Cannibalism Imo: Aka anyị adịghị na ndị omekome a nwụchiri na-eri anụ mmadụ

Otu Ipob

Otu Ipob agọọla na aka ha adịghị ndị omekome ndị ọrụ nchekwa chọpụtara na-atọ ndịmmadụ, egbu ma na-amị anụ ha n'ọkụ eri n'Okpuru ọchịchị Imo steeti.

Ọnụ na-ekwuru otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Emma Powerful kwuru n'ozi o wepụtara ụbọchị Tọzde na-ekwu na ndị na-akpa mkpamkpa na mpaghara Imo steeti na Anambra steeti abụghị ndị otu Ipob maọbụ Eastern Security Network (ESN).

Ipob sị na ọ bụ ndi otu nzuzu bụrụkwa ndị omekome nke ọ boro gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma ebubo na ọ nọ n'isi ikpa nkata mkpa mkpa ndị a.

Ha kwuru na ndị omekome e jidere n'obodo Orsumoghu nke Anambra steeti nakwa obodo Orsu ihiteukwu nke Imo steeti bụ ndị otu Gọvanọ steeti ahụ hibere iji mmegharịa ọha anya ma bụte ọghaghara n'aha otu Ipob.

Ha rụkwara ndị otu pati All Progressives Congress (APC) n'ihe a na-eme n'Imo nakwa Anambra steeti.

Ozi ahụ kwuru:"Anyị bụ ndị ESN anaghi etinye aka n'ọgbaghara, anyị anaghị awakpoo ndị mmadụ, anyị anaghị ata anụ mmadụ,anyị anaghị edegara ndị obodo akwụkwọ maọbụ zigara ozi ka ha zitere anyị ego n'ike.

Ha gụpụkwara aha otu Ipob/ESN n'otu ndị na-atọrọ ndị mmadụ.

Ha gara n'ihu kpọpụta aha mmadụ ole m ole ha boro ebubo na ha bụ ndị nọ n'isi mkpamkpa ndị a.

Cheta na ndị uweojii ji aka ike buso ndị omekome agha n'akụkụ Imo steeti nakwa n'Anambara steeti n'ụbọchị Mọnde, akụkọ mgbapụta ụfọdụ ndị nakwa mwụchị ndị a na-enyo na ha nọ n'isi ọgbaghara na-eme ha steeti ahụ feghari ebe niile n'izu a.

A hụrụ ozu ndị mmadụ a na-enyo na ndị omekome na-ata nakwa olulu ebe ha na-edobe ozu ndị mmadụ.

Cannibalism Imo: Mkpamkpa kpara dịka ndị ọrụ nchekwa na ndị 'unknown gunmen' a sị na-eri anụ mmadụ kwatara n' Orsu

Ụlọ ụrụ ndị uweojii n'Orsu

Egwu emela ka ọtụtụ ndị obodo Nkwerre-Uda dị n'okpuru Ọchichị Orsu, Imo steeti, gbaa ọsọ ndụ dịka ndị ọrụ nchekwa na ndị omekome na-akpa ike na mpaghara ahụ kwarịta mgbọ ụbọchị Monde.

N'ụbọchị Monde, abalị 14 nke ọnwa Disemba, n'ọgụ nke ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị DSS, ndị agha , ndị agha mmiri na ndị civil Defence gbakọrọ aka wakpoo ndị omekome ahụ n'ebe ha na-ezo.

Ha kwarịtara mgbọ ogologo. ka ya bụ ọgụ biri, ọtụtụ ndi omekome ahụ dọrọ n'ozu , ebe a nwụchiri mmadụ 30 n'ime ha.

Ndị a na-enyo na ha bụ ekperima na-eyi ndị Okpuru Ọchịchị Orsu egwu

Ebe foto si, Hope Uzodimma

Nkọwa foto, Ndị a na-enyo na ha bụ ekperima na-eyi ndị Okpuru Ọchịchị Orsu egwu

Onyeisi ndị DSS du ndị ọrụ nchekwa gaa ya bụ ọgụ bụ Wilcox Idaminabo kwuru na " ihe dịka Elekere mbụ nke ụtụtụ Monde, ndị ọrụnchekwa gụnyere ndị agha, ndị uweojii na ndị DSS gawakporo ọdọ ndị omekome n'Ụda n'Imo steeti na Uli n'Anambrara steeti."

" Anyị hụrụ na ndị obodo ahụ agbaala ọsọ, ndị omekome wagharazie ha nwere na-eyi ndụ egwu."

Awo-Idemili
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ agbala ọsọ gbapụ n'okpureu ọchịchị Orsu

Ọ gara n'ihu kwuo na ha zọpụtara Eze Acho Ndukwe nke Amagu Ihube n'Okigwe bụ onye a tọọrọ abalị ole na ole gara aga.

Ụgbọala ndị a gbapụtara n'ọdọ ndị ekperima n'Orsu

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

" Ha hụkwara ozu ndị ha bepụrụ isi nakwa ihe gosiri na ndị ekperima ahụ na-eri anụ mmadụ dịka ha na-arụ anụ mmadụ n'ọkụ."

Cannibalism Imo: Ndị ọrụ nchekwa na-ebo na ndị 'unknown gunmen' na-eri anụ mmadụ n'Orsu, Imo steeti
Nkọwa foto, Cannibalism Imo: Ndị ọrụ nchekwa na-ebo na ndị 'unknown gunmen' na-eri anụ mmadụ n'Orsu, Imo steeti

O kwukwara ha ha hụkwara ụgbọala nakwa ozu ndị mmadụ nke gosiri na ihe ndị ahụ na-eme bụ ịtọrọ ndị mmadụ , gbuo, bepụ ha isi , ma hụọ ụfọdụ n'ọkụ.

O kwuru na ha na ha chịpụrụ ya mana , ha merie na enweghị onye ọrụ nchekwa merụrụ ahụ.

Úgbóala ndí enwetara

Ebe foto si, Imo Government

Ndị ntaakụkọ gara Orsu Ihitte Ukwa n'ọdọ ndị omekome ahụ bụ ndị ha na Uli dị n'Anambra steeti gbara agbataobi kwuru ha na ha hụrụ ozu ndị mmadụ na-ere ure ma ndị amịrị n'ọkụ nakwa ụfọdụ ndị abọkarala akụkụ ụfọdụ n'ahụ ha.

Ha hụkwara ozu n'ebe dịka okwu arụsị nakwa n'ime olulu.

N'ozi ya, ọnụ na-ekwuru gọvanọ Imo steeti bụ Oguwike Nwachuku toro ndị ọrụ nchekwa maka mbọ ha gbara inye ndị ntọ na ndị ojiegbe na-eyi ndị bi n'Okpuru Ọchịchị Orsu egwu ọsọ.

Cheta na BBC wetaburu akụkọ etu ndị obodo nọ n'Orsu siri gbaa ọsọ n'obodo ha dịka ndị omekome ji obodo ha kwara ọnọdụ, na-atọ ndị mmadụ mana egbukwa ọtụtụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: