey ebe ihe karịrị narị asaa nwụrụ na Syria.

N'ime ndị merụrụ ahụ na mba Turkey ruru 5385 ebe ndị merụrụ ahụ na Syria dị 2000.

Ihe meburu n'ala ọmajijiji nke mbụ

Ụlọ na ụgbọala nke alaọmajijiji ahụ dapịara

Ebe foto si, Anadolu Agency via Getty Images

Dịka ebe ọmajijiji ahụ metụtara dị nso n'oke ala Turkey na mba Syria, mmadụ 230 nwụrụ site na ya na Syria ebe mba Lebanon na Cyprus nụkwara ya bụ ala ọmajijiji be ha.

Osote onyeisiala mba Turkey bụ Fuat Oktay na-ekwu na ọnụọgụgụ ndi nwụrụ na Turkey esila na 76 rigoo 284 nke mere na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ agafeela 500.

Mpaghara ebe ndị ọnwụ a metụtara n'ime mba Turkey gụnyere Aleppo, Latakia, Hama nakawa Tartus.

Dịka akụkọ ka na-amalite, ọ pụtala ihe na anụrụ ụda ya bụ alaọmajijiji na Gaza dị nso na mba Izrel nakwa Palestine.

A na-atụ egwu na ọnụogụgụ ndị nwụrụ ka ga na-agbali elu dịka a na-achọpụta ma na-azọpụta ndị mmadụ n'okpuru ụlọ ndị dara.