Mali: Gịnị ga-emezi mba tinyere nchekwa ya n'aka otu Wagner?
Mali: Gịnị ga-emezi mba tinyere nchekwa ya n'aka otu Wagner?

Mba Mali nwere nsogbu nchekwa dị ọtụtụ site na otu dị icheiche na-eyi ndụ egwu banye n'otu ndị nnupuisi na-alụsọ gọọmentị mba ahụ agha.
Mana gọọmentị mba ahụ bụ ndị agha weghaara ọchịchị n'afọ 2021 akpọbatala otu Wagner na mba ha ịnyere ha aka weghachi ezi nchekwa na gburugburu ala ha.
N'otu aka ahụ ha si ndị agha mba Fransị na-enyebu ha aka ilụso ndị otu ahụ agha kwara lawa ma gwakwuo ndị agha pụruiche nke mba UN zitere idebe udo ha kwara lawa.
Dịka ihe ndị a na-eme onye ntaakụkọ BBC bụ Feras Kilani gara na mpaghara ugwu ya ebe ọnọdụ nchekwa kachasị njọ ị ga leta ndị mmadụ nkitị ọnọdụ ọjọọ a na-emetụta.
Lee ihe ndị ọ chọpụtara ebe ahụ n'ime onyonyo a.


