Gịnị mere India ji chọọ ịga n'Anyanwụ mee nnyocha?

Ebe foto si, India Space Agency
Ka ọ gachara otu izuụka ha ghọrọ mba mbụ na-atụ na ndịda Ọnwa(South Pole of the moon), India na-akwado ịga n'Anyanwụ.
Ihe ha chọrọ ime bụ itinye igwe ga na-enyocha kpakpando dị nso nakwa ọnọdu ihe igwe nakwa ikuku dị n'elu'space'.
Nke a abụghị mbụ a na-aga inyocha Anyanwụ-- Nasa nakwa ngalaba 'European Space Agency (ESA) agabuola tinye onyokomita na-eme nke a. -Mana nke a nwere njirimara pụrụ iche.
Ya mere, kedụ ihe bụ Aditya-L1? Lee ihe nile I kwesịrị ịma maka ije a.
Kedụ ụbọchị na oge nfepụ Aditya-L 1?
Aditya pụtara Anyanwụ n'olu Sanskrit na Hindi, ọ bụụ na ihe gaa ka e si hazie ya, ụgbọ ihu igwe ahụ ga-efepụ n'Elekere 06.20 n'ụbọchị Satode ,abalị abụọ nke ọnwa Septemba site n'ọdọụgbọ ihu igwe dị na Sriharikota nke dị kilomita100km site n'Ugwu Chennai.
Foto si n'aka ngalaba na-ahụ maka njem ịgan'ọnwa na Anyanwụ bụ Indian Space Agency' na-egosi na rọket bu igwe nnyocha ahụ akwụrụla ma dị njikere.
Kedụ oge ọ ga-ewe irute n'Anyanwụ?

Ebe foto si, ISRO
Ụgbọ ihu igwe ahụ( spacecraft) agaghịa aga na kpakpando dị anyị nso ma ncha.
Ọ ga-aka kilomita otu nde na ọkwara( 1.5 million kilometres) site n'Ụwa - Nke a ruchara ugboro anọ ihe ọ ga ewe isi n'ụwa gaa n'ọnwa.
Mana nke a bụ ntakịrị (1%) ihe ọ ga-ewe ị ga n'Anyanwụ bụ nke dị kilomita nde narị na iri ise na otu(151 million kilometres).
I were ya tụnyere ụgbọ nke Nasa bụ 'Parker spacecraft', nke otu izuụka gara aga, gbafere Venus, ọ ga-efe ihe ruru kilomita nde isi na ụma otu( 6.1 million kilometres) site n'ihu Anyanwụ.
Mana etu o sila dị, ọ ga-ewe Aditya-L1 oge irute ebe ọ na-aga.
Dịka ngalaba "the Indian Space Research Organisation" (Isro) si kwuo n'ozi ha wepụtara na ọbaozi X a mabu dịka Twiitter, "Ọ ga-ewe Aditya-L1 ọnwa anọ malite oge nfepụ ya irute /L-1 (Lagrange point)."
Gịnị mere e ji agba mbọ nile a, ebe Anyanwụ ka dị ebe dị anya?
Gịnị bụ ebe 'Lagrange point'?
L1 bụ ihe a na-akpọ 'Lagrange point' - ebe n'urukpu igwe ikike na-adọ Ọnwa na Anyanwụ ha nhatanha bụ ebe ụgbọ ihu igwe nwere ike ibelata mmanụ ụgbọ ọ na-eri.
Aha a bara ebe a sitere n'otu nwoke Fransị bụ ọkaibe na mgbakọ na mwepụ bụ onye mere nnyocha a mbụ n'agbata afọ 1700(18th Century).
Kedụ ebumnobi njem Aditya-L1?
Ụgbọ ihu igwe nke mba India a ga-ebu ibu asaa ga-eji akọrọngwa 'electromagnetic' na 'particle field detectors' were nyocha mpụta Anyanwụ-nke a ma dịka "photosphere" na "chromosphere".
Ọ ga-enyochakwa ihu igwe nakwa ikuku dị na 'space. bụ nke na eme ka ife si ugwu na nke ndịda na-achakwasị Ụwa.
Ọ ga-enyochakwa mkpasu ihu igwe nke Bekee kpọrọ "electromagnetic disturbances".
Kedụ ego ole njem Aditya-L1 ga-eri?
N'afọ 2019, Gọọmentị mba India mapụtara nde dọla iri anọ na isii($46m) maka ije a.
Ngalaba "Indian space agency" ewepụtabeghị kpomkwem ihe oriri ha mana a haziri nnyocha ka ọ nọ n'ime igwe( space) afọ ise.
N'afọ 2014, India bụ mba mbụ dị n'Asia sipụrụ ụgbọ fere okirikiri Mars, ha na-akwadokwa ifegharị n'okirikiri Ụwa abalị atọ n'afọ na-abịa.













