Uche m adịghị n'ịzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị - Nonye Soludo

Aha onyonyo, Uche m adịghị n'ịzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị - Nonye Soludo
Uche m adịghị n'ịzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị - Nonye Soludo
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu na Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist na Video Editor

Nonye Soludo bụ nwunye gọvanọ Anambra Steeti, Chukwuma Soludo, ekwuola na o nweghi atụmatụ ọbụla ịbanye na ndọrọndọrọ ọchịchị.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo ma sị na ọrụ ya bụ ịkwado di ya ka o mee ọfụma dịka gọvanọ nakwa n'ọkwa ọzọ ọ ga-abanye.

Nonye kwuru na ọ bụ eziokwu na ụmụnwaanyị anaghị etinyekarị uche na ndọrọndọrọ ọchịchị kama na ọ na-akwado ka ha mee nke a mgbe oge ya ruru.

O kwuru na nwaanyị ọbụla kwesịrị ibu ụzọ lekọta ezinụlọ ya ma zụpụta ụmụ ya tupu ọ banye ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị.

Nonye Soludo

Nonye gara n'ihu kwuo ihe ndị bụ ọrụ ya dịka nwunye gọvanọ nke gụnyere; iwulite ọnọdụ ahụike ụmụnwaanyị na nke ụmụaka.

O kwuru na ihe mere o jiri tinye uchu n'okwu ahụike bụ maka na o nwere oge ya buru oke ibu, mana ọ malitere ịgbanwe ụdị nri ọ na-eri ma malite iri nri ndị bụ ọnatarachi (natural foods), nke mere ka e nwee ezi mgbanwe n'ahụ ya.

Nke a mere o jiri sị na ọ ga-adị mma ka ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka maka mkpa ọ dị ilezi ahụike ha anya nke ọma.

Nonye kọkwara akụkọ banyere etu o siri too, gụọ akwụkwọ, lụọ di ya bụ Gọvanọ Soludo ma mụọ ụmụ.

Kirie ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.

Chukwuma Soludo na nwunye ya Nonye

Ebe foto si, ccsoludo/Instagram

Nkọwa foto, Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo na nwunye ya Nonye