Imo state journalist: Ihe mere e ji kwụsị onye ntakụkọ IBC n'ọrụ

Ebe foto si, Hope Uzodimma Twitter
Okwu onye ntaakụkọ nọ ọmụgwọ akwụsịtụrụ ọrụ n'Imo steeti ka kpụ ọkụ n'ọnụ.
Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Imo steeti bụ Declan Emelumba kwuru na gọọmenti achụghị nwada a n'ọrụ kama ụlọ ọrụ mgbasa ozi gọọmenti ebe ọ na-arụ nyere ya ezumike ruo mgbe amabeghị.
BBC Igbo jụrụ ya kedụ mgbe Vivian Ottih ga-amalite ọrụ, o sara si na okwu a dịzị n'aka otu jikọtara ndị ntakụkọ niile nọ n'Imo steeti akpọrọ 'Joint Action Committee', nakwa ọ bụ ndị isi ụlọọrụ ya ga-ama oge ezumike ya ga-ebi.
Anyị jụkwara mgbe gọọmenti ga-akwụ ụgwọ ọnwa ha ji, o kwuru na ọ bụ ụlọọrụ IBC gburu oge n'iweta BVN na akara ọba ego ndị otu ha n'oge kamgbe agwara ha weta ya.
Mana o kwuru na ha ewetala ya ugbua nke mere na gọọmenti ga-akwụ ụgwọ echị bụ ụbọchị Mee iri abụọ.
Vivian Ottih zitere anyị akwụkwọ ngosi iwe ndị otu JAC degara kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ, nyere ya ọhụrụ a.

Ebe foto si, Vivian Ottih
Akwụkwọ ahụ kwuru na Vivian Ottih dara iwu makana o sighị n'aka otu NUJ, onyeisi ụlọ ọrụ IBC nakwa kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi nke Imo steeti mee mkpesa maka ụgwọ ọnwa atọ eji ya.
Ha kwukwara na ha ma maka atụmaatụ gọọmenti steeti ahụ wepụtara maka i si n'otu akpa akwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha ọhụrụ a nke mere ka ha rịọ ndị otu ha, ha nwee ndidi.
JAC gara n'ihu sepụ aka ha n'ihe Ottih depụtara n'elu 'Facebook' ebe ọ na-arịọ gọọmenti Imo steeti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ebe foto si, Vivian Ottih
BBC Igbo gara n'ihu kpọọ onyeisi ndị NUJ n'Imo steeti bụ Chris Akaraonye , o kwuru na Ottih agwaghị ya maka nsogbu a dapụtara nke o ji agwa ya nwute ya maka ụgwọ eji ya.
Lee azụ akwụkwọ ahụ.

Ebe foto si, Sahara Reporters
Onye ntaakụkọ a kwụsịrị ọrụ n'ụlọọrụ Imo Broadcasting Corporation maka ihe o dere na 'Facebook' ya ekwuola na o nweghị ihe ọjọ dị na ihe o depụtara kpatara e ji chụọ ya n'ọrụ.
Vivian Ottih gwara BBC Igbo na ihe mere o ji depụta arịrịọ nye gọọmenti maka ụgwọ ọnwa atọ akwụbeghị ya na ndị otu ya bụ makana ndị otu ya na-ebesara ya akwa agụụ maka ụgwọ e ji ha.
Kedụ ka okwu a si malite?
Ottih kwuru na ya ọ nọ ọmụgwọ na-elekọta nwa ọhụrụ ọ mụrụ mgbe ndị otu ya na-akpọkasị ya n'ekwenti na-agwa ya na agụụ ga-egbu ha ma ọ bụrụ na gọọmenti Imo steeti akwụghị ha ụgwọ ọnwa atọ ha ji ha.
Ottih kwuru na dịka onyeisi otu 'Nigeria Association of Women Journalist' nke Imo steeti, na ọ depụtara ma rịọ gọọmenti Imo steeti n'ụbọchị anọ nke Mee n'elu Facebook ya ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ebe foto si, Vivian Ottih Facebook
O kwuru na o teghị aka o dechara ya bụ ihe, akwụkwọ izara ọnụ ya nke ụlọ ọrụ ya nyere ya wuwe n'elu soshal midia tupu o ruo ya aka na bee ya.
N'ime akwụkwọ ahụ nke onyeisi ụlọọrụ IBC binyere aka, e boro Ottih ebubo na o hibere ọgbakọ ndị ntaakụkọ ebe ọ gwara ụwa na gọọmenti Imo steeti akwụbeghị ya ụgwọ ọnwa.
Ọ zachara nke ahụ ihe dịka n'ụtụtụ, akwụkwọ nkwụsị ọrụ ya ruo ya aka na mgbede otu ụbọchị ahụ dịka o si gwa BBC Igbo.

Ebe foto si, Sahara Reporters
N'ọnụ ya, "ihe niile a gbagwọjuru m anya ma dịkwa m ka ihe a kwadoro akwado."
Ottih kwuru na ka ọ dị ugbua, ọ ka nọ nkwụsị ọrụ nke akpọrọ "suspension" na bekee. Ọ natabeghị ụgwọ ọnwa o ji maka ya bee akwa.

Ebe foto si, Vivian Ottih
Kedu ndị tinyerela ọnụ n'okwu a?
Onyeisi NAWOJ na Naịjirịa niile bụ Chibota Edozie kwuru na mgbe ọ nụrụ maka ihe a dakwasara onye otu ha, na o degara gọọmenti Imo steeti akwụkwọ na-arịọ ha ka chegharịa mkpebi nkwụsị ọrụ a wepụtara nye Ottih.
Mana ruo ugbua a sabeghị ya akwụkwọ ahụ o dere.
BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndị isi ụlọ ọrụ Imo State Broadcasting Corporation(IBC) mana onye nọ dịka Director General kwuru na onweghị ikike ịza ajụjụ gbasara ya bụ okwu.
Ụlọọrụ mgbasaozi "Premium Times" depụtara na kọmịshọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Declan Emelumba gwara ha na ọ bụghị goọmenti Imo steeti jụrụ ịkwụ ndị ọrụ IBC ụgwọ ọnwa kama na ọbụ isi ụlọọrụ ahụ jụrụ iwetara gọọmenti BVN nakwa akara ọba ego ndị na-arụ ebe ahụ.
O kwuru na gọọmenti chọrọ isi n'otu akpa kwụọ ndị ọrụ ụgwọ iji wee mata ndị ọrụ aghụghọ. Ha anaghị emebu ya na mbụ dịka Premium Times di depụta.
Anyị gara n'ihu kpọọ kọmịshọna mgbasaozi Imo steeti bụ Declan Emelumba, ọ zaghị ekwenti ya mana anyị ka ga na-akpọ ya.
Onye ka Vivian Ottih bụ?
Ottih kwuru na o bidoro rụwa ọrụ na IBC kamgbe afọ 1999 (afọ iri abụọ na otu).
O kwuru na ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye ntaakụkọ ukwu n'ụlọ ọrụ ahụ.
O bụ onyeisi otu "Nigeria Association of Women Journalist" nke Imo steeti.
Ọ lụọla di ma jide ụmụ atọ.











