Mwakpo ndị ọrụ ugbo n'obodo Nimbo na-ewute anyị - Ohaneze Ndigbo

George Obiozor, Onyeisi Ohaneze Ndigbo

Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu/Twitter

Ọhaneze Ndigbo akpọọla gọvanọ steeti ọwụwa anyanwụ dị icheiche ha mee ka otu nchekwa Ebubeagu rụwa ọrụ kwesiri ha n'ala Igbo

Ha kwuru nke a dịka ha na-ewkupute mwute ha maka etu ndị echeere bụ ọchịehi si wakpo obodo Nimbo n'Enugwu steeti.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia gwara BBC nke a n'ekwentị mgbe a kpotụrụ ya.

Ọ sị "o teela aka anyị kpọrọ ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ oku ha jisike jiri Ebubeagu rụọ ọrụ ka ọ pụta ihe"

"Ọ bụrụ na Ebubeagụ kwụsịrị ike ha si kwesi, a mara na ụdịrị ihe a agaghịzi na-eme etu a o si eme" ka o kwuru.

Ogbonnaya kwuru na mwakpo ahụ na ọnwụ ndị a nwụrụ wutere Ohaneze Ndigbo ọfụma.

Etu esiri wakpoo ndị ọrụ ugbo n'obodo Nimbo

Ndị na-enyere onye emrụrụ ahụ aka

Ebe foto si, Pitrus Obi

Akụkọ na-ekwu na ndị echere bụ ndị ọchịehị awakpoola ndị nọ n'ubi n'obodo Nimbo nke dị n'Uzouwani, Enugwu Steeti ụbọchị Mọnde.

Ya bụ mkpamkpa kpara n'elekere abụọ n'isi ụtụtụ.

Ka ọ dị ugbua ya bụobodo bụzị oke n'ọsọ, ngwere n'ọsọ.

Otu onye Opanda gwara BBC n'ihe kpatara ya bụ esemokwu bụ na ehi na atakarị ihe ndị ọrụ ugbo nke mere na ndị obodo jiri chụpụ ehi na emebi ihe ha kọrọ n'ugbo.

Onye emerụrụ ahụ

Ebe foto si, Pitrus Obi

Ọ tụziri ha n'anya n'isi ụtụtụ Monde ka ndị echere bụ ndị ọchịehi wakporo ndị nọ n'ụbi ha.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe kwetara na ọ bụ eziokwu na ndị nwakpo ji mma gbukasịa ahụ ndị mmadụ n'Opanda dị n'okpuruọchịchị UzoUwani, were kwuo kwa na ọtụtụ n'ime ndị ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Aha onyonyo, Sunny Omekedo

N'ozi Ndukwe wepụtara, osiri na Opanda ejuola oyi ugbua ebe okwuru na Kọmịshọna uweojii Enugwu steeti bụ Ndatsu Aliyu ayọọla ka onye ọbụla deere jụụ ma hapụ ndị uweojii ka ha tinye anya na mmiri chọpụta ihe merenụ.

Ihe otu onye obodo Nimbo gwara BBC Igbo

Otu nwoke aha ya bụ Victor Ike ma bụrụkwa onye obodo Nimbo kwuru na ọ bụ "n'ụtụtụ Mọnde ka anyị hụrụ ka ndị uweojii bu ozu mmadụ atọ na ndị emerụrụ ahụ gbafee".

Cheta na-awakporo obodo a n'ọnwa Aprel afọ 2015 gbuo ọtụtụ mmadụ.

Victor kwuru sị, "Anyị gbagara were chọpụta na ndị ọchiehi wakporo ndị nọ n'ubi ha arụ ọrụ, egburu mmadụ atọ ebe ụfọdụ ndị ọzọ merụrụ ahụ".

Aha onyonyo, Ebonyi herdmen attack: 'Etu ndị ọchiehi si wakpo anyị gbụọ otụtụ ndị be anyị'

Ọ kọwara na ọ bụ ndị zọpụtara onwe ha gwara ha na ọ bụ ndị ọchịehi wakporo ha ma sị na ọ bụ n'elekere otu nke ụtụtụ ka ndị a bịara wakpoo ha.

Victor kwukwara na ọ bụ ndị nọ n'ugbo ha ka ndị a bịara wakpoo.

O kọwara na ụfọdụ ndị ọrụ na-arahụ n'ugbo ha dịka ugbua bụ oge ọrụ ubi.

O kwuur na egwu dị n'obodo nke mere na ụfọdụ na-ala be ha ebe ụfọdụ na-agbaga n'ime obodo mepere emepe maka ụjọ.

Victor kwuru sị, "Ugbua ọdịghzị ndị nọ n'ugbo".

"Enweghị onye nwụrụ na mwakpo a" - Clement Akachukwu

Clement Akachukwu bụ onyeisi obodo Nimbo, nke dị n'Uwani Enugwu Steeti ekwuola ọ bụ n'ụbọchi Mọnde ka ndị nchekwa kpọrọ ya were gwa ya na-egburu mmadụ atọ n'ebe a na-akpọ Opanda nke jịkọrọ ha na Kogi Steeti.

Ọ kwuru na ọ bụ ndị nọ n'ugbo ha ka ndị a wakporo.

Akachukwu kwuru sị, "ụlọọgwụ Bishop Shanahan sị na ọ karịrị ihe ha ga-agwọ eji buru ha gawa UNTH".

O kwukwara sị, "Erughị m ebe ahụ, kama DPO uweojii ebe ahụ kwuru na-enwebeghị ndị nwụrụla".

Akachukwu kwuru na ebe ọ ka njọ bụ na ndị omekome a gbuchaa ha alọghachị Kogi.

Ọ bụ na mmiri bụ oke ha na Kogi ka ha si agafe.

O kwukwara sị na, "Kamgbe iri afọ enweghị onye na-aga ugbo".

Aha onyonyo, Fulani herdsmen in Bende:"Ndị uweojii kpọchịrị anyị mgbe anyị gara ikpesa etu ndị ọchịehi si mebie n'ugbo anyị"

Akachukwu kwuru sị na enweghị onye ma ndị ha bụ kama ndị gburu mmadụ na mbụ bụ ndị kpọ nama.

Ọ kọwara sị, "anyị bụbu ndị na-akọpụta bu nrị kama ugbua, agụrụ dịzị".

O kwukwara sị, "A na-ekwu na ọ bụ ndị ọchiehi kama ndị uweojii ka na-eme nyocha ha".

Ọ kọwara sị na enweghị onye ma maọbụ ndị ọchiehi ka ọ bụghị, kama eji anya ama ọka chara acha.

Akachukwu kwuru sị na ekwesiri ịnwe ndị nche ga-anọ n'ugbo eche ha nche n'ihi na ha enweghị ebe ha ga-agba gaa.

Mgbe anyị jụrụ ya maka Ebubeagụ, o kwuru sị, "anyị nwere Neighbourhood na Forest guard kama nkea karịrị ha".