Miyetti Allah, Nnamdi Kanu na ihe a na-ekwu maka okpomọkụ dị n'etiti ya, Ipob na otu ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images
Dịka okwu gbasara onye gburu ndị Fulani n'Anambara steeti na-erughi otu izu gara aga na-arị elu, ndị mmadụ etinyela ọnụ n'ihe gbasara etu Nnamdi Kanu na otu ndị ọchịehi si adụ onwe ha aka n'ọnụ.
Ka ụfọdụ otu ndị ọchịehi kwuru na ha ga-abọrịrị ọbọ ndị otu ha ọbụla e gburu n'Ọwụwa Anyanwụ, Kanu bụ onyeisi ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru na ndị ọchịehi ga-akwụ ụgwọ ọbara onye Ipob ọbụla tụrụ n'ala.
Okpomọkụ a dị n'etiti otu abụọ a emeela ka ndị mmadụ tinye ọnụ na ya bụ okwu.
N'Enugwu steeti:
Kọmishọna mgbasaozi nke Enugwu steeti bụ Chidi Aroh, gwara BBC Igbo na dịka ọrụ gọomentị bụ ichekwa obodo, na gọọmentị steeti ya enyela iwu ka ndị isi okpuru ọchịchị laghachị n'obodo ha gaa biri ma kpọkọta ndị ọnụ na-eru n'okwu n'okpuru ọchịchị ha, mee nzukọ ma mara etu ha ga-esi chekwa ndụ ndị nọ n'okpuru ọchịchị ha.
Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kwukwara na ọ ga na-aga ebe ndị e nwerela mwakpo na ebe ndị a na-enwe nsogbu, ịma ma ha emeela nzukọ etu ha si echekwa onwe ha.
O kwukwara na ndị omeiwu, ndị isi ụlọụka, ndị eze na ndị ọzọ, ga-esokwa na ya bụ nkata a ga na-akpa maka nchekwa Enugwu steeti.
N'Ebonyi steeti:
Kọmishọna mgbasaozi nke Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji, gwara BBC Igbo na ndị Ebonyi steeti na-agagharị mkpa ha na-atụghị ụjọ ihe ọbụla n'agbanyeghi ọnọdụ nchekwa dị na Naịjiria.
Orji gara n'ihu rịọ ka ndị mmadụ gbaa mbọ nọrọ n'udo ma meere mmadụ ka e mere ibe ya, dịka ọchịchị onye-kwuo-uche-ya si hibe.
Orji kwuru sị ka ndị mmadụ tinye mma ha n'ọbọ ma mee udo dịka ndị Naịjiria ọbụla bụ otu, ma onye ukwu ma onye nta; na ndọrịtaụka a dị n'etiti otu Ipob na ndị ọchịehi ga-ebute nkwafu ọbara nke adịghị mma.
Anambara Steeti:
Kọmishọna Mgbasaozi Anambara steeti bụ Don Adinuba gwara BBC Igbo na enweghi onye chọrọ ọgbaghara, na ha na ndị isi a hụrụ kwaba okpu na-akpa maka ihe gbasara nchekwa na steeti ahụ.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-agagharị na steeti ahụ ịhụ na nsogbu ọzọ adapụtaghị, ma kwuo ka ndị mmadụ gbado anya.
O kwuru na ọ bụghị ihe niile ka a ga-agwa ndị ntaakụkọ gbasara ihe ha na-eme maka ya bụ okwu, mana ọ dị mkpa ịma na enwere ihe gọọmentị na-eme maka ya.
Adinuba gara n'ihu kwuo na ndị gburu mmadụ n'Anambra nsonso a mere arụ n'ihi na igbu mmadụ bụ arụ.
Lee ihe ha na-ekwu na soshal midia:
@Dheezulin kwuru na enweghi mgbe ihe Nnamdi Kanu na-azọ ji na-ekpe udo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Osinaka Iloabuchi kwuru na enweghi mgbe Ipob ji kwuo na ọ bụ ha mere mwakpo ọbụla, na ọ bụ gọọmentị etiti na-achọ ịdọba ha n'ihe ha na-emeghi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2














