Coronavirus Tips: Ihe ọghọm dị n'ịgwọ onwe gị ọrịa n'ụlọ

Ndị na-azụ ọgwụ n'aka onwe ha

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Minista na-ahụ maka ahụike bu Osagie Enahire ekwuola etu ọtụtụ ọnwụ si na Covid-19 na-emetụta gọọmentị n'obi n'ihi na ọ bu ndị nwara ịgwọ onwe ha n'ụlọ.

Ọ kọwara na ndị a ji aka ha agwọ onwe ha ma malite ị ga ụlọọgwụ mgbe ọrịa bịara jidesie ha ike nke mere na azọtanwughị ndụ ha.

coronavirus
coronavirus branding

Ọ rịọkwara onye ọbụla chọpụtara na o nwere Covid-19 ya gaa ụlọọgwụ ewepụtara maka ọgwụgwọ ha ga nata ọgwụgwọ.

Nke a mere ka BBC Igbo jụọ otu dọkịta bụ McGinger Ibeneme ihe bụ ọdachi na mmadụ ịji aka ya agwọ onwe ya n'ụlọ kama ị ga ụlọọgwụ.

O kwuru na o nweghi ihe dị mma nwereike ịpụta na mmadụ agaghị n'ụlọọgwụ ka dọkịnta nyocha ya tupu amalite ọgwụgwọ.

Lee ihe ndị o kwuru ebe a:

1. Ọgwụ abụghị nri n'ihi na ọgwụ dị icheiche na-eme ihe dị icheiche n'ahụ nke pụtara na ịṅụọ ọgwụ nke dọkịnta ejighi aka ya nye gị, n'onwereike ịmebi ihe n'ime ahụ gị.

2. Ị ṅụọ ọgwụ mgbe n'ekwesighi na-eme ka ọgwụ kwụsị ịdị ire ya bụ na mgbe a na-achọ iji ya gwọ ọrịa o kwesiri ị gwọ, ọ gaghị eme nke a n'ihi na emebichaala ya.

3. Ọrịa dị icheiche na-ewepụta njirimara yiri onwe ha. Iji maatụ ọrịa dịka iba, coronavirus, ọrịa eze nakwa ndị ọzọ na-ebute ahụ ọkụ mana ọ pụtaghị na ọ bụ otu ọgwụ ka-aga eji gwọ ha niile.

4. Ndị mmadụ nwereike iji ọgwụ gbuo onwe ha n'ihi ịnụ ọgwụ ha ekwesighi ịṅụ na mbụ.

Ọ nyere ndụmọdụ sị ndị mmadụ ha gaa n'ụlọọgwụ mgbe ọbụla ọrịa na-arịa ha maka na dọkịnta mụrụ nyocha na ọgwụgwọ ahụ nakwa na ọ ga-aka mara ọgwụ ahụ gị nwereike ịnabata.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: