Hamish Herding kpọrọ m ka m sonyere ya n'ụgbọmmiri 'Titanic Submersible' - Ned Nwoko

Ebe foto si, Ned Nwoko/Instagram
Ide ego a ma ama na Naịjirịa bụ Ned Nwoko ekwuputala mwute ya maka ọnwụ ezigbo enyi ya bụ Hamish Harding nke mba Briten, onye so n'ime mmadụ ise nwụrụ n'ihe mberede ụgbọ okpuru mmiri a kpọrọ 'Titanic submersible'.
Nwoko kwuru na ya na Herding esorola mee ọtụtụ njem siri ike n'oge gara aga, ma kwukwaa na Herding kpọrọ ya oku ka o sonye ha na njem ụgbọ okpuru mmiri a n'ụbọchị Sọnde gara aga, mana ya enweghị ohere n'ihi na ọrụ obodo juru ya aka.
Ọ kọwara Herding dịka onye ọkwọ ụgbọelu nke merela ọtụtụ ihe ịrịbaama dị icheiche tinyere aha ya n'akwụkwọ 'Guiness World Record'.
"Ọ kpọrọ m ka m sonyere ya n'ụgbọ ya nke o ji gaa na mpụga ụwa (space) n'afọ gara aga, nakwa n'ụgbọ okpuru mmiri Titanic nke a lara n'iyi," Nwoko depụtara n'akara Twitter ya.
"Oge ikpeazụ o ziteere m ozi bụ n'ụbọchị Sọnde, tupu ha amalite njem ha n'ime ụgbọ okpuru mmiri ahụ."
Nwoko kwuru na Herding so na ndị na-akwado atụmatụ ikpochapụ ọrịa ịba na Naịjirịa nakwa Afrịka.
"Mgbe ọbụla m gwara ya okwu maka atụmatụ a, ọ na-egosi mmasị dị ukwu ma na-enyekwa nkwado niile o nwereike," ka o kwuru.
"Obi na-agbawa m maka nwunye ya na ụmụ ya, bụ ndị mụ bụrụla ezigbo enyi nke ezinụlọ m ogologo afọ ndị a."
Arịrị, anyamiri esoola ọnwụ mmadụ ise nọ na 'Titanic Submersible'

Ebe foto si, Reuters
Ekele na ozi iti aka n'obi na-arị ibe ya elu dịka ndị mmadụ na akọwapụta ihe ha maa maka ndị nwụrụ n'ihe mberede ụgbọmmiri 'Titanic Submersible'.
Stockton Rush, onye nwe ụlọọrụ 'OceanGate' bụ ndị rụpụtara ụgbọmmiri 'Titanic Submersible', Shahzada Dawood na nwa ya nwoke bụ Suleman Dawood, Hamish Harding na Paul-Henri Nargeolet, nwụrụ n'ihe mberede mmiri, dịka ozi mgbasaozi nke OceanGate wepụtara ụbọchị Tọzde, abalị 22, nke ọnwa Juun si kwuo.

Mahadum'University of Strathclyde dị na Glasgow na mba Briten ekwupụtala obi mwute ha n'ọnwụ nwata akwụkwọ ha bụ Suleman Dawood na nna ya bụ Shazada Dawood na mmadụ atọ ndị ọzọ so n'ụgbọmmiri 'Titanic Submersible'.

Ebe foto si, Dirty Dozen Production
Ezinaụlọ Hamish Harding kwuru na ha na-echeta ya maka ịbụ "ezi nna", "ezi di" ma kwuo na ihe na-akasi ha obi bụ na, "o funarị ha ebe ọ na-eme ihe kachasị amasị ya na ndụ a."
Ọtụtụ ndị mmadụ tokwara Paul-Henri Nargeolet bụ onye mbụ duu ndị ọzọ gaa hụ okpokoro'Titanic' ochie n'okpuru mmiri.
Otu n'ime ha bụ Rebecca sịrị,"PH bụ onye a ma ama n'ụwa. Ọrụ ya kpalitere ọtụtụ ndị mmadụ ma nye anyị ohere ịghọta n'ụzọ ọhụrụ etu ihe mberede Titanic ochie si mee."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
A hụla okpokoro 'Titanic Submersible' a na-achọ achọ

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ na-eru anyị ntụ ugbua na-ekwu na a hụla okporo 'Titanic Submersible' a na-achọ achọ kemgbe ụbọchịụka.
Ụgbọmmiri a kpọrọ 'Titanic Submersible' zọpụrụ ije n'ikperemmiri Newfoundland dị na mba Kanada gawa ebe ụgbọmmiri 'Titanic' kụsara ọtụtụ afọ gara aga.
Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ha ahụla mpekere akụkụ ụgbọmmiri ahụ ise na nso n'ebe Titanic nke ochie kpọkasịburu.
Ha sịrị na ụgbọmmiri ahụ 'gbara' nke butere ọdachi ahụ.
Rear Admiral Mauger nke US Coast Guard, onye gbaara ndị ntaakụkọ ama a n'abalị Tọzde kwuru na ọ ga-esi ike nweta ozu mmadụ ise nọ n'ime ụgbọmmiri 'Titan Submersible'.
Rear Admiral Mauger gara n'ihu kwuo na ụgbọmmiri itoolu ka nọ n'ebe a hụrụ okpokoro ụgbọmmiri ahụ kpọkasịrị.
Ọ sịkwara, "Anyị nwere ndị ọrụ ahụike, ndị tekụnụzụ." Anyị ga-amalite ikposa ndị ọrụ n'awa iri abụọ na anọ na-abịa."
"Ebe a bụ ebe dị oke egwu, ịrụ ọrụ ebe a siri ike."
Ọ gara n'ihu tie ezinaụlọ ndị ọ metụtara aka n'obi, sị ha kara obi nabata na mmadụ ise ahụ achịsala ọwa.


Ebe foto si, Reuters
A ka na-achọ ụgbọmmiri pụrụ iche furu n'okpuru oke ọshimiri kemgbe Ụbọchị Ụka.
Ụgbọmmiri a kpọrọ 'Titanic Submersible' zọpụrụ ije n'ikperemmiri Newfoundland dị na mba Kanada gawa ebe ụgbọmmiri 'Titanic' kụsara ọtụtụ afọ gara aga.
Ụgbọmmiri ahụ bụ mmadụ ise gụnyere onye nwe ụlọọrụ na-eme ụgbọmmiri ọpụrụiche.
Ya bụ ụgbọ nwere ike isi ọtụtụ mailị n'okpuru mmiri zipụta ozi na foto mana egwu dagharịrị ka ọ gachara otu awa na nkeji iri anọ na ise(1hr45 mins) njem ha ji malitere bụ oge a kwụsịrị inweta ozi n'aka ha.
Nke a mere ka ndị mmadụ tụwa uche maka ndụ mmadụ ise nọ n'ime ya .
Dịka ndị o were anya siri kọwaa, ha ji ikuku 'oxygen' ga-anọ ihe dịka awa 96 were zọpụ ije.
Taa bụ Tọzde, ngụkọ gosiri na ikuku ahụ ga-agwụla dịka ọ barala abalị anọ e jiri chọwa ha.
Ka ọ dị ugbua, mba dị iche iche ezipụla ụgbọmmiri na ụgbọelu na-achọ 'Titani Submersible'.
Kedụ mmadụ ise nọ n'ime Titanic Sub?

Ebe foto si, Reuters
Ụgbọọmmiri Titanic Submersible bu mmadụ n'ime ya wrere zọpụ ije.
Ha gụnyere :
Hamish Harding: Ọ bụ onye Briten gbara afọ 58, e ji ije tara akpụ(adventurer) mara.
Harding agaala n'Ọnwa nakwa na 'South Pole' ugboro ugboro
Shahzada Dawood: Ọ bụ ojiegoachụego mba Briten gbara afọ 48.
Ọ bụ onye si otu n'ime ezinaụlọ mba Pakistan kachasị baa ọgalanya ma bụụkwa onye na-enye otu ọrụ ebere nke King Charles nkwado n'ụzọ pụrụ iche.
Suleman Dawood: Ọ bụ nwa nwoke Shahzada Dawood. Nwata a dị afọ 19 bụ nwataakwụkwọ.
Paul-Henry Nargeolet: Onye agha mmiri mba Fransị gbara afọ 77.
Ọ gaala n'ebe ụgbọmmiri Titanic kọkasịrị ọtụtụ mgbe. O so ndị nnyọchute gara ya mbụ n'afọ 1987.
Stockton Rush: Nwoke a gbara afọ 61 bụ onyeisi ụlọọrụ OceanGate bụ ụlọọrụ ụgbọmmiri na-ahazi njem Titanic.
Ọ bụ ha nwe ụgbọmmiri ọ-pụrụ-iche 'Titanic Submersible".
Kedụ ndị ọrụ gbatagbata na-achọ 'Titanic Submersible'?

Ebe foto si, Supplied
Kemgbe ha furu, ọtụtụ ndị si mba dị iche iche etinyela aka na mbọ ịchọ ha.
- Ndị mbụ bụ ụgbọelu mba Kanada bụ nke kwuru ụbọchị Tuzde na Wenezde na ha nụrụ "mkpọtụ n'okpuru mmiri" na mpaghara ebe a na-achọ ụgbọmmiri ahụ. Ndịagha mmiri na nke ụgbọelu mba ahụ so achọ ụgbọmmiri ahụ.
- Ụgbọmmiri mba Fransị pụkwara ije ịchọ Titani Submersible
- Ndị nchekwa mmiri mba Amerika( US Coast Guard) na ndịagha ụgbọelu mbaUS Air Force) ahụ sokwa na ndị nọ ọrụ ịchọ ụgbọmmiri ahụ na-efu
Kedụ nke bụdị 'Titanic Submersible"?

Ebe foto si, Reuters
- Titanic Submersible bụ ụgbọmmiri ọ pụrụ iche nke ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọmmiri pụrụ iche maka njem nnyọcha bụ OceanGate, rụpụtara.
- Ụgbọmmiri ahụ dị 10,432 kilogram n'arọ
- Ọ dị 6.7mita n'ogologo
- O nwere ike ịgali 4,000 mita n'okpuru osimmiri
- Ụgbọmmiri a nwere igwe e nwere ike iji zirita ndịị nọ n'elu ala ozi 'text message.'
- Ọkwọụgbọmmiri a nwere ihe dịka igwe onyonyo video game o ji akwọ ụgbọ ahụ.
- N'ezi ka e si akpọghe ụgbọmmiri ahụ, ndị nọ n'ime ya agaghị akpọgheli ya.
Kedụ ụgbọ bụdị 'Titanic'?

Ebe foto si, Atlantic Productions/Magellan
RMS Titanic a ma n'ụwa dịka 'Titanic' bụ ụgbọmmiri mba Briten e ji ebu ndị njem bụ nke kpuru ma kpọkasịa n'oke osimiri 'Atlantic Ocean' n'ọnwa Eprelu afọ 1912.
Ugbọmmiri ahụ bụ nke onye rụrụ ya sịburu na ọ gaghị ekpulata ekpu" si Southampton dị n'Ingland na-aga Nu Yọk dị na mba Amerịka oge ọ kụrụ akụmiri dị n'ime oke osimiri kpọkasịa.
E mechara mee ihe ejije nke a kpọrọ 'Titanic"bụ akụkọ etu ụgbọmmiri ahụ nke bụ ndị njem ruru 2,000 si kpuo n'ije mbụ ya.














