Nigeria Police vs Civil Defense: Etu ndị uweojii siri kụnye m ajụ n'isi - Onyeisi Civil Defence Imo Steeti

Ebe foto si, Nigerian Police/NSCDC
Akụkọ na-ekwu na ndị ọrụ uweojii wakporo isiụlọọrụ ndị Civil defence dị n'Owerri ma gbagbuo mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.
Onye ntaakụkọ sị na nke a mere na mgbede ụbọchị Mọnde 25 Eprel 2022 mgbe ọtụtụ ndị ọrụ civil mechichara ọrụ.
Ihe onyonyo pụtara na soshal midia gosiri ka mmadụ abụọ nwụrụ anwụ tọgbọ n'ala ebe otu onye ọbara juru ahụ nọ n'ebe akwa.
Kedụ ihe ndị ọrụ NSCDC na-ekwu?

Ebe foto si, Civil Defence/Facebook
Onyeisi otu NSCDC n'Imo Steeti bụ Michael Ogar na-ebo ndị Police ebubo na ha wakporo ya.
Ọ bụ dịka Ogar na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka ka o kwuru nke a.
O kwuru sị, "Ndị NSCDC jidere otu onye aha ya bụ Nonso Ezenwanne n'ihi na ogbochiri ụgbọala m na nke ndị na-eso m dịka anyị si Egbema ebe ọkụ gbara alọta".
O kwuru na ha jidere ya n'ihi na ọ kwuru na ọ bụ onye uweojii kama ha hụrụ Kadị njirimara olemaole n'ahụ ya mere ha jiri yowe ya enyo.
Ogar kwuru na agbanyeghi na ha mechara hapụ ya na Ezenwanne gara n'ihu soro ụgbọala ha n'azụ ruo Owerre ebe ọ nọchịrị ha ụzọ ma wepụta egbe Pistọl.
Kama o kọwara na ndị otu ya napụrụ ya egbe ahụ ma nwuchie ya.
O kwuru na ọ kpọtụrụ onye nnọchite anya kọmịshọna uweojii Imo Steeti bụ DCP Giwa ka ọ kpesara ya maka agwa Ezenwanne kama ọmụtaghị mkpụrụ ọbụla.
Ogar kwuru sị, " Mgbe m kpọrọ kọmịshọna nwa mgbenta DCP Giwa ka m kpesere ya maka ihe mere, ọ gwara m na ezipụla Ezenwanne ma zịga ya Kaduna".
O kwuru na ọ bụ mgbe ọ na-aga ịhụ onyeisi MOPOL 18 ka ndị uweojii wakporo ya.
Ogar kwuru sị, " Ihe ruru ụgbọala asatọ nọchịri anyị ụzọ were bido gbawa egbe n'elu, ha gbakwara ụgbọala m egbe, kpọpụta m ma were osisi na ụtalị tiem ezigbo ihe".
O kwuru na ndị a kpọrọ ya gaa n'isi ụlọrụ ha ma bido na-eti ya ihe ruo awa atọ tutu osote kọmịshọna na-ahụ maka ọrụ ndi uweojii abịa zọpụta ya.
Ogar kwuru na ọ bụ mgbe ọ lọghachiri n'ụlọọrụ ha ka ọ hụru ihe ndị uweojii a mebiri ma chọpụta kwa na-agbara ndị otu ya abụọ egbe.
Kedụ ihe ndị uweojii na-ekwu?
Ndị uweojii nke Imo Steeti sitere n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Mike Abattam sị na enweghị onye ọrụ Civil Defence ha merụru ahụ maọbụ gbuo.
Ha depụtara sị, " ọ bụ n'ụbọchị 24/04/2022 nihe dịka elekere 2010 nke abalị ka Ezenwanne Nwosu onye eziri ozi pụrụ iche ji ụgbọala ya achọ ụzọọ ga-esi pụọ dịka okporo ụzọ kpọchịrị akpọchi ".
Abattam depụtara na ọ bụ dịka Ezenwanne na-achọ ụzọ ọ ga-esi pụọ ka onye ọrụ Civil Defence rituru n'ụgbọala ha were suo aka n'ụgbọala Ezenwanne were baara ya mba ka ọwepụ ụgbọala ya n'ụzo.
Kama ọ kọwara na onye ọrụ CivilDefence mara Ezenwanne ụra dịka ọ chọrọ ịkọwara ọnọdụ ya.
Abattam dere sị, " Mgbe ọ gwara ya na ọ bụ onye uweojii na ọ mara ya ụra ọzọ ebe ndị ọrụ CivilDefence ọzọ bịazịtị tiwa ya ihe".
O kwukwara na mgbe ọ chọrọ iji ekwe ntị ya kpọọ onyeisi ya na ndị ọrụ Civil defence ahụ napụrụ ya ekwentị nke mere ka o osro ha gawa ụlọọrụ ha.
Ọ dere sị, "Mgbe Ezenwanne jụrụ ha maka ekwentị ya, ha tiwere ya ihe, ma napụ ya egbe ya".
O kwuru na ha kpọchiri ya ruo ụbọchị 25/04/2022.
Abattam dere sị, " Dịka etu ọrụ Ezenwanne jiri dị oke mkpa, mgbe ndị otu ya ahụghị ya ma ọzaghịkwa ekwe ntị ya, ha bidoro chọwa ya. Ha nyochara were chọpụta na ekwe ntị ya nọ n'ụloọrụ ndị Civil Defence".
O kwuru na ndị uweojii chọrọ Ezenwanne gaa n'ụlọọrụ ndị Civil defence ma sị na ndị orụ Civil Defence si ndị uweojii ka ha pụọ ma ọbụghị ya na ha ga-agba ha egbe.
Abattam kwuru sị," mgbe ndị uweojii kwusiri ike na ha chọrọ onye otu ha, ndị ọrụ Civil Defence bisdoro gbaliwe egbe elu. NKe a mere ka ndị uweojii were ikuku ose chụsaa ha ma kpọpụta onye otu ha na-amarụghị onye ọbụla ahụ.
Abattam kwuru na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mara na usoro ndi nchekwa ji arụrịta ọrụ bụ na mgbe ọbụla otu ọrụ nchekwa ọbụla nwuchiri onye otu ọrụ nchekwa ọzọ, ọ bụiwu na a ga-akpọ ụlọọrụ onye anwuchiri ma gwa ya na eji onye nke ha.
O kwuru na ọdịghị mma ịnwuchi onye ọkwa ya dị elu dịka Suprintendent, jide ya rụọ awa 24 ma onyeisi ọtụ NSCDC echeghị na ọ dị mkpa ka ọkpọtụrụ onye isi ya gwa ya na ha jidere ya.
Abattam dere sị, " Onye ọrụ anyị a na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ndị uweojii nke dị na Amakohia'.
O kwuru ka ndị IMo steeti niile hapụ itu egwu ma sị na kọmịshọna uweojii Imo Steeti bụ Mohammed Ahmed Barde enyela osote kọmịshọna uweojii steeti ahụ ka ebido nyocha maka ya bụ ihe mere.
Kedụ ihe butere nke a
Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ndị uweojii a wakporo ụlọọrụ ndị civil defence ịbịa zọpụta onye otu ha a kpọchiri na nga n'ụlọọrụ ahụ.
Ọ sị na a nwuchiri onye uweojii ahụ mgbe ọ gbabara n'ogogo ụgbọala ndị bu onyeisi ndị civil defence n'Owerri mgbe ha si n'Abaezi Egbema bụ ebe ọkụ mmanụ agbidi adịgboroja gbagburu ndị mmadụ na-alọta.
Ọ sị na ihe mere n'ebe a kpọrọ ;control post dị n'owerri, na nwoke ahụ na-eyighi uwe ndị uweojii ji ụgbọala ya na-eso ụgbọala onye ndị civil defence n'azụ.
Nke ahụ mere onyeisi ndụ civil defence jiri nye iwu sị ka a nwuchie nwoke ahụ na mgbede Sọnde ahụ.
"Na mgbe echi ya bụ Mọnde ka ndị uweojii wuchiri n'isiụlọọrụ ndị Civil defence ma malite ịgba egbe ma na-eti ndị ọrụ civil defence bụ ụmụnwaanyị ihe, ha gbagburu mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ahụ.
Kedụ ihe bụ ọrụ ndị uweojii?

Ebe foto si, Nigerian Police
Ndị uweojii bụ otu n'ime ngalaba nchekwa Naịjirịa e hiwere kpọmkwem n'afọ 1960, mgbe Naịjirịa nweere onwe ha n'aka mba Briten.
Tupu nwereonwe ahụ, e nwekwara ndị uweojii nọ n'ọrụ mana a gbanwere aha ha ka ọ bụrụ 'Nigerian Police Force' (NPF).
Ụfọdụ ọrụ e ji maara ha gụnyere;
Igbochi mpụ, ichekwa ndụ, ichekwa akụnaụba, iweta udo n'obodo, inwuchi ndị dara iwu maọbụ mere mbụ, ịme nyocha banyere mpụ dgz.
Kedụ ihe bụ ọrụ ndị 'civil defence'

Ebe foto si, Nigerian Civil Defence
Civil Defence bụ otu n'ime ngalaba nchekwa na Naịjirịa e hiwere n'afọ 1967 n'oge ụagha Biafra.
O mechara gbanwee ma bụrụ Nigerian Security and Civil Defence Corps (NSCDC) n'afọ 1970.
Ụfọdụ ọru ha na-arụ gụnyere;
Iwete udo n'obodo, inyocha ndị na-esi mmanụ agbidi adịgboroja, inwuchi ndị mere mpụ ma ha o ji ikike maọbụ ha ejighi ikike, inyocha ụlọọrụ nchekwa ndị mmadụ nwee, ịkpachi akụrụngwa ndị e ji mee mpụ, ịnyocha ọrụ otu okpukperechi dị iche iche na-arụ, ibuagha megide ndị otu nzuzo dgz.










