Ndị nwụrụ n'ihe mberede oke ifufe na mmiri ozuzo na Malawi eruola 225

Ebe foto si, AFP
Ngụkọ ọnụọgụgụ ọhụrụ ndị nwụrụla n’oke ifufe mere na mba Malawi na ngwụcha izu gara aga eruola 225 dịka ụlọọrụ gbatagbata mba ahụ si kwuo.
Ifufe a bụrụla otu n’ime anọ merela n’akụkụ osimiri India ruo mpaghara Afrịka.
Mbọ a na-agba ịgbapụta ndị mmadụ na mpaghara ndịda Malawi na-agazị n’ihu ugbua dịka mmiri ozuzo ebelatala ebe ahụ.
Nke a enyela ndị ọru enyemaka na ndị gbatagbata awụchiela mpaghara ahụ njem so oke ifufe a kpọrọ ‘Tropical Storm Freddy’.
Mịnịsta mgbasaozi mba ahụ gwara BBC na ụgbọelu helikopta na-efega n'ebe oke idemmiri so ifufa kewapụrụ ụzọ ha.
Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efu efu n’ihe ọdachị a dapụtara na mba a dịka ihe ruru mmadụ 20,000 agbapụla be ha ma bụrụ ndị na-enweghi ebe obibi n’ihi oke ifufe a.
Gọọmentị mba a ehibela ụlọ mgbapụta inye ndị na-enweghi ebe obibi ugbua dịka a na-ezigara ihe ndị dị mkpa e ji ebi ndụ dịka uwa, ncha, akwa mkpuchi, nrị nakwa ihe ndị ọzọ.
Nnukwu ide mmiri ka na-asọjukwa ọtụtụ obodo, na-akwatu ụlọ ndị mmadụ ma na-eburukwa ihe ọbụla nọchiri ya ụzọ, n'ihi ọdachi ọnatarachi a akpọrọ 'Storm Freddy'.
Obodo Blantyre, nke bụ isi obodo azụmahịa nke mba Malawi bụ ebe ihe mberede a kacha metụta , ebe ahụ ka ndị mmadụ kacha nwụọ tinyere ọtụtụ ụmụ ntakịrị.
Ndị ọrụ enyemaka na-ekwu na oke ideimmiri a ga-eme ka ọrịa cholera nke na-efesabu na mba Malawi kawanye njọ.

Ebe foto si, EPA
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmentị etinyela ọnọdụ gbatagbata na distrikt iri dị na mpaghara ndịda Malawi bụ ebe ọdachia ahụ kacha metụta.
"Anyị hụrụ ka osimiri juputara n'ọnụ na-awụfu, mmiri a na-eburu ma mmadụ ma ụlọ ọbụla nọ n'ụzọ ya," onye ntaakụkọ BBC bụ Peter Kalaya kwuru.
Otu onye bi na Blantyre kọọrọ BBC etu ya na ndị ọzọ si zọpụta otu nwatakịrị nwaanyị tọrọ atọ n'ime aja ụrọ.
"Aja ụrọ obere ka o kpuchie nwata ahụ isi. Ọ nọ na-ebe akwa na-eti mkpu enyemaka. N'agbanyeghị na idemmiri na-ebusi ike, anyị gbalịrị gafee ma zọpụta nwata ahụ. Ọ dịghị mfe mana anyị jisiri ike mee ya," nwoke ahụ aha ya bụ Aaron Ntambo kwuru.
Ndị ọrụ ahụike n'otu nnukwu ụlọọgwụ dị n'obodo ahụ sị na ọnụọgụgụ ozu mmadụ a na-ebubata n'ụlọọgwụ ahụ karịrị ha.
Otu enyemaka ahụike bụ 'Doctors Without Borders' kwuru na ihe karịrị ụmụaka 40 ka e bubatara n'ozu n'ụlọọgwụ ahụ.
A na-eche na ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n'ihe mberede a ga-agbago n'ihi na ndị ọrụ enyemaka enwebeghị ike ịbanye n'ọtụtụ mpaghara n'ihi na oke mmiri ozuzo na oke ifufe ka na-ebusi ike n'ebe ndị ahụ.
Ọkụ latrik apụọla
Ihe ọdachia emeela ka ọkụ latrik nyụọ n'ọtụtụ mpaghara na Malawi. Ụlọọrụ ọkụ latrik na mba ahụ kwuru na akịrịka ejupụtala n'igwe ha ji emepụta ọkụ.
N'otu aka ahụkwa, ide mmiri ebuchapụla ọtụtụ ụzọ nakwa akwa mmiri, mee ka o siere ndị ọrụ enyemaka ike ịbanye na mpaghara ebe ndị mmadụ ka tọrọ.
Gọọmentị mba MAlawi akpọọla oku enyemaka maka puku kwuru puku ndị mmadụ na-enweghịzi ụlọ obibi na nri oriri.
Ọdachi a metụrakwara Mozambique

N'ụbọchị Sọnde, oke ifufe a rutekwara na mba Mozambique - nke ugboro abụọ n'ihe erubeghị otu ọnwa - dịka o mebikwara ọtụtụ ihe na mba Madagascar nke dị n'ikpere Oke Osimiri Indian Ocean.
Amachabeghị kpomkwem ihe niile mebiri na mba Mozambiqe maọbụ mmadụ ole nwụrụ, n'ihi na ọkụ latrik nakwa ikike ịkpọ oku ekwentị apụọla n'ụfọdụ ebe.
Mana mmadụ 20 ka e kwupụtara nwụrụla.
Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụ mgbanwe ihu eligwe na-eme ka oke ụdị ifufe a na-akwanye njọ n'akụkụ ụwa niile.
Ike oke ifufe a akpọrọ 'Storm Freddy' karịrị ụdị oke ifufe ndị ọzọ ahụrụla n'ụwa dịka o ji ike ruru 8000-km (5000-mile) na-ebu n'ogologo osimiri 'Indian Ocean' site na mpaghara ndịda Ugwu Australia.













