Ọ bụ kwa ụbọchị Monde ka a na-amaja anyị - ndị ahịa Timber, Naze

Ndị na-azụ ahịa na Timber, Naze kwuru na ọ bụ kwa ụbọchị Monde ka ndị echeere bụ ndị uweojii na-abịa amaja ha n'ime ahịa
Nkọwa foto, Ndị na-azụ ahịa na Timber, Naze kwuru na ọ bụ kwa ụbọchị Monde ka ndị echeere bụ ndị uweojii na-abịa amaja ha n'ime ahịa

Ndị na-azụ ahịa na Timber dị na Naze n'Owere akpọọla oku ka ndị uweojii nyere ha chọpụta onye gbagburu onye otu ha n'ime ahịa.

Oku ha na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na ndị echeere bụ ndị uweojii gbagburu otu nwoke na-azụ ahịa aha ya bụ Ebere Chibuike n'ime ahịa n'ụbọchị Monde.

Akụkọ na-ekwu na ọ bụ mgbe ndị ahụ na-achọ ịnwụchi otu nwoke, ndị ahịa achọọ ịkwụsị ha ka ha gbapụrụ egbe gburu Ebere.

Ndị uweojii Imo steeti na-ekwusi ike na ọ bụghị ndị ọrụ ha gburu nwoke ahụ nwụrụ anwụ.

Kedụ etu Ebere Chubuike si nwụ?

Ụlọahịa ebe e gburu
Nkọwa foto, Ụlọahịa ebe e gburu Ebere Chibuike

Cyracus Onwamegbu bụ onyeisi Line South Afrịka bere arịrị maka ọnwụ onye otu ya.

O kwuru sị na ọ nọ n'ụlọ mgbe akpọrọ n'ekwentị na agbagbuola otu onye Line ya n'ahịa nke mere ka ọ gbapụ ọsọ gbaga n'ebe ahụ

"Ha (ndị echeere bụ ndị uweojii) na-abịa ebe a kwa ụbọchị Monde ịmaja ndị mmadụ, ha na-abịa ebe a ịnapụ ndị mmadụ ego.

Ha bịa ebe a, ha akpụrụ ụfọdụ ndị ntọrọbịa tinye ha n'ime ụgbọala ha ma na-anapụ ha ego n'otu n'otu iji gbapụta onwe ha" ka o kwuru

Onye ọzọ nọ ebe ihe mere gwara BBC Igbo etu ndị uweojii si bịa dịka ha si abịabu mbụ n'ime ụgbọala Sienna.

"Ha jidere otu nwoke na-achọ ịkpụpụ ya, ndị mmadụ a si ha hapụ nwoke ahụ na o nweghi ihe o mere,

ha malitere iji egbe ha amaja ndị mmadụ na-ekwu na onye ọbụla kwuo okwu maọbụ megharịa ahụ, ha agbaa ya egbe

Ebere nwụrụ anwụ nọ n'ime ọdọ ahịa ya pụta sị ha na ha enweghi ike ịgba onye ọbụla egbe nke mere ka otu n'ime ndị uweojii gaa ya nso ma gbaa ya egbe n'ime ebe ọ nọ"

Dịka o si kwuo, ndị ahịa malitere ịchụ ndị uweojii ahụ ọsọ mgbe onye otu ha nwụrụ mana ha ji egbe maja ha ma banye n'ime ụgbọala ha pụọ ozugbo.

Nwoke ahụ kwukwara na o ji ọgbaatumtum soro ha n'azụ ma hụ na ha banyere n'ime isi ụlọorụ ndị uweojii bụ CID dị n'Owerri.

O kwukwara na o si n'ebe ahụ gaa mee mkpesa n'aka ndị uweojii ebe ha gbara ya ajụjụ ọnụ ma nyee ya ikike ịbuga ozu nwoke nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu.

Ndị ahịa Timber na-ewe iwe maka etu e si gbagbuo onye otu ha na nkịtị
Nkọwa foto, Ndị ahịa Timber na-ewe iwe maka etu e si gbagbuo onye otu ha na nkịtị

Kedụ ihe ndị uweojii na-ekwu maka nke a?

Ejiofor Nwanyelugo bụ Onyeisi ndị ahịa Timber na Naze, Owerri
Nkọwa foto, Ejiofor Nwanyelugo

Mgbe BBC kpọtụrụ ndị uweojii n'Imo steeti, ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye, o kwuru na ọ bụghị ndị uweojii ha mere ihe a.

"Ndị na-ebo anyị ebubo weta ihe akaebe igosi na ọ bụ onye ụweojii anyị gbagburu mmadụ n'ime ahịa" ka o kwuru.

Mana ndị isi ahịa gwara BBC na ha ekpesala n'aka Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mohammed Barde maka ihe mere.

Ha kwuru na ọ malitere ịkpọ ngalaba ụlọorụ ha dị icheiche na steeti ahụ iji mata ebe ndị ahụ eboro ebubo si.

N'otu aka ahụ ndị hụrụ ebe ihe mere sooro ndị ahụ mgbe ha na-agbapụ kwuru na ha hụrụ ha mgbe ha bara n'ime isi ụlọọrụ ndị uweojii bụ State CID n'Owerri.