Financial autonomy: Lee ihe akwụkwọ iwu Buhari tinyere aka pụtara

Ebe foto si, Clems Nwankwo/Twitter
Ozi anyị na-enweta ugbua na-egosi na Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka n'akwụkwọ ga-enye ikike ka ndị ọrụ ọkaikpe na ndị ụlọ omeiwu steeti nwee ike ikwuru onwe ha site na mmekpe ahụ ndị gọọmenti steeti.
Mgbe ọ na-atapịa ya bụ okwu, Onyeisi ndị Policy and Legal Advocacy Centre na onyenchịkọta Nigeria Civil Society Situation Room bụ Clement Nwankwo kwuru na ya abụ ihe Onyeisiala mere magburu onwe ya maka na ọ ga-enyere ndị ọkaiwu na ndị omeiwu steeti ikike ikwuru onwe ha nwee echiche nke ha.

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Fb
Nwankwo sị na "ugbua ndị omeiwu na ndị ọrụ ọkaikpe steeti ga na-enwetezi ego ha site n'aka gọọmenti etiti. Ndị gọọmenti steeti agaghịzị emetu ego ha aka".
Ọ sị na nke a ga-enyere ha aka ikwusi ọkpa ike n'ala kwusie okwu ike mgbe ọ dị na mkpa.
Nwankwo kwukwara na ọtelarị Onyeisiala kwesiri itinye ya bụ akwụkwọ aka n'ihi na ọ bụ kemgbe 2018 ka ya bụ akwụkwọ dị n'okpokoro ya.
Mana ọ kwetakwara na taa ka bụ gboo na-ebe ya bụ iwu dị.
Buhari ahọpụta Godswill Obioma ka onyeisi Neco

Ebe foto si, Godswill Obioma /Facebook
Onyeisiala Muhammadu Buhari emeela Ọkammụta Godswill Obioma onyeisi ngalaba na-achịkọta ule sekọndrị bụ "National Examinations Council' a kpọrọ 'Neco' n'aha ịchafụ.
Obioma, onye Gọọmenti meburu onyeisi Inec n'Ebonyi steeti n'afọ 2017 nọchiri anya Abubakar M. Gana bụ onye na-arụbụ ọrụ dịka onyeisi Inec.
Ọnụ na-ekwuru Inec bụ onye gbara ama n'ozi o wepụtara nke Mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu binyere aka ya kwuru na ọkwa ahụ nke o kwesịrị ịnọ afọ ise na ya malitere n'abalị 14 nke ọnwa Mee.
Ihe i kwesịrị ịma maka Obioma
- Ọ bụ ọkammụta ngụkọ na nwalee dịka ọ siri gbasa agụmakwụkwọ nke Bekee kpọrọ, ''Education Measurement and Evaluation"
- Ọ bụ onye Bende n'Abịa steeti
- Ọ bụbu onyeisi kaụnsụl na-ahụ maka nchọcha dịka o siri gbasa agụmakwụkwọ ( Nigeria Educational Research and Development Council).
- Obioma, onye bụbu onyeisi ngalaba sayensi, mgbakọ na mwepụ na teknụzụ (Department of Science, Mathematics and Technology,) na mahadum 'University of Jos'.
Ụgbọelu akpọkasịala na mba Pakistan

Ebe foto si, Getty Images
Ndịisi ọrụ ụgbọelu ekwuola na opekata mpe mmadụ iri atọ na asaa anwụọla dịka ụgbọelu 'Pakistan Internaltional Airline, akpọkasiala n'obodo Karachi dị na mba Pakistan, ụbọchị Fraide.
Ụgbọelu ahụ bu mmadụ ndị njem 91 na ndị ọrụ ha mmadụ asatọ si Lahore aga Jinnah, otu n'ime ọdọụgbọelu kachasị ekwo ekwo na mba Pakistan oge ọ kpọkasịị nwuru ọkụ.
Dịka ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na mba ahụ bụ Abdul Sattar Khokharsị, " Ụgbọelu ahụ kpọkasịrị n' obodo Karachi."
"Anyị na-agbalị ịmata mmadụ ole nọ n'ime ya. Mana ole ha kwesịrị ịdị bụ ndị njem 99 na ndị ọrụ dị asatọ."
Nwaanyị asụgbuola di ya maka ịchọ idina ya n'ike

Ebe foto si, NPF
Ndị uweojii ejichiela otu nwaanyị maka iji mma sugbuo di ya n'ihi na ọ na-achọ idina ya n'ike.
Dịka Onyeisi ndị uweojii Bauchi bụ Philip Makụ si kọwara BBC Igbo, Salman Hassan dị afọ 18 ji mma sugbuo di ya bụ Mohammed Mustapha n'ụlọ ha dị n'okpuru ọchịchị Itas-Gadau, dị na Bauchi.
"Ọ suru ya mma n'obi, o merụọ nnukwu ahụ. Mgbe e bugara ya ụlọọgwụ General Hospital Itas-Gadau, ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọla."
Salman, onye o merela naanị abalị iri na otu e jiri gbaa akwụkwọ, kwuru na ọ bụ ebe ọ na-azọ onwe ya ka o ji sụọ di ya mma n'ihi na ọ chọrọ iwakpo ya n'ike.
Ọ kọwara na ya amaghị na ndina so n'ọrụ dịrị nwaanyị nọ na di.
Akụkọ ga-amasị gị:








