Waec 2020: Mmechi emechiri ụlọakwụkwọ mere ka ihe ọjụọ dị iche iche na-eme - Nwata Akwụkwọ Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi ha na nne na nna ha ekwuola uche ha maka mmachị amachịrị ụloakwụkwọ ụfọdụ iso lee ule WAEC.
Nke a na-eme dịka mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Mallam Adamu Adamu kwuru na enweghị nwata akwụkwọ nke SS3 na ụlọakwụkwọ akpọrọ "Unity Schools" ga-ele ule nke "West African Examination Council" (Waec) nke afọ 2020.
Adamu gakwara n'ihu gwakwa ndị ngalaba ule Waec ka ha hapụ maka ule Waec nke afọ a.
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ekwuputala uche obi ha, ọkachasị ndị chọrọ ile ule Waec.
Ihe ụmụakwụkwọ nwere ikwu
Nwata akwụkwọ bụ Nwamadụ Ezinwanneakola bụ onye chọrọ ile ule Waec kwuru na ọ ka mma ka gọọmentị hapụ ha ka ha lee ule ha.
Ọ rịọrọ sị "kama ka enye anyị ohere mgbe anyị na-ele ule, onye dee chaa ya alawa".
O kwukwara na ụfọdụ ụmuaka na-echefu ihe ha gụrụ mgbe ha na-akwado ya bụ ule.
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ BBC Igbo hụrụ n'ụlo akwụkwọ Practicing School nke dị n'Ezzamgbo ebe ha na-ekuziri onwe ha ihe kwuru na ike agwụla ha ị nọ n'ụlo ma rịọ ka gọọmentị wepụ mmachị amachịrị ụlọakwụkwọ.
Ndị Nne na Nna
Eze Chinyere bụ onye nkụzị n'Ezamgbo kwuru na etu esi mechie ụlo akwụkwọ amasịghị ya were sị na ya chọrọ ka gọọmentị mepee ụlọ akwụkwọ ka ụmụaka gụọ akwụkwọ.
Theresa Oge, onye nwa ya nọ n'ụlọ kamgbe kwukwara na obi adịghị ya mma na-ekwukwa na mgbachị a ga-eme ka nwa ya chefụọ nke ọ mụtara.
Otu onye ọzọ kwa bụ Ogbu Monday kwuru kwara ka gọọmentị biko bido agụmakwụkwọ n'ụlo akwụkwo ọzo n'ihi na ụmụ ha na-echefu ihe ha mụrụ.
Ndị isi ụlọakwụkwọ

Faith Okere bụ onye na-achịkọta ụlọakwụkwọ Great Lawrawoods Queens Hall kwuru na uche ya maka iwu gọọmentị maka mmachi ule Waec gbara mkpị.
O kwuru na ọ dị mkpa ka echekwa ụmụaka nke mere ka ya bụ iwu maka ule Waec masị ya mana o kwuru na ya bụ iwu adịghị mma maka na ụmụaka agaghị enweike ịnweta asabodo ha ga-eji banye mahadum.
Okere kwuru na dịka ọ dị ugbu a, na ụmụakwụkwọ ga-agba mbọ ị na-agụ akwụkwọ ha ka ha dị njikere mgbe ọbụla ewepụeụ mmachị ya bụ ule.
Ihe Gọọmentị kwuru maka nke a
Mịnịsta nke steeti na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajiuba kwuru na ọbụghị na gọọmentị achọghị ka ụmụaka ga lee ule kama ọ bụ nchekwa ụmụaka ka ha bu n'obi.Nwajiuba kwuru na ego nne na nna kwuru Waec agaghị ala n'efu.










