Ndị Gọvanọ ọnwụwa anyanwụ ma ụma gba nkiti maka ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo maka iji megide ụmụ okorobia

Igboayaka Igboayaka

Ebe foto si, Igboayaka

Onyeisi Ohaneze Ndigbo nke ntorobia bụ Igboayaka O. Igboayaka ekwuola na gọvanọ ọwụwa Anyanwụ niile ma ụma gba nkịtị maka ọnọdụ nchekwa n'ebe ahụ iji gbaa ụmụ ntorobia mgba okpuru.

Igboayaka sị na " o doro anya na nkịtị ndị gọvanọ Alaigbo gbara maka ọnọdụ nchekwa bụ ihe ha hiri aka n'anya mee iji megide ụmụ okorobia ala Igbo. Ọ nwebeghị otu onye n'ime ha kpọrọ ụmụ ntorobia n'ime obodo imata uche ha maka ihe na-eme. Ruo taa onwebeghị otu gọvanọ chọrọ ịma ihe mere ndị ntorobia ji emebi ihe n'obodo. O bụ nke mere ụfọdụ ji eche na aka ha dị n'ọgbaghara n'eme n'ala Igbo".

Igboayaka sị na ọ bụ egwu ndị isi ha n'Aso Rock mere ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ji atụ egwụ ịkwado ndị nche obodo ya na egwu ka ndị otimkpu ha ghara ịnweta onwe ha n'ọnọdụ ga-emebọ ha.

Ọ sị na 'ugbua, ụfọdụ ndị oti mkpu ha ahụ agbanwewala site n'ịweta ọrụ ndị ọzọ.

Ọ sị na ọnọdụ dị otu a maka na ndị Igbo enweghịzị ntụkwasa obi ebe ndị ọchịchị ala Igbo nọ.

Nke a mere na dị mmadụ enweghị ike ịgbara ha ama maka ndị niile egburu na nkịtị n'ala Igbo.

Igboayaka sị na "nke bụ eziokwu bụ na e nwere agha pụtara ihe a na-ebuso ndị Igbo bụ nke malitere n'afọ 2015. Ndị Gọvanọ na gọọmentị etiti agaghị alafụlị anyị."

Igboayaka Igboayaka

Ebe foto si, Igboayaka

Igboayaka n'ekwusi ike na ọ bụ naanị ndị nche obodo ga-emezi ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo maka na arụ niile ana akpa n'obodo bụ ndị obodo na-akpa ya.

Ụjọ ndị Ugwu na-atụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ

Ohaneze Youth Council/Facebook

Ebe foto si, Ohaneze Youth Council/Facebook

Biafra secession : Ụjọ ndị Ugwu na-atụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ - Ohaneze Youth Council

Ohaneze Youth Council/Facebook

Ebe foto si, Ohaneze Youth Council/Facebook

Ngalaba ndị ntorobia nke otu Ohaneze Ndị Igbo bụ "Ohaneze Youth Council" ekwuola na ọ bụ "ụjọ" ndị Ugwu ka ndị Gọvanọ Ọwụwa Anynawụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si Ọwụwa Anyanwụ na-atụ mere ha ji kwuo na ha kwụsi ike n' ịdịnotu Naijiria.

N'ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nwere na nsonso a n' Enugwu, ha kwuru na ha akwadoghị mkpu nnwereonwe otu Ipob, Massob na ndị ọzọ na-eti, kama na ha chọrọ idinotu Naijiria.

Ndí góvanó Ówúwa Anyanwú

Ebe foto si, Louis Amoke

Mana otu Ohaneze Youth Council' sị na okwu ahụ na-egosi "ụjọ" na "enweghị ume".

N'ozi mgbasaozi nke onyeisi ha bụ Igboayaka U Igboayaka nke odeakwụkwọ mgbasaozi otu ahụ bụ Chukwuemeka Chimerue binyere aka ma wepụtara ụbọchị Tuzde, ha tụrụ arịrị na oge Chukwuemeka Ojukwu, M. I Okpara na Akanu Ibiam nọ ndụ, "n'ụdị okwu ahụ na-egosi "ụjọ, enweghị ike ịdapụta n'ọnụ."

Ndị ntorobia Ọhaneze bụ ndị ji ihe Okonkwo mere Ikemefuna n'akwụkwọ Chinua Achebe dere ọ kpọrọ "Things Fall Apart" were tụnyere ndị ndu Igbo, sị, "Ịjụ okwu nnwereonwe nke ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na ndị nwere agba mere n'Enugwu bụ iji gosi ndị Ọchịchị Fulani nọ n'obi gọọmentị n'Aso Rock' na ha bụ agụ, mana o gosiziri ndị ntorobịa Igbo na ha bụ ụrọm ọkụkọ."

Ha gara n'ihu kwuo sị, "Ọbụladị ka mkpamkpa na mpụ na-arị elu n'Ugwu , Sheikh Gumi na Gọvanọ El-Rufai na-ekwuchietere ndị ekperima nakwa ndị Boko Haram mana naanị ihe ndị ntorobia na-achọ bụ nnwereonwe n'ihi mmegbu, mkpagbu na ogbugbu ndị ọrụ nchekwa na-egbu ha kemgbe afọ 1970, ndị ha kpọrọ nna na-agọnarị ha."

Ha kwuru na ọ bụ "enweghị ntụkwasịobi mere na o nweghị onye ndu n'ime ha ndị ntorobia na-ege ndị ọchịchị si mpaghara Igbo ntị."

Ha nyere ndị ndu si Ala Igbo ndụmọdụ sị na ọ kara ndị ọchịchị si mpaghara Ọwụwa anyanwụ mma imechi ọnụ ha n'okwu gbasara nnwereonwe, chọwa ụzọ iji nweta ntụkwasa obi.

Biafra secession : Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ji maka 2023 gọnarị anyị- Ipob

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu kwuru ka ndị otu Ipob gbajọọ ntuliaka na-abịanụ

N'otu aka ahụ, otu Ipob akatọọla ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ maka ikwu na ha akwadoghị otu Ipob nakwa Massob na mkpu nnwereonwe ha na-eti.

Na nsonso a ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nọ n 'ọgbakọ ha nwere n'Enugwu katọọ atụmatụ na akparamagwa otu niile na-achọ nwereonwe Biafra ma kwuo na ha akwadoghi ndị a n'ụzọ ọbụla.

Mana ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful kwuru n'ozi otu ahụ wepụtara ụbọchị Tuzde, Ipob sị na "ọ bụ ihe ihere na ndị a kpọrọ ndị ndu Igbo rere ụmụnne ha iji were mekwata ndị ha na-agbara odibọ."

"Kedụ etu ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ si na-achọ ọchịchi site na 2023 gawa n'ihu nke na ha dị njikere ire ihe ọbụla maọbụ onye ọbụla iji nweta ihe ha chọrọ?"

Ọ bụrụ na ha amaghị, ndị Ugwu ha na-emere aghọtala ihe na-eme.Ha ma na ndị gọvanọ enweghị onye kwụụ ha. Na ha anaghị ekwuchiete ihe karịrị mmadụ ndee asaa ndị Igbo biọ na Naijiria nakwa na mba ndị ọzọ."

Ipob boro ebubo "na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ bụ ndị machiri otu Ipob n'afọ, 2017, ebe gọọmentị etiti kpọrọ ipob ndị "oyiegwu' site na nkwado ndị Ọwụwa Anyanwụ na-agbanyeghị na anyị abụghị."

Ha gara n'ihu jụọ sị, "Ugboro ole ka ndị ndu si Ugwu Naijiria gọnarịrị ndị oyiegwu, ndị ekperima na ndị Fulani ọchiehi na-akpa mkpamkpa na Naijiria niile?"

Akụkọ ndị ga-amasị gị: