Abdulrasheed Maina: Gịnị mere nnwuchi nwoke a jiri ada ebube?

AbdulRasheed Maina

Ebe foto si, FACEBOOK/ABDULRASHEED MAINA

    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo

Ka ọ kwụ ugbua, ngalaba na-ahụ maka nchekwa Naịjirịa nke akpọrọ "State Security Service" (SSS) akpụrụla Adbulrasheed Maina kpụgara ndị "Economic and Finiancial Crimes Commision" (EFCC).

Dịka ndị SSS siri kwuo, ha nwuchiri Maina n'abalị iri atọ nke ọnwa Sepụtemba na ụlọ ndịna dị n'Abuja ka ndị EFCC rịọrọ ha enyemaka ịnwụchị nwa amadị a.

Ndị EFCC kwuru na Maịna bụ onye a na-achọ achọ maka ebubo na aka ya dị na mpụ na nrụrụaka.

Akụkọ ndị SSS na-akọ maka nnwụchi Maina na-atụ n'anya, mana ọtụtụ mmadu na-ajụ onye ọ bụ nakwa ihe o mere eji achọ ya.

Onye bụ Abdulrasheed Maina?

Maazị Maịna bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụgwọ ezumike akpọrọ "Presidential Task Force Team on Pension Matters" (PRTT) nke Goodluck Jonathan hibere mgbe ọ bụ onyeisiala.

Ọ bụ n'afọ 2010 ka Jonathan họọrọ Maina ka ọ nọrọ n'isi ndị na-elebanye anya na mpụ dị n'ụgwọ ezumike nke Bekee kpọrọ 'Pension'.

N'afọ 2012 e boro Maina ebubo oke nrụrụ aka gbasara ụgwọ ezumike nka ndị mmadụ ruru ijeri narị narịa.

Ngalaba ụlọ omeiwu a kpọrọ "Commitee on Public Service and Establishment and State and Local Government Administration" nyochara ebubo a ma maa Maina ikpe.

Maina kpụpụrụ ngalaba ụlọ omeiwu a na onyeisi uweojii Naịjirịa ụlọikpe.

Ka o mechara nke a, onweghịzi onye hụrụ Maina anya ọzọ, nke mere ndị uweojii jiri sị na ha na-achọ ya achọ.

Gọọmentị chụrụ ya n'ọrụ ma wepụ okwu ya ụlọikpe.

N'afọ 2015, EFCC kpụpụrụ maazị Maina na onye bubụ onyeisi ndi ọrụ gọọmentị bụ Steve Oronsaye na ndi ọzọ ụlọikpe.

Ka ndị ọzọ si na-aka ha dị ọcha, anya ahụghị Maina.

Maina sepụtere isi ọzọ n'afọ 2017 mgbe gọọmenti Buhari weghacitere ya n'ọrụ ma bulie ya n'ọkwa.

Ka mba dawara ebe niile maka atụmatụ a, onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka a chụo ya ozugbo.

Onye weghachiri ya n'ọrụ?

Winifred Ekanem Oyo-Ita

Ebe foto si, Winifred Ekanem Oyo-Ita

Maazi Maina na-esi ọnwụ na Onyeisiala Buhari ma maka nlaghachite ya.

Winifred Oyo-Ita bụbu onyeisi ndị ọrụ na Naịjirịa sị na aka ya adịghị ya.

Akụkọ kwuru na onye bụbụ Minista na-ahụ maka ime Naịjirịa bụ Abdulrahman Dambazau na Minista na-ahụ maka ikpe bụ Abubakar Malami ma maka ihe a mere.

Etu o sikwuru ugbua

Ndị ọrụ DSS

Ebe foto si, DSS

Ndị SSS si na nwa Maina bu nwata akwụkwọ miri egbe mgbe ha zutere ya na nna ya.

Ha kwuru na ọ bụ n'ime ụgbọala mgbọ egbe adịghị abanwu ka anwụchịrị ha abụọ.

Maazị Maina na nwa ya nọ n'aka ndị EFCC ugbua na azara ọnụ ha.

Anya anyị ga-adị n'okwu iji mara etu ọ ga-esi gaa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa'