Onitsha Bridge: Gịnị na-akpọtụ na akwa mmiri Niger?

Geeti dí n'akwammiri Niger n'akụkụ Asaba 24-05-2020

Ebe foto si, Harrison Gwamnishu

Ọ bụ n'ụbọchị ụka nke Mee iri abụọ anọ ka ụfọdụ ihe onnyonyo nakwa foto gosiri ebe etinyere geeti na mbido akwa mmiri Niger bidoro ịfegharị ebe niile.

Akụkọ ndị ahụ na-ekwu na gọọmentị Anambra steeti mere nke a iji kwụsịtụ njem ụgbọala nke gọọmentị etiti machiri n'ihi ọrịa coronavirus.

Otu onye hụrụ ebe ihe a mere bụ Harrison Gwamnishu gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ n'abalị ụbọchị Satọde ka gọọmentị Anambra tinyere geeti ahụ nke ndị mmadụ hụrụ n'ụtụtụ ụbọchị ụka.

O kwukwara na ọtụtụ gwongworo ndị bu nri nakwa mmanụ agbịdị tọrọ atọ n'elu akwa mmiri ahụ n'ihi na ha ahụghị ụzọ ịbata ebe ọbụla.

Mana n'iwu gọọmentị etiti manyere, ha kọwara na ụgbọala ndị bu ihe dị mkpa ekwesighi isonye na mmachi amachiri njem.

Harrison kwukwara na ndị ọrụ Covid-19 na Delta steeti bụ "Task Force" dọturu geeti etinyere n'akụkụ akwa mmiri ahụ dị n'Asaba ka ndị mmadụ nwe ike gafere.

Ginị ka steeti Anambra na Delta na-ekwu?

Ọnịcha Head Briji

Ebe foto si, Haruna Mohammed

Mgbe BBC kpọtụrụ onye odeeakwụkwọ gọọmentị Delta steeti bụ Chiedu Ebie, o kwuru na ọ maghị maka geeti ọbụla emere ndọtu.

O kwukwara na ọ ma na gọomentị Anambra tinyere geeti n'ajụghị ha maọbụ gwa ha maọbụ kpaa ya akpa.

"Ihe a bụ ihe anyị na-akpọ oku kemgbe ka anyị tinye uche mara ihe anyị ga-eme maka okwu a" ka o kwuru.

Ọ sị kwa "anyị akpọọla ha oku ka ha si Awka bịa zute anyị ka anyị kpaa ya bụ okwu ọfụma"

N'aka nke ọzọ, Kọmịshọna mgbasaozi nke Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru na ha na-akwado ịbanye nzụkọ gbasara ya bụ okwu.

O zitekwara ozi sị na steeti abụọ ndị a enweela nzụkọ atọ taa bụ ụbọchị Monde ma kwuo na ha ga-ezute echi iji kpebie ya bụ okwu kpam kpam.

"Ihe dị steeti anyị abụọ mkpa bụ ịlụso ọrịa Coronavirus agha" ka o kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị