Monday Sit at Home: Gọọmenti Enugu steeti ebupula ụgbọala a gbara ọkụ n'Enugu

Mpaghara ebe a nọrọ gbaa ụgbọala ahụ bu ngwa nri ọkụ n'ụbọchị Mọnde, Sepụtemba 27
Nkọwa foto, Mpaghara ebe a nọrọ gbaa ụgbọala ahụ bu ngwa nri ọkụ n'ụbọchị Mọnde, Sepụtemba 27

Ụgbọala nke ndị omekome gbara ọkụ n'Enugwu n'ụbọchị Mọnde, oge ha na-amanye 'sit at home', adịghịzi ebe ahu.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtara nke a oge anyị gara ime nnyocha banyere ọdachi ahụ.

Ihe ọzọ bụkwa na ụjọ ji ndị bi na gburugburu ebe ahụ ịza ajụjụ maka ihe ahụ mere.

Cheta na ụgbọala ahụ a gbara ọkụ bụ ngwa nri dị icheiche gụnyere tomato, ọkwụrụ and akwụkwọ nri ndị ọzọ

Etu ndị omekome na-amanye 'sit-at-home' siri gbaa ụgbọala bu ngwa nri ọkụ n'Enugwu

Ụgbọala bu ngwa nri a gbara ọkụ n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Other

Ndị omekome na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ n'ihi 'Sit at home' nke ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agbaala ụgbọala bu ngwa nri ọkụ.

A gbara ụgbọala ahụ bu ma tomanto, ọkwụrụ na ụfọdụ ngwa nri ndị ọzọ ọkụ n'ụbọchị Mọnde, Septemba 27, n'ebe a kpọrọ Edem Junction, nke dị n'Ibeagwa n'okpuruọchịchị Enugwu Ist nke Enugwu steeti.

Dịka akụkọ si kwuo, ụgbọala ahụ si n'ebe Ugwogo, Opi-Enugu by-pass na-alọta mgbe a wakporo ya.

Ndị nọ mgbe ihe mere kpọrọ ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịara menyụọ ọkụ ahụ.

Ọwụwa anyanwụ agbakewala nwayọ nwayọ

Umahia
Nkọwa foto, UMUAHIA

O doola anya na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa agbakewala nwayọ nwayọ n'aka iwu Sit at home nke otu Ipob hibeburu n'ebe ahụ.

Ọrụ, azụmahịa, njem nakwa ụlọakwụkwọ na-aga n'ihu etu ọ dịbu mbụ n'obodo dị icheiche tupu amanye iwu nọrọ n'ụlọ kemgbe izuụka asatọ gara aga.

Cheta na otu Ipob manyeburu ya bụ iwu iji kwanye gọọmentị etiti ọkụ n'ike ka ha tọghapụ Nnamdi Kanu bụ nke a nwụchiri ma kpọghachi ala Naịjirịa na ngwụcha ọnwa Juun.

Ma kemgbe ahụ, ọ bụ akụkọ mwakpo, ogbugbu, nsogbu na ịgba ụlọahịa ọkụ bụ ihe na-akpọtụ kwa ụbọchị Monde.

N'izuụka abụọ gara aga, otu Ipob na onwe ha kwuru na iwu ahụ ebiela ma katọọ ndị na-ezo n'okpuru ya ebute ọgbaghara.

Lee ebe mpaghara dị icheiche si kwụrụ ugbua

Awka, Anambra steeti

Etu Ọka dị n'ụtụtụ taa
Nkọwa foto, AWKA

Eke Awka dị ka anyị si hụ ji nwayọ ejupute na mmadụ ebe otu ihe ahụ na-eme kwa n'ebe akpọrọ 'Temp site junction' n'ụtụtụ a.

Ụfọdụ ụlọahịa na-ere ihe mepekwara emepe dịka foto ndị anyị setere na-egosi.

Ụlọahịa na-ere achịcha Bekee mepere taa n'Ọka

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, AWKA

Umahia, Abia steeti

Ụgbọala kwụ n'ahịrị bụ ihe anyị hụrụ n'ụtụtụ a n'Umahia. Ụlọakụ dị icheiche mepekwara ebe ụgbọala njem pụtara n'okporoụzọ.

Warri street Umahia
Nkọwa foto, UMAHIA

Abakaliki, Ebonyi steeti

Ndị mmadụ na-agara onwe ha ebe soro ha
Nkọwa foto, ABAKALIKI

Ọrụ amalitela ọfụma n'ebe dị iche iche. Mile 50, Kpirikpiri, Pa-Ngele Oruta Township Stadium na ebe ndị ọzọ, ndị mmadụ na-agagharị, ụgbọala nọ n'ụzọ.

Ọtụtụ ụlọakụ mepere taa ebe ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ.