Ipob sit at home: Lee ọnọdụ Ọwụwa Anyanwụ n'ụbọchị Mọnde ka Ohanaeze sị onye ọbụla pụta

Okwu ịnụ n'ụlọ na anọghị n'ụlọ ka bụ ihe akpụ n'ọnụ n'Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde ọbụla.
Ndị mmadụ ka na-atụle ka ọnọdụ si aga na-agbanyeghi na Ohanaeze Ndigbo wepụtara ozi ma sị ka ndị mmadụ pụta.

Ozi ha na-abịa dịka otu Ipob kagburula iwu ịnọ n'ụlọ ọtụtụ izuụka gara aga, mana kedụ ka o si dị ugbua?
N'Abakaliki
Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Abakaliki nke Ebonyi Steeti kpagharịrị n'ọtụtụ ebe dị n'obodo ahụ ịmara ka ihe si aga.

Ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ pụtara na-aga mkpa dịịrị ha na-enweghi ihe gbochi ọbụla.
Ụfọdụ ụlọ ahịa mepekwara emepe mana ọ bụghị ka o si adịbu na mbu mgbe ịnọ n'ụlọ malitere ọhụrụ.
Gawa mkpa gị n'ụbọchị Mọnde ọbụla - Ohanaeze

Ebe foto si, Hope Uzodimma Facebook Page
Ohanaeze Ndigbo agwala ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ ka ha na-aga mkpa dịịrị ha n'ụbọchị Mọnde ọbụla na oge ịnọ n'ụlọ agaala.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Mazi Alex Ogbonna wepụtara n'ụbọchị Sọnde.
Ha gaara n'ihu kwuo ka ụlọakwụkwọ niile malitekwa agụmaakwụkwọ, ka ndị ọrụ ụgbọala malite ọrụ maka na ndị ndu Ipob akagbuo iwu ịnọ n'ụlọ ụbọchị Mọnde ọbụla.
Onyeisi ndị Ohanaeze bụ George Obiozor jikwa ohere ahụ kelee ndị Ipob maka 'ịmịnye mma ha n'ọbọ' na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti site n'ịkagbu iwu ịnọ n'ụlọ.
Obiozor sị na Ipob ji otu akụ gbagbu nnụnụ abụọ nke gụnyere; ime ka ihere mee ndị chọrọ ọgbaghara n'ala Igbo nakwa igosi nnrubeisi n'arịrịọ ndị okenye.
Ọ gaara n'ihu kwuo na ọ bụ ihe ọṅụ na ndị ndu Igbo niile gụnyere ndị ụka, ndị eze nwere otu obi n'ịgba mbọ hụ na a tọhapụrụ Nnamdi Kanu.










