Gabon election: Onyeisiala Ali Bongo chọrọ ịchị ugboro atọ

Onyeisiala Ali Bongo nke mba Gabon

Ebe foto si, Getty Images

A malitela ntuliaka na mba Gabon dị na mpaghara etiti ala Afrịka ebe onyeisiala Ali Bongo bụ onye banyere ọkwa n'afọ 2009 mgbe nna ya bụ Omar nwụrụ na-atụ anya ịbanye ọkwa ugboro atọ.

Ihe ruru mmadụ iri na atọ so ya azọ ya bụ ọkwa.

"Gabon abụghị nke ndị ezinaụlọ Bongo" ka otu onye so ya azọ ya bụ ọkwa aha ya Albert Ondo Ossa bụ nke ahọpụtara n'izu gara aga idu Alternanace 2023 kwuru.

Dịka ntuliaka ndị ọzọ e nwere ụfọdụ ihe edochaghị anya n'atụmatụ ahụ.

Mgbe abụọ gara aga nke Bongo meriri bụ nke ndị so ya zọ ọkwa katọrọ dịka adigboroja. Ugbua, agbanwela akwụkwọ ntuliaka dịka ọ fọrọ izuụka ole na ole tupu amalite ntuliaka ahụ.

N'ugboro mbụ ya, a na-agwa ndị mmadụ ha họrọ naanị otu akwụkwọ ntuliaka igosi onye ha chọrọ dịka onyeisiala nakwa onye omeiwu.

Ọ na-echekasị ụfọdụ ndị mmadụ na atụmatụ a ga-emebiri ụfọdụ mmadụ dịka Ondo Ossa n'enweghi otu ndọrọndọrọ ọbụla ihe.

Ondo Ossa

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Albert Ondo Ossa bụbu Minista agụmakwụkwọ a na-akwayere ugwu

Ụlọ ntaakụkọ ndị mba ọzọ ịtụ ụkwụ na mba ha n'ụbọchị a na-eme ya bụ ntuliaka.

Mba Amerịka na ọgbakọ EU ekwuola na ọ dị oke mkpa ịnwe ntuliaka kwụ ọtọ ma doo anya ma kwkwa na ha na elebanye atụmatụ ntụliaka ahụ ọfụma.

Na ntuliaka ahụ, ndị mba Gabon ga-ahọpụta ndị omeiwu, ndị Mayọ nakwa ndị isi okpuruọchịchị.

Ndị bụ ndị mba Gabon ruru nde 2.3 ma nwekwaa mmaji kwuru mmaji n'akụnaụba mmanụ agbịdị nakwa ala dị mma ịkọ ihe.

Mana ntramahuhu sị na Covid-19 pụta emeela ka ha belata mbupu ngwa ọrụ na nri ha na-emebu.