E duola Emmerson Mnangagwa n’iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Zimbabwe

Ebe foto si, AFP
Onyeisiala Emmerson Mnangagwa nke Zimbabwe aṅụọla iyi ọrụ ịchị ma chekwaa iwu mba ahụ.
Onye duru ya n’iyi ọrụ bụ onyeisi ndị ọkaikpe mba ha bụ Luke Malaba n’ihu ndị nkwado ya karịrị ọtụtụ puku mmadụ.
Ndịisi obodo Afrịka ndị ọzọ dịka Cyril Ramaphosa nke Saụt Afrịka na ogbo ya nke Mozambique bụ Filipe Nyusi gara emume ahụ nakwa nwunye onye bụbu onyeisiala ha Grace Mugabe.
Ọ ga-agbasa ozi nke mbụ ya na-egbughi oge.
Emmerson Mnangagwa: 'Agụ iyi' Zimbabwe emeriela ịbụ onyeisiala nke ugboro abụọ

Ebe foto si, Reuters
A họpụtala Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ka ọ chịa nke ugboro abụọ dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka kwuru o ji vootu ruru pasentị 52.6 merie.
Mana ndị na-ama ya aka n’ọkwa kwuru na e nwere ọtụtụ nrụrụaka na ntuliaka ebe ndị si mba ofesi na-ekiri ka ntuliaka si gaa kwuru na o ntuliaka ahụ erijughi afọ n’ogogo o kwesịrị.
Mnangagwa bụ onyeisiala mba Zimbabwe nke ugboro atọ. Nchutu ndịagha chuturu Robert Mogabe tinyere ya n’ọchịchị.
Ntuliaka a bịara na-agbanyeghi ọtụtụ nsogbu cheere Zimbabwe aka mgba nke gụnyere oke ụbịam, ngwa ahịa ịdi oke ọnụ ahịa, oke ịtụ egwu nakwa ihe ndị ọzọ.
Mnangagwa bụ onye e ji ‘agụ iyi’ maara kwere ngwa na ọ ga-agbanwe ọnọdụ obodo ha mgbe ọ banyere n’ọchịchị mbụ ya.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Zimbabwe Electoral Commission (ZEC) kwuru na onye na-eso Mnangagwa na-azụ bụ Nelson Chamisa nke pati Citizen’s Coalition for Change (CCC) nwetere vootu 44 pasentị.
Mnangagwa nwetere akara vootu nde abụọ na ụma atọ (2.3m) ebe Chamisa nwetere akara vootu otu nde na ụma itoolu (1.9m).

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị na-ama ya aka kwuru na nrụrụaka dị na ntuliaka ahụ mana ụlọikpe mba ahụ akwadola ya bụ ntuliaka.
Ọnụ na-ekwuru pati CCC bụ Promise Mkwananzi dere na soshal midia na “pati anyị jụrụ ịnabata mpụtara ọbụla a kpọpụtara nke a na-enyochaghị nke ọma”
Ọ gwara ndị ntaakụkọ AFP na pati ha etinyeghi aka n’akwụkwọ mpụtara ntuliaka nke ikpeazụ ma jụụ ịnabata ya.
O gara n’ihu kwuo na ha ga-ekwupụta ihe ọzọ ha ga-eme banyere ya n’oge na-adịghị anya.
Ndị bịara ile ka ntuliaka si gaa nke mba European Union, Commonwealth nakwa mba Afrịka ndị ọzọ kwuru na ha e nwere ihe ole ma ole na-edoghi anya na ntuliaka ahụ gụnyere, etu e si tụọ vootu, kpachie ndị pati ọzọ ime achụnta vootu ha n’udo.
Tupu oge ntuliaka a na-eru, e nwere akụkọ mkpagbu ndị pati CCC na pati ndị ọzọ na-anọghị n’ọkwa. E boro ọtụtụ n’ime ha ebubo ma tụọ ha mkpọro, nke a sị bụ iji kutuo mmụọ ha na ntuliaka ahụ.
E kwesịburu ime ntuliaka onyeisiala na ndị ụlọomeiwu n'ụbọchị Wenezde mana ọ banyere Tọzde maka e kesaghị ngwa ntuliaka n'oge.
Nhọpụta Mnangagwa pụtara na pati ha bụ Zanu-PF achịala mba Zimbabwe afọ iri anọ na atọ (43yrs) kamgbe ha nweere onwe ha site n'aka mba Briten n'afọ 1980.
Pati ha merikwara na ntuliaka ndị ọmeiwu, ha nwetere oche 136 n'ime 210, pati CCC nwetere oche 73 ebe oche 60 fọrọ bụ nke e dosaara ụmụnwaanyị bụ ndị a ga-ahọpụta na nghatangha.









