Madagascar Coronavirus: Gịnị dị n'ime ọgwụ ọhụrụ a azụtara na Madagascar?

Andry Rajoelina

Ebe foto si, Getty Images

Dịka gọọmentị Naịjirịa nyere iwu ka a tụbata mgbọrọgwụ nke e mepụtara na mba Madagascar iji gwọọ ọrịa coronavirus, ọ bụrụla akụkọ na-ewu ewu ebe niile.

Ụfọdụ mmadụ dịka otu onye Dọkịta bụ McGinger Ibeneme kwuru na ọ ga-adị mma itule ya bụ ọgwụ dịka Minista ahụike bụ Osagie Ehanire si kwuo.

coronavirus
coronavirus branding

O kwuru nke a n'ihi na n'ọnụ ya "Coronavirus anyụọla mbaụwa niile ịkpakwụ" ya mere a ga-eji chọọ ọgwụgwọ ọsịsọ.

Ngalaba ahụịke bụ World Health Organisation (WHO) na-adọkwa aka na ntị ka e mee ọgwụ ahụ nnyocha mara ma ọ ga-adị mma n'ime ahụ mmadụ tupu e nye ya onye bu ọrịa a.

Mana e nwere onye ma ihe dị n'ime ọgwụ a?

Kedụ ka o si atọ? Lee ihe anyị ma:

Akwụkwọ Artemisia Annua

Ebe foto si, Getty Images

  • Aha ọgwụ ahụ bụ "Covid-Organics" maọbụ CVO dịka Onyeisiala Madagascar Andry Rajoelina si kwuo
  • E si n'akwụkwọ ndụ 'Artemisia' (n'olu Bekee) nakwa mgbọrọgwụ ndị ọzọ a na-achọta na Madagascar wee na-arụpụta ya.
  • Artemisia ahụ na-eto eto n'ala Naịjirịa dịka e ji ya agwọ ọrịa ịba (Malaria).
  • Arụpụtara ya dịka ihe ọṅụṅụ nke Onyeisiala Rajoelina gwara ndị mmadụ ka ha ṅụọ ugboro atọ kwa ụbọchị.
  • Dịka gọọmentị mba Madagascar si kwuo, e mere ntule n'ahụ mmadụ erughi iri abụọ n'ime izuụka atọ tupu ha amalite ire ya.
  • Mba dị icheiche dịka Tanzania, Congo-Brazaville nakwa Guinea-Bissau azụtala ya bụ mgbọrọgwụ.