Ali Bongo: Tinubu, African Union, akatọọla etu ndị agha si chụtuo onyeisiala Gabon

Ebe foto si, Nigeria Presidency/Moussa Faki Mahamat/X
Otu jikọrọ mba Afrịka niile bụ 'African Union' akatọọla etu ndị agha mba Gabon si chụtuo onyeisiala ha bụ Ali Bongo ma weghara ọchịchị n'ike.
Nke a na-abịa dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu katọkwara ihe a mere na Gabon ma kwusie ike na "ike ọchịchị kwesịrị ịbụ ihe si n'aka ọha obodo, ọ bụghị ihe a na-ewere site n'ikike nke egbe".
N'akwụkwọ ozi nke onyeisioche AU bụ Moussa Faki Mahamat wepụtara n'ehihie ụbọchị Wenezde, o kwuru na "otu AU na-ahụ ihe na-eme na mba Gabon ma na-akatọkwa atụmatụ iweghara ọchịchị n'ike".
Mahamat, bụbu Praịm Mịnịsta mba Chad, kwuru na ihe a ndị agha mere megidere iwu hibere otu AU nakwa iwu gbasara ntuliaka na ọchịchị onye kwuo uche ya n'Afrịka.
Ọ kpọkuru ndị agha Gabon ka ha tinye uche n'ọrụ ha nke bụ ịkwado na ichekwa okiri mba ha, ma hụkwa na onyeisiala Ali Bongo na ndị ezinụlọ ya enweghị mmerụahụ ọbụla.
O kwuru na ọ dị mkpa ka ndị agha ahụ nye ohere maka mkparịtaụka nke ga-eweta udo, ma laghachikwa n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na-egbughị oge.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru onyeisiala Tinubu bụ Ajuri Ngelale kwuru na "Tinubu na ndị isiala mba niile so n'otu African Union na-ejikọ aka iji mara ụkwụ ọzọ ha ga-atụpụ maka ihe na-eme na Gabon".
"Ọ dị mkpa iso usoro iwu na ikpe ziri ezi oge niile iji mezie esemokwu na nghọtahie sitere na ntuliaka. Anyị agaghị ekwe ka nke a laa n'iyi na mpaghara Afrịka anyị a dị ukwu," Tinubu kwuru.
"Meenụ mkpọtụ, ụnụ agbachikwala nkịtị" - Ihe Ali Bongo gwara ndị nkwado ya

Ebe foto si, Screengrab/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisiala mba Gabon bụ Ali Bongo emeela onyonyo ọhụrụ nke o tinyere n'akara Twitter ya ma kpọkuo ndị nkwado ya n'ụwa niile ka ha "mee mkpọtụ" maka etu ndị agha mba Gabon si jichie ya.
Cheta na ndị agha mba Gabon kwupụtara n'ụtụtụ Wenezde na ha ewerela ọchịchị n'ike na mba ahụ, dịka ha boro ebubo na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere na gabon n'izuụka gara aga jupụtara na nrụrụ aka.
N'onyonyo ahụ nke e tinyere na Twitter dịka o ji nkeji iri gafee elekere 12 nke ehihie, Ali Bongo sịrị: "ana m akpọku ndị enyi anyị n'akụkụ ụwa niile ka ha mee mkpọtụ maka ihe na-emenụ".
"Ndị a ejidela m ebe a, ha jidere nwa m nwoke n'ebe ọzọ ma jidekwa nwunye m n'ebe ọzọ. Amaghị m ihe ọbụla na-emenụ ugbua. Ụnụ agbachila nkịtị, meenụ mkpọtụ."
Ebe ọ nọ mee onyonyo a bụ n'ime ụlọ ya maka na a hụrụ oche, kapet, nakwa akwụkwọ ọgụgụ dị icheiche".
Ndị agha weghaara ọchịchị kwuru na ha ji Ali Bongo na ndị ezinụlọ ya na 'house arrest'. Ha boro otu nwa Bongo ebubo 'treason'.
Gabon Coup: Ihe mere anyị ji were ọchịchị n'ike - Ndị agha Gabon
Ndịagha mba Gabon apụtala n’ihe onyonyo TV ma kwuo na ha ewerela ọchịchị na mba ahụ.
Ha kwuru na ha na-akagbu mpụtara ntuliaka e mere n’ụbọchị Satọde, nke e kwupụtara onyeisiala ha bụ Ali Bongo dịka onye meriri.
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka kwuru na Bongo nwetere ọkara abụọ n’ime ọkara atọ vootu ndị a tụrụ bụ nke ndị na-ama ya aka sị na nrụrụaka dị na ya.
Nchutu n’ọkwa ya ga-akwụsị ezinaụlọ ya ịnọ n’ọchịchị mba Gabon bụ nke ma jichiri kamgbe afọ iri ise na atọ (53yrs).
Ndịagha mmadụ iri na abụọ pụtara na TV n’ụbọchị Wenezde, kwuo na ha na-akagbu mpụtara ntuliaka ma “kposaa ngalaba gọọmentị niile na mba ahụ.”
Ha kwukwara na a gbachiela okeala niile e si abata na mba ahụ “ruo oge a na-amaghị mgba a ga-emepe ha.”
Otu onye agha kwuru n’ụlọọrụ mgbasaozi Gabon 24: “Anyị ekpebiela ichekwa udo site n’ịkwụsị ọchịchị nọ ugbua.”
Ọ sị na nke a bụ maka “ọchịchị na-amaghị ọrụ dịịrị ya nakwa na-enweghi usoro nke putara ngaghie nwereike ibute ọgbaghara n’obodo.”

Ebe foto si, Getty
Ndị ntaakụkọ Reuters na AFP kwuru na a nụrụ ụda egbe n’isi obodo mba ahụ bụ Libreville, dịka a gbasachara ozi ahụ na TV.
O nwebeghi azịza ọbụla si n’ọnụ gọọmentị mgbe ndịagha kwupụtachara mwere ọchịchị ahụ.
O nwere mkpesa dị iche iche banyere ntuliaka ahụ e mere n’ụbọchị Satọde.
Onye gbapụtara ihe na-ama Bongo aka n’ihu bụ Albert Ondo Ossa mere mkpesa na ọtụtụ ebe a na-atụ vootu enweghi akwụkwọ mbinyeaka ebe e dere aha ya. Ebe aha ndị ụfọdụ kwụsịrị ịzọ ọkwa ahụ ka dị n’ime ụfọdụ akwụkwọ ntuliaka.
Akụkọ kwuru na a kwụsịrị ndị ntaakụkụ si mba ndị ọzọ ịbata obodo ha bịa gbasaa ozi etu ntuliaka ahụ si aga.
Dịka e mechara ntuliaka, gọọmentị tinyere iwu onye apụla ezi ma machie igwe mgbasaozi n’ịntanetị na mba ahụ ma sị na ọ bụ n’ihi nchekwa.
Mmeri Bongo nke mbụ nwekwara mkpesa ndị dị aṅaa bụ nke a sị na nrụrụaka dị na ya. Nke ugbua e nwere mgbanwe na-edochaghị anya e mere n’akwụkwọ e ji ebinye aka n’izuụka ole ka e mee ntuliaka.
Onyeisiala Bongo banyere n’ọchịchị n’afọ 2009 mgbe nna ya bụ Omar nwụrụ.
N’afọ 2018 ọ rịara ọrịa mkpọnwụ ahụ nke mere na ọ rụghị ọrụ ihe ruru otu afọ, ndị mmadụ kpọrọ oku ka ọ rịtuo n’ọkwa.
N’afọ na-eso ya, ndịagha gbara mbọ iwere ọchịchị n’ike mana o nweghi isi, nke mere e jiri tụọ ndịagha kpara nkata ahụ nga.
Mwere ọchịchị n'ike na mba Gabon na-abịa dịka ndịagha mba Niger weere ọchịchị n'ike n'ụbọchị 26 Julaị, 2023.

Ebe foto si, bbc
Ihe i kwesịrị ịma maka Ali Bongo

Ebe foto si, Getty
- A mụrụ Ali Bongo onye ezi aha ya bụ Alain Bernard Bongo n’ụbọchị 9 Febụwarị afọ 1959.
- Ọ bụ nwa onye bụbu onyeisiala mba Gabon Omar Bongo Odimba na nwunye ya Josephine Kama.
- Ọ gụrụ akwụkwọ n’otu ụlọakwụkwọ dị na Neuilly mba France ma gụọ maka iwu na mahadum Pari a kpọrọ Sorbonne dịkwa na France. O nwetekwara ọzụzụ na ngalaba iwu na mahadum Wuhan nke China n’afọ 2018.
- Ọ banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’afọ 1981 n’aha pati Gabonese Democratic Party.
- Tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị, Ali Bongo bụbu onye otiegwu a ma ama.
- Ọ nọrọ n’ọkwa ọchịchị dị iche iche nke gụnyere; Minista na-ahụ maka mba ndị ọzọ, Onye omeiwu na-anọchị anya mpaghara Haut-Ogooue, minista na-ahụ maka nchekwa na ndị ọzọ.
- N’afọ 2009, ọ banyere n’ọkwa dịka onyeisiala mba Gabon mgbe nna ya bụ Omar nwụrụ.
- O mechara merie ntuliaka ịnọgide n'ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ, mana n'ọdị nso a o kwuru na ya ga-azọ ọchịchị nke ugboro atọ
- N'ụbọchị Satọdee gara aga, Ali Bongo meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Gabon nke ugboro atọ, mana ọtụtụ nkatọ soro ya bụ ntuliaka dịka ndị ọkachamara kwuru na e nwere ọtụtụ nrụrụaka
Ugboro ole ndị agha weghaara ọchịchị na Gabon

Ebe foto si, AFP
Ndị agha mba Gabon weghaara ọchịchị n'ike n'afọ 1964 mgbe onyeisiala Leon Mba nọ n'ọchịchị.
Mana Mba laghachikwara n'ọchịchị dịka ụbọchị olemole gachara site n'enyemaka onyeisiala mba France n'oge ahụ bụ Charles de Gaulle.
Ọzọkwa, n'afọ 2019, otu onye agha aha ya bụ Kelly Ondo Obiang na ụfọdụ ndị agha kwupụtara na ha ewerela ọchịchị.
Obiang na ndị otu ya wakporo otu ụlọọrụ mgbasaozi gọọmentị wee kwupụta na ha achụtuola Ali Bongo n'ọchịchị n'ihi na ahụ esighi ya ike ịga n'ihu dịka onyeisiala.
N'oge ahụ, Bongo nọ n'ụlọọgwụ na mba Morocco ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa mkpọnwụ akụkụ ahụ.
Mana atụmatụ mweghara ọchịchị a amịtaghị mkpụrụ chaachaa, ndị agha Gabon wakporo ụlọọrụ mgbasaozi ebe Obiang na ndị otu ya nọ, gbuo mmadụ abụọ n'ime ndị agha ahụ, ma jide Obiang na ndị agha asaa ọzọ na ndụ.
E mechara kpee ndị agha ahụ ikpe ma tụọ ha mkpọrọ.
















