Constitution Review: Ihe ndị Ohaneeze chọrọ ka a gbanwee n'Iwu Naijiria

Ebe foto si, George Obiozor
Otu Ohaneze Ndigbo akpọọla oku ka e kewapụta steeti ọhụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma kewa Naijiria mpaghara isii.
Nke a so na alo ndị ha tụpụtara n'abalị nke abụọ nke ọgbakọ maka ịnụrụ olu ọha n'okwu imegharị Iwu Naijiria nke a nwere n'Owere ụbọchị Tọzde.
N'akwụkwọ ha nyere kọmiti na-ahazi mmegharị iwu Naijiria, Onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru na ndị igbo chọọ ka enye ha otu steeti ọhụrụ, ndị uweojii steeti nakwa ịgbari ikike ọchịchị gbadata mpaghara.
Ohaneze kwuru na e mee otu a na iwe na ọnụma ga-ajụrụ dịka ndị mmadụ ga-enweta oke ruru ha.
Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Alex Ogbonnia, onye gbara BBC Igbo ama a na mkparịtaụka gụpụtara ihe ndị ọzọ otu chọrọ dịka uweojii nke steeti,
"Ihe ndị Igbo chọrọ bụ e kewa steeti ọzọ, ka ọ bụrụ ndị Igbo ka e kwesịrị ikenye"
"Ndị ọbụla were ihe dị n'ala bee ha mere ihe, ma nwee ihe ha ga na-akwụ Gọọmentị etiti."
"Anyị chọrọ uweojii nke etiti na nke mpaghara."
"Mpaghara ọbụla nwee ụlọikpe mkpegharị nke ha, okwu sizue ike, a gawa Ụlọikpe okpechaọgwụ"
"Anyị chọrọ ka anyị nọrọ onwe anyị na mpaghara nke anyị ma nwekwa ohere bi na mpaghara nke ndị ọzọ."
Ndị omeiwu ga-elebara atụmatụ iri anọ na asatọ a maka ịrụharị iwu Naijirịa anya nke ọma - Orji Uzor-Kalu

Ebe foto si, Nigerian Senate/Twitter
Nzụkọ pụru iche na-ahụ maka ịhaziharị iwu Naijirịa nke bụ Constitution Review ekwuola na ha anatala atụmatụ iri anọ na asatọ gbasara ịhazịharị iwu Naijirịa.
Onyeisi nzụkọ a bụ omeiwu Orji Uzọr-Kalu kwuru nke adịka ya bụ nzụkọ bịara n'isi njedebe n'Owerri, Imo Steeti.
Uzor-kalụ kwuru na ha ga-elebara ya bụ iwu anya nke ọma etu ọ kwesịrị.
O kwuru na ha ga-enye ndị nzụkọ ndị omeiwu ukwu na nke nta na-ahụ maka ịhazịharị iwu Naijirịa.
Ọ bụ otu gụnyere Nigerian Bar association, Feminist Movement of Nigeria, Civil Society Alliance for Education, National Human Rights Commission, Women in Politics, Abia State Movement na Nigeria Union of Journalists.
N'otu aka ahụ ka onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ George Obiozor kwuru na ihe ha chọrọ bụ " mwere onwe n'ime Naijirịa ahazịharị".
Constitution Amendment: 'Ndị omeiwu Naịjirịa na-aghọrọ onwe ha aghụghọ na ị sị na ha ga-edegharị akwụkwọ iwu Naịjiria'

Dịka ndị Gọvanọ Ndịda Naijiria kpọrọ oku ka Goomentị Etiti kpọọ ọgbakọ maka itinye ọnụ n'okwu gbasra ịhazịgharị Naịjirịa, ụlọomeiwu Sineti enwerela ọsọ kpọọ oku maka itinye ọnụ n'okwu gbasara ịhazigharị iwu Naịjirịa nke 1999.
N'ozi ha wepụtara, ha kwuru na ha amapụtala ebe na oge ndị mmadụ ga-eji ezuko itinye ọnụ n'ihe ha chọrọ ka a hazigharịa n'Iwu Naijiria.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, NGRSenate
Nke a butere ọtụtụ mmadụ ịmalite ikwu ihe gbasara imegharị iwu Naịjirịa nke Bekee kpọrọ "Constitution".
Ọtụtụ mmadụ akpọọla ya bụ akwụkwọ aha ọjọọ na-arụ ya aka ajọo n'ụdị na ọ bụ ya bụ akwụkwọ iwu bụ isi sekpụ ntị n'ihe na-akpọtụ na Naịjrịa.
Ụfodụ na-ekwu na e dere ya mgbe ndị agha na-achị bụ mgbe ha kpọbatara mmadụ ole maọbụ ole n'otu ụlọ nye ha ọrụ ịde ya bụ akwụkwọ iwu bo ya na "we the people" dere ya.

Ebe foto si, Senator Omo-Agege/Twitter
Ebe ọtụtụ mmadụ na ndịda na-ekwu na e kwesiri ịde nke ọh uhụrụ, ndị Ugwu na-ekwu ka e degharịa ya.
Kedụ nke anyị ga-eso?
Nwada Igbo bụ Oby Ezekwesiri na-ekwu n'akara Twitter ya n'ụtụtụ a na ọ bụ 'constitution'ọhụrụ ka ekwesiri ị na-ekwu maka ya, ọbụghị idegharị nke ochie.

Ebe foto si, Getty Images
Onye okaiwu bụ ọkachamara n'okwu gbasara ịme akwụkwọ iwu bụ Tony Nnadi ekwuola na ndị omeiwu Naịjrịa enweghị ikike ịdegharị akwụkwọ iwu Naịjria.
Ndị omeiwu Sineti pụtara n'ụtụtụ Wenezde kwụọ na ha chọrọ ịmalite njem ịnye ọhaneze ohere ịtịnye ọnụ n'okwu gbasara ịmegharị iwu Naịjirịa.

Ebe foto si, Tony Nnadi/fb
Mana Tony Nnadị bụ ọdeakwụkwọ ndị Lower Niger Congress bụ otu agburu di icheiche na Naịjirịa gbakọrọ ọnụ si na "ndị omeiwu ahụ na ndị Gọvanọ na-aghọrọ onwe ha aghụghọ".
Ọ sị na "ikike ndị omeiwu erughị na ịdegharị akwụkwọ iwu Naịjirịa maka na ọ bụ ya bụ akwụkwọ iwu nyere ikike ihiwe ha".
Ọ sị na ọ bụ ndị agbụrụ dị icheiche na Naịjrịa kwesiri ịgbakọta hiwe akwụkwọ iwu nke mgbe ha mechechagoro "referendum" n'ime onwe ha kwekọrita na ha ga-ebi.
Nnadi kwuru na "mgbe ahụ ka ya bụ akwụkwọ iwu ga-abụ nke ndị nwe ya".

Ochiedike so na gọọmentị ọnwụnwaanya mgbe Odumegwu Ojukwu chịrị bụ Mbazuruike Amachi kwetere na ndị omeiwu ahụ enweghị ike ịdagharị iwu Naịjiria.
O kwuru na agbanyeghị nke a, na-akwụkwọ iwu Naịjrịa enwere ughua bụ nke adigboroja maka na ọ bụghị ndị Naịjriia dere ya.
"A ga-ede usoro ọchịchị Naịjirịa nke ọhụrụ ka ndị Naịjirịa kwuo ka ha ga-esi chia onwe ha", dịka Mbazuruike kwuru.
"Ịdegharị akwụkwọ iwu adigboroja a dịka ịda iwu ugboro abụọ."
O sị na ọrụ ndị omeiwu bụ iji akwụkwọ iwu Naịjrịa mepụta iwu, na ọ bụghị ịdegharị ya bụ akwụkwọ.
O kwukwara
Gịnị mere akwụkwọ iwu Naịjria ka ọ dị ugbua?
Tony Nnadị bụ ọkachamara gbasara akwụkwọ iwu kwuru ihe mere o ji dị mkpa ịde akwụkwọ iwu ọhụrụ.
Ihe ndị a ka o kwuru:
- "Ọnwe mgbe ndị agburu nọ na Naịjrịa bịakọrọ ọnụ dee ya bụ akwụkwọ mmekọrịta".
- "Ya bụ akwụkwọ dịka agbụ ekere anyị nke jụrụ na anyị agaghị emegharị ahụ.
- "O bụ ya bụ akwụkwọ mere na nchekwa agaghị adị na Naịjirịa maka na ike niile gbasara nchekwa dị gọọmentị etiti n'aka".
- Steeti iri atọ na isii ya bụ akwụkwọ iwu hiwere bụ oke ibu dịịrị onwe ya maka na ụfọdụ n'ime ha enweghị ike ụkwụrụ onwe ha.
- O kwuru na ọkụ bụ oke nsogbu na Naịjrịa maka na ọ dị n'aka gọọmentị etiti.
- Ọrụ nchekwa enweghị ike ịdị mma maka na gọomentị etiti jichiri ya.
- "ihe niile bụ ihe na-enye Naịjirịa nsogbu si na ya bụ akwụkwọ iwu".
Mmachi ịchịgharị ehi, 'state police' na mkpebi ndị ọzọ ndị gọvanọ Ndịda Naijiria kpebiri

Ebe foto si, @IAOkowa
Ndị gọvanọ Ndịda amachiela ịchịgharị ehi na mpaghara ahụ iji belata nsogbu ọchịehi na mpaghara ahụ.
Ndị Gọvanọ Ndịda Naịjria zukọrọ n'Asaba, Delta Steeti ụbọchị Tuzde, abalị iri na otu nke ọnwa Mee afọ 2021, tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọdịmma, nchekwa, ndị kwe ndị ekweghi gbasara ịdịnotu Naịjrịa nakwa agha gbasara Covid-19.
Ihe ndị a ka ha kpebiri:
1. Ha kwekọrịtara na ndị agbụrụ dị na ndịda kwere na idinaotu Naịjrịa nke hibere isi n'ikpe nkwumọtọ, onye biri ibe ya biri, udo na ịhụnanya na ofu obi.
2. Ndị Gọvanọ ahụ agbakọọla aka machie ichi ehi gagharịa na steeti niile ha na-achị maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa nke na-emetụta udọ na ịkpata akụ nke ndị mmadụ jiri biri.

Ebe foto si, @IAOkowa
Ọzọ bụ na mmụbanye mmadụ mere ka ala dị ụkọ nke butere na ala ezughịzị ihe e ji ya eme na mpaghara ahụ.
3. Ha chọrọ ka gọọmentị etiti hapụ steeti chọrọ ka ha mepee usoro dị ha mma ịkpa ụmụanụ.
4. Ha kwekọrịtara na ọdị mkpa na gọọmentị etiti ga-egosi mmasị, ngwa ngwa, n'ịhazịgharị Naịjirịa n'ụdị ga-enye steeti dị iche iche ikike ịhiwe ndị uweojii nke ha, kegharịa usoro e ji eke akụnaụba Naịjirịa nke ga-egosi nke Bekee kpọrọ "true Federalism".
Ha kwuru na ọ dị mkpa gọopmentị etiti ihebe ọgbakọ ebe a ga-anọ kpaa mkpa ọdịmma na ịdịnaotu nke Naịjirịa ngwa ngwa.
6.Ha na-akpoku gọomentị etiti ka ha ịge ntị na mkpu ndị mmadụ na-eti maka oke ruru ndị mpaghara dị iche iche maka ọkwa wenitara isi dịka ọkwa onyeisi ndị agha na nke ndị isi uweojii. Ka ha were ọsọ were iji kegharịa ha
7. Ndị Gọvanọ ahụ kpebiri ijikọọ ọnụ na ịdị n'ọtụ nke Naịjirịa. N'ihi ya, odeakwụkwọ ndị steeti niile dị na ndịda anyanwụ ga-ezuko wepụta atụmatụ ha ga-eji hiwe usoro mmekọrịta na-etiti steeti ndị a maka mmepe akụnaụba ha.
8. Ha kpebiri na gọọmentị etiti kwesiri ịmepe odoụgbọmmiri na steeti ndị ọzọ nke ga-enyeaka ka kpachịkpachị na-adị na ọdọụgbọmmiri dị n'Apapa, Legọs benata, mekwa ka ọrụ bụrụ gbanyụụ na steeti ndị a.
9. Ha dọrọ aka na ntị maka ihe ikpochi akụnaụba ọzọ maka egwu coronavirus nwereike ibute ma kwukwa ka gọọmentị etiti na nke steeti tikọo isi ọnụ wepụta atụmatụ ga-abara ọha.
10. Ndị gọvanọ ahụ dọrọ aka na ntị maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa ma kpokuo Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ pụta gwa ụmụ Naịjirịa okwu maka ya maka ịme ha ntụkwasị obi ha na gọomentị ya gbagote.
Uzodinma anọghị na ọgbakọ ahụ

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti agaghị ọgbakọ ndị gọvanọ Ndịda Anyanwụ Naijiria mere n'Asaba Isiobodo Delta Steeti, ụbọchị Tuzde.
Ọ dọghị anya ihe mere na Uzodinma ejighị bịa ọgbakọ ahụ ndị gọvanọ iri na ise si Ndịda bịara n'onwe ha.
Mana Odeakwụkwọ Mgbasaozi Uzodinma bụ Oguwike Nwachukwu, kwuru na o nweghị ndajọ dị na Gọvanọ Uzodinma agaghị ọgbakọ ahụ.
Ọ sịrị: "Ọ bụ osote gọvanọ nọchitere ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ na gọvanọ na-eziga osote ya ị ga-anọchite ya."
"Ọ bụghị nanị ya bụ gọvanọ na-eziga mmadụ ịnọchite ya n'ọgbakọ."
Ndị gọvanọ Ndịda bịara ọgbakọ ahụ bụ:
Arakunrin Oluwarotimi Akeredolu, SAN Gọvanọ Ondo Steeti
Victor Okezie Ikpeazu Gọvanọ, Abia Steeti
Emmanuel Udom Gọvanọ, Akwa Ibom Steeti (Osote ya bụ Moses Ekpo nọchitere anya ya)
Diri Draoye Gọvanọ, Bayelsa Steeti
Willie Obiano Gọvanọ, Anambra Steeti
Ben Ayade Gọvanọ, Cross Rivers Steeti
Ifeanyi Okowa Gọvanọ, Delta Steeti
David Umahi Gọvanọ, Ebonyi Steeti
Godwin Obaseki Gọvanọ, Edo Steeti
John Olukayode Fayemi Gọvanọ, Ekiti Steeti
Ifeanyi Ugwuanyi Gọvanọ, Enugu Steeti
Hope Uzodimma Gọvanọ, Imo Steeti (Osote ya bụ Placid Njoku nọchitere anya ya)
Babajide Sanwo-Olu Gọvanọ, Lagos Steeti
Dapo Abiodun Gọvanọ, Ogun Steeti
Isiaka Adegboyega Oyetola Gọvanọ, Osun Steeti
Oluwaseyi Abiodun Makinde Gọvanọ, Oyo Steeti
Ezenwo Nyesom Wike Gọvanọ, Rivers Steeti











