Abubakar Malami: ọ bụ ịkpa oke agbụrụ iji ndị mkpuka tụnyere ndị ọchịehi - Fani-Kayode

Femi Fani Kayode

Ebe foto si, @Femi Fani Kayode

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Femi Fani-Kayode bụbu Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu esonyela na ndị nwere agba katọrla okwu Abubakar Malami bụ ọkaiwu Gọọmenti etiti kwuru banyere mmachi Ndị gọvanọ Ndịda Naijiria machiri nchịgharị ehi na mpaghara ha.

Aha onyonyo, Femi Fani Kayode: Ihe m jụrụ ya gbawara ya obi

Malami kwuburu na mkparịtaụka ya na Ụlọntakụkọ Channels TV na mmachị ahụ dịka ịmachi ndị na-azụ mgbuka n' Ugwu Awụsa.

Ọsịsa ya kpalitere ụka dịka ọtụtụ ndị Naijiria nwere agba katọrọ okwu ahụ sị na ọ bụ ekweghị onye ọkaiwu.

Femi Fani Kayode Minista sị na okwu Malami jọgburu onye ya n'ihi na "ọ bụ ịkpa oke agbụrụ iji ndị mkpuka tụnyere ndị ọchịehi".

"Ọ bụdị arụ ịbụ onye Igbo na Naijiria. Anyị egbuola nde kwuru nde ha kemgbe afọ 61 gara aga."

"Anyị na-eyi ha egwu, anyị na-emekpa ha ahụ. Anyị na-anọnahụ ha."

"Anyị na-anapụ ha oke. Anyị na-eme ha ka ha abụghị mma."

Kayode gara n'ihu kwu na "anyị jichiri ha, anyị emela ha ọtụtụ ihe ma jụkwa ikweta na nke anyị mere ha ezuola".

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Okwu Malami gbara ajọ obi n'anwụ- Abaribe

Sịnatọ Eyinnaya Abaribe

N'otu aka ahụ, Senetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite Abia-South n'ụlọomeiwu Ukwu kwuru na okwu Malami maka mmachi e tinyere n' ichigarị ehi gosiri 'ajọ obi' ụfọdụ nwere nke nwere ike imebi ịdịnotu Naijiria.

N'ozi ya nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Awom binyere aka, Abaribe kwuru na o nweghị ebe egbe na egbe siri yie.

"Kedụ ihe jịkọrọ ndị na-ere mgbuka n'ọdọahịa maọbụ ebe gọọmentị hibere na ndị Fulani Ọchịehi na-emebisi ugbo ndị mmadụ, na-egbusịsị mmadụ na-edina ndị mmadụ n'ike na-emebisi ihe ndị mmadụ nwe?"

O kwuru na okwu ahụ ahụ gosiri "obi ọjọọ nwere ike nsogbu n'etiti agbụrụ na agbụrụ ibe ya."

"Ụdị okwu nkewa a si n'ọnụ onye ọrụ gọọmentị etiti welitere isi, ọ kachasị onye ndụmọdụ iwu isi nke gọọmentị etiti, gosiri ajọ obi"

"Ụdị echiche ahụ pụrụ iweli ọnọdụ obodo ide jiji na-ede na Naijiria."

"Kedụ ka onye ọkawu nke ala ga-esi na-ekwu okwu nwere ike ịkpalite nkewa n'etiti agbụrụ nna ibe ya ebe ọ bụ nnukwu mmadụ n' ọchịchị?"

Iwu Naijiria bụ mmadụ o nyere ikike mkpagharị,ọ bụghị anụmanụ -Falana

Ọkaiwu a ma ama bụ Femi Falana

Ebe foto si, FalzTheBahdguy/INSTAGRAM

Nkọwa foto, Ọkaiwu a ma ama bụ Femi Falana

N'ọsịsa ya, ọkaiwu a ma ama bụ Femi Falana kwuru na ọ bụ aghụghọ ikwu na iwu nyere onye ọbụla ikike ịga ebe masịrị ya, nyere ndị ọchịehi ikike ịchịgharị anụmanụ ha.

"Mmachi ịchịgharị ehi emetụtaghị ikike ndị na-achị ehi ịga ebe masịrị ha na ịzụ ala ebe masịrị ha dịka Iwu Naijiria akụkụ 41 na 43 siri kwuo".

"Ebe ọ bụ na Iwu Naijiria akwadoghị ikike anụmanụ nwere ịkpagharị ma na-emebi ugbo, ọ bụ aghụghọ ịsị na ịmachị ịchịgharị ehi megidere ikike ndị ọchịehi nwere ichu uchu ha."

Ohaneze, Akeredolu asaala Malami maka iji ire mgbuka tụnyere ịchịgharị ehi

George Obiozor na Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Ohaneze/Rotimi Akeredolu

Otu Ohaneze na aka na-achị Ondo steeti akatọọla ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami maka okwu o kwuru megide mmachi nchigharị ehi nke ndị gọvanọ Ndịda Naijiria tinyere.

Malami kwuburu na ndị gọvanọ enweghị ikike imachi ndị ọchị ehi ịchịgharị ehi ebe ọbụla Naijiria, sị na ọ dịka ndị gọvanọ Ugwui ịmachị ndị mgbuka nọ n'Ugwu Naijiria ịzụ ahụịa n'Ugwu Awụsa.

Ohaneze sịrị na bụ okwu pụrụ ịkpalite mmachi megide ndị azụmahịa na na mpaghara Ugwu.

Ohaneze kwuru na okwu ahụ bụ iji kpalite ndị Ugwu Ugwu ịmachi ndị ndịda na-azụ ahịa n'Ugwu Naijiria dịka o nweghị ihe a ga-eji tụnyere mbibi nke ndị ọchị ehi na-eweta na ihe ndị ahịa mgbuka na-eme.

Malami na-achọ ịkpali mmachi ndị Ndịda na-azụ mkpuka na mpaghara Ugwu- Ohaneze

Ambassador George Obiozor

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị na ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze bụ Alex Ogbonna kwuru na okwu ahụ Malami kwuru jọgburu udele ma sigbu nkapị n'isi.

"Ihe Malami kwuru jọgburu onwe ya. O wutere Ohaneze rinne na onye kwesiri imezi iwu na-emebizi iwu emebi"

"Ọ bụ iji kpalite na ndị be anyị na-erekwa mkpuka, na ọ bụrụ na anyị chụwa ndị ọchị ehi, ha achụwa ndụ i be anyị na-ere mgbuka."

"Ahịa mkpuka nwere ebe a na-azụ ya, ọ naghị egbu mmadụ na ya, ọ naghị aba n'ugbo mmadụ."

Malami, ọ ka gị obi, gaa ụlọikpe gbagha mmachị nchịgharị ehi - Akeredolu

Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Facebook

N'otu aka ahụ aka na-achị Ondo steeti mabụụkwa onyeisi otu jịkọrọ ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ bụ Rotimi Akeredolu sịrị na okwu ekwesụịịghị onye ọkaiwu nwere agba dịka ya.

O kwuru na ọ tara ọjị anya na ọ maghị ihe dị iche na ndị n-achụ ntaego enweghị ebe ihe ha na-eme si emerụ ndị mmadụ ahụ na nke ndị na-emebi ihe.

"Ikwechiri n'ụdị ugbo anụmanụ oge gboo nke na-emebi mmekọrịta dị n'etiti ndị ọchiehi na ndị ọrụugbo gosiri obiọjọ na mpako."

" Maazị Malami nwere ohere ịga n'ụlọikpe ịgbagha mmachị ichigharị ehi ndị gọvanọ Ndịda tinyere maka ọdịmma ndị nke ha."

"Anyị dị njikere izute ya n'ụlọikpe."

Lee ihe ndị ọzọ nwere agba na-ekwu maka okwu Malami:

Ịmachi nchigharị ehi dịka ịmachị azụmahịa mkpụka - Malami

Abubakar Malami

Ọkaiwu gọọmentị etiti (Attorney-General) bụ Abubakar Malami ekwuola na ndị gọvanọ enweghị ikike imachi ndị ọchị ehi ịchịgharị ehi ha na mpaghara Naịjirịa ọbụla ha chọrọ.

O kwuru na ndị gọvanọ Ndịda Naijiria imachi ịchịgharị ehi dị ka ndị Ugwu ịsị na ha na-amachi ire akụkụ ụgbọala na mpaghara Ugwu.

Malami kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Channels TV nwere n'abalị Wenezde.

Na nkọwa ya, iwu Naịjirịa nyere onye ọbụla ikike ịkpagharị n'akụkụ Naịjirịa ọbụla masịrị ya.

"Ọ bụ maka iwu Naijiria, i nwere ike ịnapụ onye Naijiria ikike dịrị ya? Ọ dịka ndị Govanọ Ugwu Awụsa sị na ha na-amachi ire akụkọ ụgbọala n'Ugwu Awụsa. Ọ ga-ekwe omume?"

"Ihe mbụ e kwesịrị ime bụ ịga megharị iwu metụtara ya. Gaa n'Ụlọomeiwu ka i megharịa iwu ahụ."

O kwuru na ndị gọvanọ chọọ nhazigharị Naijiria, mana ha ekweghị ka ndị nọ okpuru ha na steeti kwụrụ onwe ha.

"Aghọtaghị m okwu ha (ndị gọvanọ) na-ekwu maka nhazigharị Naijiria, ebe ha ekweghị enye ohere ka ogogo gọọmentị nọ n'okpuru ha rụọ ọrụ ha ka ha kwesịrị na steeti ha."

"Ha anaghị ekwe na ndị ụlọomeiwu nke steeti nakwa okpuru ọchịchị n'ọ n'okpuru steeti rụọ ọrụ ha na-enweghị mgbochi ọbụla."

"Ha gagodi na steeti ha lebanye anya na nsogbu ha nwere na steeti ha site na ịhapụ ụlọomeiwu nakwa ha dịka ọdị n'Iwu.