Ikike ị kwụsị 'Sit-at-home' a ka dị Ipob n'aka?

Ndị echeere bụ 'unknown gunmen'

Ebe foto si, Screenshot/Other

Ọgọst afọ 2022 ga-eme ya afọ abụọ kemgbe otu Ipob (Indigenous people of Biafra) manyere ọnọdụ 'sit at home' kwa ụbọchị Monde iji gosi iwe ha maka gọọmentị Naịjirịa jichiri onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Kemgbe mgbe ahụ, otu Ipob ahụ kwa apụtala kwuo ụfọdụ oge na ha ewepụla ya bụ atụmatụ ma kpọọ ndị mmadụ oku ha pụta gara mkpa ha.

N'agbanyeghi oku a Ipob na-akpọ kwa mgbe kwa mgbe, ihe na-ebe ka na-ebe dịka ndị mmadụ anaghị apụtachazi eme ihe n'ụbọchị Monde ọbụla.

Ọ bụghị naanị otu Ipob kpọrọ ndị mmadụ oku ha kpochapu ya bụ atụmatụ, otu Ohaneze Ndigbo bụkwa otu ọzọ si ndị mmadụ pụta n'ụbọchị Monde mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

Ndị ọzọ mere ihe yiri nke a bụ njikọ aka ndị ụka Katọlik na ụka Anglịkan kpere ekpere n'ọnwa Eprelụ afọ 2022 ka atụmatụ a bie n'Anambra steeti.

Ọ bụ nke mere ka BBC kpọtụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nchekwa ala aha ya bụ Mike Ejiofor ka ọ kọwaa ya bụ ihe ọfụma.

Ejiofor kọwara na ọ gaghị adịzịrị Ipob mfe ịkpochapụ ya bụ atụmatụ.

Ọ sị "Ọ dị mfe ịkwatu mana ọ dịghị mfe ịrụpụta ihe".

Ọ sị na ugbua, okwu ihe gbasara 'sit at home' aghọrọla ihe ọzọ bụzị ihe ndọrọndọrọ.

Ipob agaghị akwụsịnwu ya bụ atụmatụ n'ihi na ụjọ abaala ndị mmadụ ahụ gbasara idebe ya bụ atụmatụ.

"Ọsọ ha kpoo oku nkwụsị ya, ndị mmadụ agaghị atụkwasị obi na ọ bụ Ipob n'onwe ha na-ekwu ya n'ezie" ka Ejiofor kọwara.

Ọ kọwakwara na oke mwakpo so ya bụ atụmatụ pụta so cha n'ihe na-eme ka ndị mmadụ gbachie onwe ha n'ime ụlọ iji hapụ ndụ na akụnaụba ifunarị ha.

Ụzọ tọgbọ chakoo n'Awka
Ụzọ tọgbọ chakoo n'Awka

Unknown gunmen

Ndị omekome bu egbe

Ebe foto si, Screengrab/Other

Ihe ọzọ si na mkparịtaụka Ejiofor na BBC were pụta bụ na ọ kọwara ihe na-atụ ndị mmadụ ụjọ.

Ọ kọwara na ndị 'unknown gunmen' ndị omekome amaghị ndị ha bụ na-amanye 'sit-at-home' sozi n'ihe na-eme ka ụjọ jide ndị mmadụ.

Cheta na kemgbe ọnwa Ọgọst ahụ amanyere 'sit-at-home' iji kwanye gọọmentị ọkụ n'ike ka atọghapụ Nnamdi Kanu, mwakpo a na-eme ma mmadụ nkịtị nakwa ndị ọrụ nchekwa arịala elu.

Ndị omekome bu egbe ndị mmadụ na-akpọ 'unknown gunmen' na-apụtakarị n'ụbọchị Monde ahụ ịwakpo ndị ha hụrụ na-agara mkpa ha.

Ụjọ ọnwụ na ọsọ ndụ bụzị ihe mere ka ndị mmadụ nọrọ n'ime be ha kama ịpụta gaa mkpa ha.

Ihe Gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ nwere ikwu

David Nweze Umahi

Ebe foto si, Ebonyi State Government

"Ọ bụ ụjọ ji ndị mmadụ" ka Chuks Okoh bụ ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ David Umahi bụ onyeisioche ọgbakọ Gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ kwuru.

Okoh gara n'ihu kwuo na ihe ọzọ mere 'Sit at home' ka ji aga n'ihu bụ na o nwere ndị jizi ụbọchị Monde ahụ mere ezumike.

"Ị ma etu ndị mmadụ si eche echiche, ụfọdụ ndị umengwu ezoola n'okpuru atụmatụ ahụ ma jụ ịpụta n'ụbọchị Monde mee ihe ọbụla".

Ọ kọwara na ndị ọrụ dị mkpa dịka ndị na-azụ ahịa n'ụfọdụ ahịa dị icheiche na-ejikọ aka chọtara onwe ha nchekwa zuruoke iji hụ na o nweghi onye wakporo ha ma ha pụta n'ụbọchị ahụ.

Mgbe BBC Igbo jụrụ Okoh ma ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ awụlitere nchekwa n'ụzọ zuruoke iji mee ka obi sie ndị mmadụ ike ịpụta gara mkpa ha kwa ụbọchị Monde, ọ zara sị "agaghị m ekwuru Gọvanọ ndị ọzọ mana n'Ebonyi steeti, o nweghi ihe dị ka sit at home.

Anyị ehiwela nchekwa na-ewepuru ndị mmadụ ụjọ n'ịme ngagharị, dịka o nwe m ugbua, a nọ m n'ụlọorụ m na-arụ ọrụ" ka o kwuru.