Children's Day 2020: Etu nke afọ a ga-esi adị iche na ndị ọzọ a na-emebu

Ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, BBC/Getty Images

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Emume ụbọchị ncheta ụmụaka nke afọ 2020 a gaara eji otu ụkwụ kara ibe ya, mana ọrịa coronavirus emenyụọla ya ka ọkụ.

Ụbọchị Mee 27 bụ ụbọchị e kewapụtara maka ime emume a ga-abịa, gafee n'afọ a, mana enweghi onye ga-atụpụrụ ya ọnụ n'ihi ọrịa coronavirus na-anyụ ụwa ịkpakwụ ugbua.

Ebe nke afọ ndị gara aga na-akpụ ọkụ n'ọnụ na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa, ọtụtụ ụmụaka agaghị echeta nke afọ a n'ihi na emume ndị e ji echeta ya agaghị eme n'ihi mmachi ngagharị na nnọkọ gọọmentị tinyere iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.

Ụbọchị Ncheta Ụmụaka nke Mee 27 abụghị nke mbaụwa

Ị ma na ọ bụ naanị na Naịjiria ka a na-eme ncheta ụmụaka n'ụbọchị a?

Mana ụbọchị ngalaba United Nations wepụtara maka ncheta ụmụaka bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Nọvemba.

N'ụbọchị ncheta ụmụaka, gọọmentị mere ya ka ọ bụrụ ụbọchị ha ga-eji nweta onwe ha, ghara ịga akwụkwọ.

Ihe a na-emekarị n'ụbọchị ahụ

N'afọ ndị gara aga, egwuregwu na mmemme gbasara ụmụaka na-eju ụbọchị ahụ; nke gụnyere ime nke Bekee kpọrọ "march past", nakwa nke a kpọrọ "party".

Ụmụaka na-atụkarị anya ihe ndị a:

1) "March past":

Ụmụaka na-eme marching

Nke a bụ mgbe ụmụakwụkwọ si n'ụlọakwụkwọ dị iche iche na-agbakọta n'otu ọgbọegwuregwu (stadium) dị na steeti ahụ, ebe ha ga-anọ mee "marching" nke ụfọdụ ndị si n'oche ọchịchị gọọmentị steeti ahụ na-abịa elele.

Ụmụaka na-akwado ọfụma ma kpaa agwa ọfụma n'ihi na a na-eme ka ha ghọta na "onye dị mkpa nọ n'etiti ha".

2) Uwe ọhụrụ: N'ihi ọgbakọ a na-eme n'ọgbọegwuregwu, a na-akwara ụfọdụ ụmụaka uwe ọhụrụ (ọkachasị ndị nke ga-eso mee "march past") a na-azụrụ ndị ọzọ uwe na akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ ka ha yiri soro ụmụaka ibe ha dịkwa ka e so n'ihe a na-eme.

3) Ime enyi ọhụrụ: Ọtụtụ ụmụaka na-eji ụbọchị ahụ emeta enyi ọhụrụ (mgbe ha gbakọrọ n'ọgbọegwuregwu ma zute ụmụaka si ebe dị iche iche bịa), ebe ndị ọzọ na-eji ụbọchị ahụ ezute ndị enyi ha ndị ha ahụbeghi anya kemgbe.

4) Ụbọchị oringo: Nye ọtụtụ ụmụaka, ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ha na-eji egwu egwu, nweta onwe ha nakwa nweta ego mmachi akpa n'aka nne na nna ha.

A na-enyekarị ha ohere ime ihe masịrị ha, mana ha ga-agba mbọ hụ na ha lọtara ụlọ na-enweghi ihe ọbụla mere ha.

Etu nke afọ 2020 ga-esi dị iche:

Ọrịa coronavirus na mmachi so ya emeela ka ọtụtụ ihe gbanwee; ihe gụnyere ndị mmadụ ịgbakọ, mmechi ụlọakwụkwọ, ime njem, ịga ebe ndị mmadụ nwereike ịnọ nweta onwe ya.

Ụmụaka

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụmụaka sere ma na-egosi ihe na-agụụ ha agụụ ime kemgbe e tinyere mmachi ngagharị n'ihi coronavirus

Etu o si metụta ụmụaka gụnyere:

1)Ha tọrọ n'ụlọ: Mmachi ngagharị ga-eme ka ụmụaka nọrọ n'ụlọ na-arọ nrọ mgbe ọzọ ha ga-apụnwu ezi gaa zute ndị enyi ha ma gwuru egwu.

Mana kama ha na ndị enyi ga-ezute, ha na ezinaụlọ ha ga-anọ n'ụlọ hụ isi ya.

Ha na-akwasa, ha a na-edozi ihe ha kwasara (ọ na-atọkwanụ ọchị?)

2) Ha agaghị ahụ ego anya: N'ọnọdụ ụwa nọ ugbua, ha mee elu mee ala, shị shị ọtụtụ n'ime ha agaghị ahụ.

Otu ihe butere nke a bụ na enweghi ebe ha na-aga ga-eme ka e nye ha ego mmachi akpa.

Ọzọ bụ na ọrịa a na-efegharị butere ọchụchụ ụfọdụ ndị nne na nna, ebe ụfọdụ apụbeghi ezi gaa chụọ nta ego etu ha si emebu; n'ihi mmechi obodo.

3) Ọrụ chere ha: Kama ịbụ ụbọchị dị mkpa e wepụtara ka ha ji nweta onwe ha, ụfọdụ ga-ahụ na ha agbatanwughi ozi na-eche ha n'ụlọ n'ọsọ.

Ebe ha gaara eji "eso m eme marching n'ụlọakwụkwọ anyị" gbanarị ozi ha kwesịrị ịga na ọrụ ha kwesịrị ịrụ ụbọchị ahụ n'afọ ndị gara aga, enweghi ebe ha ji azụ aga na nke afọ a n'ihi ihe na-eme n'ụwa.

Coronavirus mere ka ọ bụrụ na enweghi etu ị ga-esi gbanarị ọrụ dịrị gị n'ụlọ.

E nwere nke anyị chefuru ịrụtụ aka?

Lee ihe nkiri na-egosi ụmụaka na-ekwuputa ihe kachasị ha mkpa na Naịjirịa:

Aha onyonyo, Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ụgbụa

Ihe ndị ama ama na-agwa ụmụaka na May 27 nke afọ 2020

Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari gwara kelere ụmụaka, ma rịọ ha kpachapụ anya n'oge coronavirus a, ma na-amụsi ihe ọmụmụ intaneti ha ọfụma.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ji ohere a gwa nne na nna maka ịnye ụmụaka ezi nlekọta n'oge coronavirus a.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onye enyemaka onyeisiala Buhari Muhammadu maka soshal midia bụ Bashir Ahmad ji photo ndị a wee kelee ụmụaka.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ngalaba na-ahụ maka igbochi ọrịa na-efe efe na Naịjirịa akpọrọ NCDC n'ịchafụ ekelela ụmụaka ma na-arịọ ka onye ọbụla gba mbọ lekọta ha ọfụma n'oge covid 19.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Akụkọ ndị ga-amasị gị: