Ụmụ m nwaanyị atọ ndị na-akwado ịlụ di nwụrụ n'ihe ọdachị ụgbọmmiri kwara a

Aisha Mohammed ji anya mmiri akwa kọwaa etu ihe a mere ụmụ ya ga-esi gbanwee ndụ ya ebighiebi
Nkọwa foto, Aisha Mohammed ji anya mmiri akwa kọwaa etu ihe a mere ụmụ ya ga-esi gbanwee ndụ ya ebighiebi

Otu onye gbalahụrụ ọnwụ na ihe mberede ụgbọmmiri tara isi mmadụ 106 na mmiri River Nigera akọrọọla BBC etu ọtụtụ ọtụtụ ụmụnwaanyị ọkachasị ndị nne siri nwụọ dịka ha nọ na-agba mbọ ịgbapụta ụmụ ha oge ihe ọdachi a mere.

A ka na-eme nnyocha ima ihe kpatara isi ọdachị a kpọmkwem mana ndị uweojii kọwara na ihe ọdachi a mere ka akụkụ ụgbọ mmiri ahụ daturu nke mere mmiri ji malite iwubata n’ime ya bụ ụgbọ mmiri.

Ọnụọgụgụ si n’aka ndị gbara mbọ ịgbapụta ndị mmadụ ahụ kwuru na a gbapụtara mmadụ 114 ụbọchị ihe a mere na Mọnde.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Akụkụ obodo Patigi bụ ihe ọdachị a mere dịka ndị obodo ahụ na-eru oke uju ugbua
Nkọwa foto, Akụkụ obodo Patigi bụ ihe ọdachị a mere dịka ndị obodo ahụ na-eru oke uju ugbua

Cheta na Igwe na-achị mpaghara ahụ bụ Emir nke Patigi bụ Ibrahim Umar Bologi II kwuru ha na-eche na mmiri riri ihe ruru mmadụ 150.

Ọ gwakwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ebilimmiri bụ ihe buuru ụgbọmmiri ahụ sọọ ya isi n’oke osisi nọ ebe ahụ nke mere ya bụ ụgbọmmiri jiri kpuo.

E kwuru na ụgbọmmiri ahụ bu mmadụ 300 na-eme njem maka agbaakwụkwọ si akụkụ Kwara steeti aga Niger steeti.

Nwaanyị ọzọ gbalahụkwara ọnwụ n’ọda a aha ya bụ Aisha Mohammed gwara BBC na ụmụ ya nwaanyị atọ ndị na-akwadozi ịlụ di nwụrụ n’ọdachị a.

Mohammed Alhassan onye lara na nta n’ihe ọdachi a gwara BBC na ọtụtụ ụmụnwaayị nwụrụ dịka ha nọ na-agba mbọ ịgbapụta ụmụ ha. O kwuru na nwwaanyị ya nwaanyị dị afọ asaa nwụrụ n’ihe ọdachị a.

Mohammed Sallihu bụ nwanne otu onye nwụrụ n’ihe a gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na “Ihe a merenụ bụ ezigbo ihe mwute nke merela ka obodo anyị niile na-ama jijiji.”

Agbanyeghi na ndị obodo Patigi ebe ihe a mere na-eru ugbua, ndị mmadụ amalitekwala ime njem ụgbọmmiri ebe ahụ dịka ya bụ mmiri so n'ụzọ ndị mmadụ kacha esi aga mkpa ha.

Ọkwọ ụgbọmmiri na onye njem na-akwado ibu ibu ya gafee n'akụkụ Patigi nke Kwara steeti
Nkọwa foto, Ọkwọ ụgbọmmiri na onye njem na-akwado ibu ibu ya gafee n'akụkụ Patigi nke Kwara steeti

Ihe gọọmentị Kwara steeti na-eme

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọọmentị steeti a e zipụta ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ nakwa ndị ihe ọdachị a metụtara ma kwuo na a ga-aga n’ihu n’atụmatụ ịgbapụta ndị nwereike ị ka tọọ n’ime mmiri ahụ.

Nke a na-abịa dịka akụkọ kọwara na ụfọdụ ndị ka na-achọ ndị nke ha achọ n’ihe ọdachị a.

Gọvanọ AbdulRahman AbdulRazaq mere njem nleta gaa obodo ebe ndị ihe a metụtara n’ụbọchị Wenezde dịka o kwere ha nkwa inye ndị obodo ahụ onyinye uwe nchekwa maka mmiri iri mmadụ bụ ‘life jacket’ 1000 iji malite atụmatụ ọzụzụ nye ndị obodo ahụ maka ihe ọdachi mmiri nakwa mmiri iri mmadụ.

Gọvanọ AbdulRazaq kwukwara na onyela ụlọọrụ na-ahụ maka mmiri ndị gbara ha okirikiri bụ National Inland Waterways Authority iwu ka ha hibe usoro nchekwa tọrọ atụ maka ndị na-eme njem ebe ahụ.

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu zipụtakwara ozi kwuo na “akụkọ ihe a mere bụ ezigbo ihe mwute nye ya”.

“Ịmata na ndị ihe a metụtara bụ ndị nọ na-aga agbamakwụkwọ mere ya ọ jọgbuo onwe ya na njọ.”

Akụkọ ihe mberede ụgbọmmiri abụghị ihe ọhụrụ n’akụkụ steeti dịka ndị mmadụ na-ejikarị ụgbọmmiri eme njem n’ihi ọnọdụ ọjọọ ụzọ ndị nọ ebe ahu nakwa egwu ndị ntọ na-anọ ebe ahụ nke na-atọ ndị mmadụ maka ego mgbapụta.

Ụgbọmmiri ibu oke ibu so n'ihe kacha akpata ihe ọdachị ụgbọmmiri n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
Nkọwa foto, Ụgbọmmiri ibu oke ibu so n'ihe kacha akpata ihe ọdachị ụgbọmmiri n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.