Ali Bongo, Paul Biya... Lee mba Afrịka ndị isi ala ha nọrọla ogologo oge n'ọchịchị

Ali Bongo

Ebe foto si, Getty Images

Gabọn esonyela na mba ebe ndị agha weghaara ọchịchị n'ike n'aka ndị nkịtị.

Nke a na-abịa dịka ndị agha ahụ kagburu mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'ụbọchị Satọde, bụ nke e kwupụtara na ọ bụ Ali Bongo meriri ya iji nọdụ n'ọkwa onyeisiala ruo afọ ise ọzọ.

Cheta na Bongo malitere ọchịchị na 2009 dịka nna ya bụ Omar Bongo nwụchara. Nchụpụ a ndị agha chụpụrụ ya wetara ọchịchị nke ezinụlọ Bongo chịwara na mba Gabon kamgbe afọ 53 gara aga, n'isi njedebe.

Mwaghara ọchịchị a na mba Gabon mere ya mba asatọ n'Afrịka ebe ndị agha weghaara ọchịchị n'ike n'ime afọ atọ gara aga.

Mana ọ bụghị naanị Ali Bongo bụ onyeisiala n'Afrịka nọrọla ọtụtụ afọ n'ọchịchị, ha na ezinụlọ ha. Lee ụfọdụ ndị ọzọ:

Teodoro Obiang Nguema Mbasogo - Equatorial Guinea

Teodoro Obiang Nguema Mbasogo

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Teodoro Obiang Nguema Mbasogo

Teodoro Obiang Nguema Mbasogo onye dị afọ 81 ugbua bụ onyeisiala kacha nọọ ogologo oge n'ọchịchị n'ụwa niile dịka ọ chịala mba Equatorial Guinea ihe ruru afọ 44.

Ọ malitere ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 1979. Na Nọvemba 2022, o ji pasentị 95 wee merie ntuliaka ọkwa onyeisiala iji nọgide n'ọchịchị.

Nwa ya nwoke bụ Teodoro Nguema Obiang Mangue bụ osote onyeisiala, ebe ọtụtụ ndị ezinụlọ ya nwere ọtụtụ ọkwa dị elu na gọọmentị mba ahụ.

Paul Biya - Cameroon

Paul Biya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Paul Biya

Paul Biya, onyeisiala mba Cameroon, anọọla n'ọchịchị kamgbe afọ 1982, ya bụ afọ 40.

A mụrụ ya n'afọ 1933, nke mere ya onye kacha bụrụ okenye ji ọkwa onyeisiala na mpaghara 'sub-sahara' nke Afrịka.

Paul Biya meriri ntuliaka nke ugboro asaa ya dịka onyeisiala n'afọ 2018. A ga-enwe ntuliaka ọzọ n'afọ 2025.

Denis Sassou Nguesso - Republic of the Congo

Denis Nguesso

Ebe foto si, AFP

Denis Sassou Nguesso bụ onyeisiala mba Republic of the Congo, ọ nọọla afọ 38 n'ọkwa onyeisiala.

Nguesso bụbu onye agha laghachiri n'ọchịchị n'afọ 2016 dịka mba Congo gbanwere iwu ha iji nye ohere ka onyeisiala zọọ ọkwa ọchịchị nke ugboro atọ.

Ọ malitere ọchịchị n'afọ 1979 ruo afọ 1992 oge ọ dara ntuliaka, mana ọ laghachiri azụ n'afọ 1997 ma ka na-achị ruo ugbua.

Denis Sassou Nguesso dị afọ 80 ugbua ma na-akwado ịzọ ọkwa onyeisiala nke ugboro ise.

Yoweri Museveni - Uganda

Yoweri Museveni

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Yoweri Museveni

Yoweri Museveni nke mba Uganda banyere n'ọchịchị site na mweghara ọchịchị nke ndị agha mere n'afọ 1986, iji bụrụ onyeisiala nke itoolu nke mba ahụ.

ugbua, Museveni, onye dị afọ 78, anọọla n'ọchịchị ruo afọ 37.

N'agbanyeghị na ọ nọteela aka n'ọchịchị, ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ọchịchị ya wetara udo na ọganihu na mba Uganda.