Ihazigharị Naịjira ga-ebi nsogbu ya - Ohaneze

Nnia Nwodo kwukwara ka ndị Igbo bịakọta ọnụ ma dịrị n'udo dịka o kpọrọ oku ọhụrụ ka e lebara anya n'okwu gbasara ịhazigharị usoro ọchịchị Naịjirịa.
Ọbụghị naanị Nwodo kwuru okwu, ndị so ya bụkwa ndị Igbo ndị ọzọ a ma ama dịka onye bụbu onyeisi ndị agha na Legos bụ Kọmọdọ Ebitu Ukiwe, Rear Admira Ndubuisi Kanu na ndị ọzọ.
Ha kwuru okwu a oge a nabatara ndị isi ọhụrụ ohaneze Ndigbo na Legos steeti.
Nwodo bere nwịị maka mmekpa ahụ a na-enye ndị igbo na ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa maka etu usoro e ji achị Naịjirịa si dobe ya.
N'okwu ya, "ihe ga-egbo mkpa a maka kwụsị nsogbu Naịjirịa bụ ka e dozigharịa usoro ọchịchị ma ya bụ ebe ndị Igbo kwụ."
Cheta na ụlọ omeiwu Naịirịa akwadoghi ya bụ atụmatụ nchịgharị oge e butere ya ebe ahụ mgbe a chọrọ idegharị akwụkwọ iwu Naịjirịa n'afọ gara aga.





