Imo State Police: Etu onye a sị bụ onye uweojii si gbagbuo mmadụ n'Orlu n'ihi eyighi 'Facemask'

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, NPF/Twitter

Akụkọ na-efegharị na-ekwu na onye a sị bụ onye uweojii gbagburu otu nwoke n'Orlu Imo Steeti maka na o yighi 'Facemask'.

Akụkọ kwuru na nke a mere n'ebe a na-akpọ 'Banana Junction' dị n'Orlu.

Anya hụrụ ka ihe si mee na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo sị na onye e gburu bụ onye ọgbatumtum nke e ji ọkada mara.

Nwoke ahụ kwọ mmadụ rute na nkewa ụzọ a kpọrọ 'Banana Junction' mgbe onye a sị na ọ bụ onye uweojii kwụsịrị ya maka na o kpuchighi ihu.

Onye a sị bụ onye uweojii sị ya weta ego tupu ọ gafee ebe ọ bụ na o yighi 'Facemask' mana nwoke a jụrụ.

Nke a butere nrụrịtaụka n'etiti ha abụọ, onye a sị bụ onye uweojii wepụtara egbe ma gbagbuo nwoke ahụ.

Ndị ntoroọbịa nọ ebe ahụ malitere ime ngagharịiwe maka ọnwụ nwoke a.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Godson Orlando Ikeokwu mana ọ zaghị ekwe ntị ya.

E zigakwara ya ozi banyere nke a, ọ zaghachibeghi rute mgbe akụkọ a pụtara.

Akụkọ ka na-abịa...

Akụkọ ndị ga-amasị gị: